Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 10/8 p. 27
  • ‘Ọ Dị Ka Ịracha Mmanụ Aṅụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ọ Dị Ka Ịracha Mmanụ Aṅụ’
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Akụkụ 1—Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ì Kwesịrị Ikwere Ya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
  • Ọ̀ Bụ Ozizi Bible n’Ụzọ Doro Anya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 10/8 p. 27

‘Ọ Dị Ka Ịracha Mmanụ Aṅụ’

N’ETITI afọ 1993, na Altus, Oklahoma, U.S.A., otu nna na-enwe nchegbu, bụ́ osote onyeisi nke otu ìgwè Ndị Agha Ụgbọelu nke United States, kpere ekpere maka nduzi iji nyere nwa ya nwanyị aka, bụ́ onye nọ na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye ma na-eche echiche ịgba alụkwaghịm. Ụtụtụ echi ya otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ọnụ ụzọ ya ma nye ya mbipụta nke Teta! November 8, 1993, bụ́ nke nwere isiokwu bụ́ “Ịgba Alụkwaghịm—Ọ̀ Bụ Ọnụ Ụzọ Na-eduje ná Ndụ Obi Ụtọ Ka Ukwuu?”

Ọ bụ ezie na nwoke ahụ adịbeghị mgbe ọ bụla o nwere mmasị n’ebe Ndịàmà nọ, ọ dịtụbeghịkwa mgbe ọ bụla ọ ṅara ha ntị mbụ, ngwa ngwa ọ naara ma gụọ magazin Teta! ahụ. Ka e mesịrị, o sooro nwa ya nwanyị kwurịta akụkụ Akwụkwọ Nsọ na isi ihe ndị sitere na ya. Ọ gụkwara mbipụta Ụlọ Nche nke e nyekọtara ya na Teta! ahụ. E nwere otu isiokwu na ya bụ́ nke kpaliri ya ichemi echiche banyere nkwenkwe n’Atọ n’Ime Otu o kwere kemgbe ndụ ya. Ọ ghọtara na a na-aza ekpere o kpere maka enyemaka n’ihe banyere nwa ya nwanyị, ma o juru ya anya ihe mere Chineke ga-eji jiri ndị na-ekweghị n’Atọ n’Ime Otu zaa ekpere ya. Ọ tụgharịrị uche na n’ezie Chineke adịghị eji ndị mmadụ aza ekpere ma ọ bụrụ na ha adịghị akụzi eziokwu.

E si otú a kpalie ya ịkpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova na fon iji nweta akwụkwọ ụfọdụ na-akọwa nkwenkwe ha banyere Atọ n’Ime Otu n’ụzọ zuru ezu karị. Nwoke zara fon ahụ nọ ná nzukọ ndị okenye nke ndị Kraịst. Onyeisi nke otu ìgwè ndị agha ụgbọelu ahụ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ozugbo, bụ́ ebe e nyere ya akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala na broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?

N’abalị ahụ, nwoke ahụ gụchara broshụọ ahụ. Ka ọ na-agụ ya o nwere obi ụtọ dị ukwuu, ka o mesịrị kwuo, nke na ọ ghaghị ịkwụsịtụ ma gwa onwe ya, sị: ‘Wetuo obi. Ihe a apụghị ime eme. Ihe a siri nnọọ ike nkweta.’ Broshuọ ahụ wepụtara ihe nnwapụta sitere na Bible na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu n’ụzọ doro nnọọ anya nke na mgbe ọ gụrụ ya, ọ kọwara na “ọ dị nnọọ ka ịracha mmanụ aṅụ.” Ná mgbede echi ya ọ gara nzukọ Ndịàmà Jehova nke mbụ ya, o nwekwara obi ụtọ n’ihe ọ nụrụ.

Mgbe ọmụmụ Bible mbụ o sooro Ndịàmà Jehova nwee na nkwurịta okwu zuru ezu n’echiche nke Bible banyere ise siga gasịrị, o bibiri siga ya, o setụbeghịkwa siga ọzọ. E duziiri ya ọmụmụ Bible ọtụtụ ugbo kwa izu. Ọnwa atọ mgbe ọ gụsịrị broshuọ Atọ n’Ime Otu, nakwa mgbe ọ gbasịrị arụkwaghịm n’ọrụ soja, ọ malitere isoro Ndịàmà na-ekere ókè n’ọrụ nkwusa ihu ọha. Ọnwa atọ mgbe nke ahụ gasịrị o gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke ma bụrụ onye e mere baptism. Ugbu a ọ na-eje ozi dị ka onye ozi oge nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya