Olee Otú M Pụrụ Isi Tụkwasị Uche M n’Ihe?
“Anọdụwo m ala ọtụtụ afọ ná nzukọ, n’amụtaghịkwa oké ihe na ha. Uche m ga na-awagharị nnọọ.”—Matthew.
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe ị na-anọdụ ala na klas ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ná nzukọ ndị Kraịst ma chọpụta na mberede na ị maghị ihe a na-ekwu? Ọ bụrụ na uche gị na-awagharị awagharị mgbe ụfọdụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ na-eme. Dị ka otu isiokwu bu ụzọ kọwapụtara, ndị ntorobịa na-etinyekarị uche n’ihe ruo nwa mkpirikpi oge.a Otú ọ dị, site n’itinyetụ mgbalị na mgbanwe nke àgwà ụfọdụ, ị pụrụ ịmụta ịmụbawanye ikike gị nke itinye uche n’ihe.
Nwee Mmasị
Chee echiche banyere onye na-eme egwuregwu a zụrụ azụ. “Mmadụ ọ bụla nke na-agbasi mgba ike ịka ibe ya n’egwu unu na-ejidekwa onwe ya n’ihe nile,” ka Pọl onyeozi na-ekwu. Ọ bụrụ na onye na-eme egwuregwu ekwere ka a dọpụ uche ya ọbụna ruo nwa oge, ọ pụrụ ime ka ọ ghara imeri n’egwuregwu ahụ. Iji merie, ọ ghaghị ịmụta itinye uche n’ihe—na-eleghara ụda nke ìgwè mmadụ na-eme ụzụ anya, na-eleghara ihe mgbu na ike ọgwụgwụ ya anya, na-ewepụ echiche nke ọdịda n’obi ya. Ma gịnị nnọọ na-akwali ndị na-eme egwuregwu itinye ụdị mgbalị pụrụ iche dị otú ahụ? Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, ha na-eme ya “ịnata okpu mmeri nke pụrụ ire ure”—ihe nrite dị iche iche a na-enye ndị meririnụ.—1 Ndị Kọrint 9:25.
N’otu aka ahụ, ị ghaghị inwe nkwali ịṅa ntị! Akwụkwọ bụ́ Study Is Hard Work, nke William H. Armstrong dere, na-ekwu, sị: “Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị nwa akwụkwọ inwe mmasị. Ọ dịghị onye pụrụ inwechitere gị mmasị, ọ dịghịkwa onye pụrụ ịmụba mmasị gị ọ gwụlakwa ma ị chọrọ.” Ihe ọmụma bụ isi ihe ga-eme ka ị ghọta ụwa i bi n’ime ya. Ruo n’ókè ị maruru ihe, otú ahụ ka ị pụrụ ịmụtaru ihe. “Ihe ọmụma dịịrị onye nghọta mfe,” ka Ilu 14:6 na-ekwu. O nwere ike ị gaghị echeta ihe nile ị na-amụta n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ dịkarịa ala, ụlọ akwụkwọ na-enyere gị aka ịzụlite ikike iche echiche. (Tụlee Ilu 1:4.) Inwe ọzụzụ nke uche na ikike itinye uche n’ihe ga-abara gị uru ná ndụ gị nile.
Ndị Nkụzi Ike Gwụrụ, Ndị Na-agwụkwa Ike
Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme mkpesa na ọbụna ndị nkụzi ha yiri ka ha enweghị mmasị. Otu ntorobịa aha ya bụ Jesse na-ekwu, sị: “Ndị nkụzi na-eguzoro ọtọ n’ihu unu, kwuo otu ihe, nye unu ihe omume, mgbe ahụ sịkwa unu laa. Echere m na ha na-ebelata aka n’ọrụ ha. Ndị nkụzi adịghị eme ka ọ dị mkpa, ya mere anyị adịghị ahụ mkpa ọ dị ịṅa ntị.”
Ì kwesịziri ikwubi na ọ baghị uru ịṅa ntị? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ọtụtụ ndị nkụzi adabawo n’ọnọdụ ọjọọ na-eduje n’ọzọ. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Collin na-akọwa, sị: “Ọ dịghị onye na-aṅa ndị nkụzi ntị, ya mere ndị nkụzi na-eche na ọ dịghị onye chọrọ ịmụta ihe. Mgbe ahụ ha adịghị etinye ume na ịnụ ọkụ n’obi buru ibu n’ịkụzi ihe.”
Ma ì kwere ma ọ bụ na i kweghị, ị pụrụ inwe ike inye aka kwụsị usoro a. N’ụzọ dị aṅaa? Nanị site n’ịna ntị. Inwe nanị otu nwa akwụkwọ nwere mmasị pụrụ ịbụ nanị ihe ọ ga-ewe onye nkụzi ike gwụrụ inweghachi mmasị n’ọrụ ya. N’eziokwu, ụfọdụ ndị nkụzi enweghị nnọọ ikike nke ime ka ụmụ akwụkwọ nọgide na-enwe mmasị. Ma tupu ị daba n’ịmụ anya arọ nrọ, jụọ onwe gị sị, ‘Ọ̀ ma ihe ọ na-ekwu?’ Ọ bụrụ otú ahụ, mee mkpebi ịmụta ihe site n’aka ya. Gee ntị nke ọma—tinye uche! Sonye ná mkparịta ụka ndị a na-enwe na klas. Jụọ ajụjụ ndị kpọrọ okwu aha kpọmkwem. Akwụkwọ bụ́ How to Study in High School na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-achọpụta na ọ na-enye aka idetu ihe osise, okwu, chaatị, nkọwa, na isi ihe ndị onye nkụzi ahụ deturu na bọọdụ ma ọ bụkwanụ n’aka nke ọzọ ndị ọ na-ekwusi okwu ike banyere ha.”
“Ịṅabiga Ntị Oké Karị”
Otú ọ dị, ihe ndị a na-agbaso mgba dị elu karị mgbe a bịara n’ịṅa ntị ná nzukọ ndị Kraịst. Jesse na-ekweta, sị: “Mgbe ụfọdụ ndị na-eto eto adịghị aṅa ntị n’ihe ndị dị ka nzukọ n’ihi na ha adịghị aghọta mkpa nzukọ ndị ahụ dị.” Ná Ndị Hibru 2:1, e nyere anyị iwu “ịṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ, ka a ghara ibupụ anyị n’ebe ha dị ma eleghị anya, dị ka mmiri na-ebupụ ụgbọ.” Mgbe i jesịrị otu nzukọ ọgbakọ, ị̀ pụrụ icheta ihe n’okwu nke ọ bụla? Ka ị̀ na-achọpụta mgbe ụfọdụ na ị pụghị ọbụna icheta ndị nwere ihe omume?
Ọzọkwa, ọ bụ ihe metụtara ịhụ mkpa nke ihe ị na-amụ dị. Leenụ, o metụtara ndụ gị kpọmkwem! (Jọn 17:3) Isi ihe ọzọ kwesịrị ichebara echiche bụ: Mgbe ị na-amụ ihe banyere Bible, ị na-amụ iche echiche dị ka Chineke n’onwe ya! (Aịsaịa 55:8, 9) Mgbe i tinyekwara ihe ị na-amụta n’ọrụ, ị na-eyikwasị ihe Bible na-akpọ “mmadụ ọhụrụ ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị ṅaghị ntị, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị eme mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ gị; ị ga-ebelata uto ime mmụọ gị. Jehova maara na anyị nile na-ekwekarị ka a dọpụ uche anyị. N’ihi ya, ọ na-arịọ: “Geenụ m ntị nke ọma . . . Tọọnụ ntị unu n’ala, bịakwute m; nụrụnụ, mkpụrụ obi unu ewee dị ndụ.”—Aịsaịa 55:2, 3.
Otú E Si Amụtakwu Ihe ná Nzukọ
Ọbụna otú ahụ, ịṅa ntị nke ọma ná nzukọ pụrụ isi ike na mbụ. Ma ndị nchọpụta na-azọrọ na ka anyị na-etinye uche n’ihe, otú a ka ụbụrụ isi anyị na-enwekwu nkà n’ọrụ ahụ. Matthew, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, meriri àgwà nke uche ya ịwagharị mgbe nzukọ na-aga n’ihu. Ọ na-ekwu, sị: “Achọpụtara m na aghaghị m ịzụ onwe m ịṅa ntị. Mgbe ntakịrị oge gasịrị ọ na-aka mma, ị pụkwara ịṅa ntị ruo ogologo oge karị.” Matthew na-akọwapụtakwa otu ihe kasị na-eme ka nzukọ na-enye ya ọṅụ. Ọ na-ekwu, sị: “M na-amụ ihe tupu oge eruo.” N’otu aka ahụ onye ntorobịa aha ya bụ Charese na-ekwu, sị: “Mgbe m mere nkwadebe, ana m enwekwu mmetụta nke ịbụ akụkụ nke nzukọ ahụ. Okwu ndị ahụ na-eyi ndị na-adọrọkwu mmasị ma nwekwuo ihe ha pụtara nye m.”
Ọ dịkwa mkpa ịghara ikwe ka echiche ndị na-adọpụ uche bata n’uche anyị. N’eziokwu, ị pụrụ inwe ọtụtụ ihe n’uche gị bụ́ ndị kwesịrị ịkpatara gị nchegbu: ule ahụ na-abịa n’izu na-esonụ, nsogbu nke ọdịiche akparamàgwà mmadụ nke na-akpatara gị nchekasị, mmefu ụfọdụ na-abịanụ ị na-aghaghị ime. Ma Jisọs nyere okwu ndụmọdụ a: “Ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo ya site n’ichegbu onwe ya? Ya mere, unu echegbula onwe unu nye echi: n’ihi na echi ga-echegburu onwe ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị taa ezuworo ya.” (Matiu 6:27, 34) Itinye uche ná nzukọ ọgbakọ agaghị eme ka nsogbu gị laa, ma ọ ga-enye aka mee ka ị dịghachi ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ ka i wee nwee ike ịnagide nsogbu nke ọma karị.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:16.
Ịṅa ntị nke ọma pụkwara inyere gị aka itinye uche. Matthew na-ekwu, sị: “Ana m agbalị ịtụ anya ihe ọkà okwu ahụ ga-ewepụta mgbe okwu ahụ na-aga n’ihu ma lepụzie anya otú ọ ga-esi mee ya.” Jụọ onwe gị sị, ‘Olee isi ihe ndị a na-ekwu banyere ha? Olee otú m pụrụ isi jiri ihe a na-akụzi mee ihe?’ Ịtụ anya ihe ọkà okwu ahụ gaje ikwu ọzọ pụkwara inyere gị aka itinye uche. Gbalịa ịgbaso arụmụka ya. Rịba arụmụka Akwụkwọ Nsọ o ji na-eme ihe ama. Tụgharịa uche n’isi ihe ndị o kwuru ma chịkọta ha. Na-edetu ihe dị nkenke, bara uru. Mgbe otu akụkụ chọrọ ka ndị na-ege ntị kere òkè, kere òkè! Ime otú ahụ pụrụ inye aka ime ka uche na echiche gị ghara ịwagharị.
N’eziokwu, ịṅa ntị pụrụ ịbụ ihe ịma aka ma ọ bụrụ na otu ọkà okwu kpọmkwem adịghị ekwu okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ ma ọ bụ na-ekwu okwu n’ụzọ jụrụ oyi. Cheta ihe ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ kwuru banyere otú ha siri lee ikike ikwu okwu nke Pọl onyeozi anya: “Ọnụnọ nke ahụ ya n’etiti anyị adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe a kpọrọ ihe efu.” (2 Ndị Kọrint 10:10) Ma Pọl zaghachiri nkatọ dị otú ahụ site n’ikwu, sị: “A sị na ọ bụ ezie na abụ m onye na-amụtaghị akwụkwọ n’ụzọ ikwu okwu, ma abụghị m otú a n’ụzọ ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrint 11:6) Ee, a sị na ndị na-ege ya ntị leghaara ikike ikwu okwu Pọl anya ma lekwasị anya n’ihe ndị o kwuru, ha gaara amụta ọtụtụ n’ime “ihe nile dị omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) N’otu aka ahụ, ị pụrụ ịmụta ihe, ọbụna site n’aka ọkà okwu “na-ekwu okwu n’ụzọ jụrụ oyi,” ma ọ bụrụ na i tinye uche ma ṅaa ntị. Ònye ma? Ọ pụrụ ọbụna inye nkọwa dịtụ iche ma ọ bụ jiri otu akụkụ akwụkwọ nsọ mee ihe n’ụzọ na-abatatụbeghị gị n’uche.
Okwu Jisọs dị na Luk 8:18 chịkọtara ihe nile n’ụzọ dị mma: “Lezienụ anya otú unu si anụ.” N’eziokwu, ịmụta ịṅa ntị—ọ bụghị uche ime mwagharị—ga-ewe mgbalị na ịnọgide na-eme ya. Ma ka oge na-aga ị ga-enweta abamuru. Ịmụta itinye uche n’ihe pụrụ iweta akara mmụta ka mma na, nke ka mkpa, uto ime mmụọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ . . . Gịnị Mere na Mụ Apụghị Itinye Uche n’Ihe?,” nke pụtara ná mbipụta anyị nke August 8, 1998.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịzụlite mmasị n’ihe ị na-anụ bụ isi ihe dị n’ịṅa ntị