Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 5/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àgwà Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ nke Na-ewe Oké Ego
  • Iwu E Chefuru Echefu
  • Ule Ọgụgụ Isi Maka Ụmụaka n’Oge
  • Ndị Ndepụtaghachi Na-elezi Anya
  • Ọ̀ Bụ Kọfị E Wepụrụ Caffeine na Ya n’Ezie?
  • Igbukpọsị Oké Ọhịa Gburugburu Ụwa
  • E Zuo Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
  • Chọọchị Katọlik Achọọ Mgbaghara
  • Ụtụ́ Ndị Na-ebibi Ihe
  • Abamuru nke Ndị E Were n’Ọrụ Meworo Okenye Karị
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nsogbu Ịkwọ Aka
    Teta!—1998
Teta!—1998
g98 5/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Àgwà Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ nke Na-ewe Oké Ego

Akụkọ sitere n’aka ọchịchị United States na-eme atụmatụ na ndị America mefuru ijeri $57.3 n’ọgwụ ndị iwu na-akwadoghị na 1995. Cocaine weere ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ego ahụ, ebe heroin, wii wii, na ọgwụ ndị ọzọ iwu machibidoro mejupụtara akụkụ fọrọ afọ. Onye ntụzi nke Ụlọ Ọrụ Mba Maka Ụkpụrụ Ịchịkwa Ọgwụ Ọjọọ na White House, bụ́ Barry McCaffrey, rịbara ama na ego ole e mefuru n’ọgwụ ọjọọ ndị a pụrụ ịkwụrụ otu nde mmadụ ụgwọ agụmakwụkwọ kọleji afọ anọ ma ọ bụ zụta ijeri lita 83 nke mmiri ara ehi iji zụọ ụmụ ọhụrụ na-adịghị eri nri ndị na-edozi ahụ, ka òtù Associated Press na-akọ. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ a agụnyeghị mmefu ndị metụtara ọdịmma ọha mmadụ, dị ka ịrị elu nke mpụ, ọgba aghara ná ndụ onwe onye na nke ezinụlọ, na mgbasa nke ọrịa ndị dị ka ịba ọcha n’anya, na ọrịa AIDS.

Iwu E Chefuru Echefu

Olè n’ime Iwu Iri Bible ka ị pụrụ ikwu n’isi? Otu nnyocha e mere na Rio de Janeiro chọpụtara na ihe karịrị 1 n’ime ndị Brazil 4 apụghị ikwu nke ọ bụla n’ime ha! N’ime ndị maara ma ọ dịkarịa ala otu n’ime iwu ndị ahụ, pasent 42 kwuru “Gị egbula mmadụ” ma ọ bụ “Gị ezula ohi.” Ndị ọzọ chetara “Gị enwela anyaukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ” (pasent 38), “Sọpụrụ nna na nne [gị]” (pasent 22), na “Gị agbala àmà ụgha” (pasent 14), ka magazin bụ́ Veja na-akọ. Nanị pasent 13 nke ndị zaghachirinụ chetara iwu nke atọ bụ́: “Gị ejila aha Chineke nke dị nsọ mee ihe efu.”

Ule Ọgụgụ Isi Maka Ụmụaka n’Oge

Ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ banyere ọgụgụ isi mmadụ kwere ugbu a na ụbụrụ nwa ọhụrụ na-agabiga oge ntolite ya kasị mkpa n’agbata oge ọmụmụ na afọ atọ. A na-echekwa na n’ịzaghachi ná mkpali nke uche, a na-eguzobe njikọ na-adịgide adịgide n’ụbụrụ n’oge uto a. N’ihi ya, ụfọdụ nne na nna amalitewo ile ụmụ ha ule ọgụgụ isi mgbe dị anya tupu ha abanye ụlọ akwụkwọ ọta akara, iji nyere ha aka ịkasị mee nke ọma n’asọmpi, ka magazin bụ́ Modern Maturity na-akọ. Otú ọ dị, Dr. Barry Zuckerman, bụ́ onyeisi oche nke ngalaba na-ahụ maka ụmụaka na nrịanrịa ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ nke Mahadum Boston, kwupụtara nchegbu maka nne na nna ndị na-enwe mmetụta nke “ịbụ ndị a rụgidere ‘ịkpali’ nwa ọhụrụ ha kwa minit” ná mgbalị ịzụlite “nwa ọhụrụ bụ ọkasị mma.” Richard Weinberg, bụ́ prọfesọ nkà uche na akparamàgwà ụmụaka, na-agbakwụnye, sị: “Ịkwanye ụmụaka ịsọ mpi mgbe ha dị nnọọ nta na-arụpụtakarị ihe dị iche. Hapụ ụmụaka gị ka ha nụrụ ụtọ oge ịbụ nwa ọhụrụ ha.”

Ndị Ndepụtaghachi Na-elezi Anya

E jiriwo mkpachara anya depụtaghachi ma jiri oké nlezianya nyefee akụkụ ihe odide ndị mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Bible ka Dr. Barbara Aland, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Maka Inyocha Agba Ọhụrụ, na Münster, Germany na-ekwu. “E nwebeghị ndehie ihe ma ọ bụ ọbụna mgbanwe ndị nkà mmụta okpukpe kpaliri,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Westfälische Nachrichten na-akọ. Kemgbe 1959 ụlọ ọrụ ahụ enyochawo ihe karịrị ihe odide 5,000 e ji aka dee, bụ́ ndị malitere ịdị Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya na n’oge ochie. E sebawo ihe dị ka pasent 90 nke ihe odide ndị ahụ n’obere film. N’ihi gịnị ka ndị depụtaghachiri Bible jiri lezie anya nke ukwuu otú ahụ ka ha ghara idehie ihe? N’ihi na ha “weere onwe ha dị ka ‘ndị ndepụtaghachi’ ọ bụghịkwa ndị dere akwụkwọ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

Ọ̀ Bụ Kọfị E Wepụrụ Caffeine na Ya n’Ezie?

Ndị caffeine na-adịghị adị mma n’ahụ na-echigharikwurukarị ihe ọṅụṅụ e wepụrụ caffeine na ya dị ka ihe ọzọ a pụrụ ịṅụ. Ma olee ohere ndị i nwere inweta kọfị e wepụrụ caffeine na ya n’ezie mgbe i kwuru ka e nye gị ya? Dị ka otu akụkọ pụtara na New York Times si kwuo, ha dị ihe dị ka 1 n’ime 3. Ngalaba Nlekọta Nri na Ọgwụ na United States na-akọwa kọfị e wepụrụ caffeine na ya dị ka nke nwere caffeine dị milligram abụọ ruo ise. Ma nnyocha sitere n’ebe 18 a na-ere kọfị na New York City kpughere na ọ̀tụ̀tụ̀ caffeine dị n’iko dị mililita 150 jiri nnukwu ihe dịgasịa iche, malite na milligram 2.3 ruo milligram 114 nke caffeine! Dị ka Òtù Ndị Na-ere Kọfị ná Mba ahụ si kwuo, otu iko kọfị hà otú o kwesịrị na-enwe ihe nọ n’agbata milligram 60 na 180 nke caffeine.

Igbukpọsị Oké Ọhịa Gburugburu Ụwa

“E bibiworị ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke oké ọhịa mbara ụwa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal da Tarde na-akọ. N’ime nde square kilomita 80 nke ebe ndị e nweburu oké ọhịa n’ụwa, nanị nde 30 fọdụrụ. Òtù Ụwa Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa (WWF) achọpụtawo na Esia bụ kọntinent a kasị gbukpọsịa oké ọhịa ya, n’ịbụ nke e bibiri pasent 88 nke ihe ọkụkụ ya mbụ. Na Europe ọnụ ọgụgụ ahụ bụ pasent 62, n’Africa pasent 45, na Latin America pasent 41, nakwa n’Ugwu America pasent 39. Ógbè Amazon, ebe e nwere oké ọhịa mmiri ozuzo nke ebe okpomọkụ kasị ibu n’ụwa, nwere ihe karịrị pasent 85 nke oké ọhịa mbụ ya fọdụrụnụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ O Estado de S. Paulo na-ehota Garo Batmanian nke WWF dị ka onye na-ekwu, sị: “Brazil nwere ohere izere ime otu mmehie ihe ahụ e mehiere n’oké ọhịa ndị ọzọ.”

E Zuo Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa

Otu akụkọ a gbasara na nso nso a sitere Canada mara ọkwa na “ìgwè ndị mpụ si mba dị iche iche na-elekwasị anya n’akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Mesọpotamia bụ́ ndị fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a hapụwo ha n’enweghị nchebe n’ihi agha Persian Gulf nke 1991,” ka World Press Review na-akọ. Na 1996, ndị ohi wabara n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Babilọn n’etiti ehihie ma weghara cylinder na nkume ndị e ji ihe odide cuneiform dee ihe n’elu ha. E mere atụmatụ na ihe oge ochie ndị ahụ dị ụkọ, nke ụfọdụ n’ime ha malitere ịdị n’oge ọchịchị Nebukadneza nke Abụọ, ga-akarị $735,000 n’ahịa ihe nkà nke mba nile. Ebe ọzọ ndị ohi lekwasịrị anya bụ obodo ochie bụ́ Al-Hadhr. Ná mgbalị ichebe akụ̀ ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa fọrọ afọ, gọọmenti ejiriwo brick na ụrọ rụchie ọnụ ụzọ na paseji nile nke obodo ahụ, ka magazin ahụ na-ekwu.

Chọọchị Katọlik Achọọ Mgbaghara

Chọọchị Roman Katọlik dị na France ebipụtawo “Nkwupụta nke Nchegharị,” na-arịọ Chineke na ndị Juu mgbaghara n’ihi “omume ọ̀ gbasara m?” nke Chọọchị Katọlik gosiri banyere mkpagbu nke ndị Juu n’okpuru ọchịchị Vichy nke France n’oge agha. Malite na 1940 ruo 1944, e jidere ihe karịrị ndị Juu 75,000 ma gbaara ha ụgbọ nwa mkpị site na France gaa n’ogige ọnwụ nke Nazi. N’ihe odide nke Achịbishọp Olivier de Berranger gụpụtara, chọọchị ahụ kwetara na o kwerewo ka ọdịmma nke onwe ya “kpuchie ibu ọrụ dabeere na Bible nke ịkwanyere mmadụ nile e kere n’onyinyo Chineke ùgwù,” ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde na-akọ. Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ụkọchukwu France kwupụtara okwu n’ịkwado ndị Juu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ kwadoro ọchịchị Vichy na ụkpụrụ ya dị iche iche. Nkwupụta ahụ kwuru ná mkpirikpi, sị: “Chọọchị a aghaghị ịmata na n’ihe banyere mkpagbu nke ndị Juu, na karịsịa n’ihe banyere ọtụtụ iwu mmegide ndị Juu nke ndị ọchịchị Vichy tiri, omume ọ̀ gbasara m karịrị enweghị mmasị n’ebe ọ dị nke ukwuu. Ịgba nkịtị bụ ihe e mere, ikwukwa okwu n’ịkwado ndị ahụ a na-emegbu bụ ihe a na-adịghị emekebe. . . . Taa, anyị na-ekwupụta na ịgba nkịtị a bụ ihie ụzọ. Anyị ghọtakwara na chọọchị a dị na France arụghị ọrụ ya dị ka onye na-akụziri akọ na uche ụmụ mmadụ ihe.”

Ụtụ́ Ndị Na-ebibi Ihe

Kemgbe ụtụ́ nkwụ na-acha ọbara ọbara batara na Peninsula Arebia n’ihe na-erughị afọ 20 gara aga, obere ahụhụ a atụwo ọnụ banye n’ime ọtụtụ puku osisi nkwụ ma kpata mmebi dị egwu. “A na-atụdị egwu na a pụrụ ibibisị nkwụ—bụ́ ‘mkpụrụ nke ndụ’ nke ndị Arebia eri afọ 5,000,” ka The Economist na-akọ. Ụtụ́ ahụ, nke dị nanị sentimita 5 n’ogologo, na-atụ ọtụtụ ọnụ n’ime ogwe nkwụ, jirikwa nwayọọ nwayọọ na-egbu osisi ahụ. Ọgwụ ahụhụ enwewo mmetụta dị nta n’ahụhụ ahụ, ọ nọgidekwara na-amụba ngwa ngwa n’ógbè ahụ dum.

Abamuru nke Ndị E Were n’Ọrụ Meworo Okenye Karị

Ndị ọrụ gafere afọ 47 na-adị nkọ ma na-adị uchu n’ụtụtụ karịa ndị ibe ha na-emebeghị okenye, ka The Times nke London na-akọ. Ebe ọ bụ na usoro a na-agbanwekarị onwe ya mgbe e mesịrị n’ụbọchị, Tom Reilly, nke Mahadum John Moores nke Liverpool, na-atụ aro ka ndị were mmadụ n’ọrụ dokwaa ka ndị ọrụ meworo okenye karị na-arụ ọrụ mbugharị n’oge ụtụtụ nakwa ka ndị na-emebeghị okenye na-arụ n’ehihie na mgbede. Ndị ọkà okwu ná nnọkọ nke Òtù Ndị Ọrụ Ọgwụ na Britain banyere ime agadi kpughekwara na nnukwu ụlọ ahịa na ụlọ ahịa ebe ndị ahịa na-ewere ihe ha chọrọ n’onwe ha na-ahọrọkarị iwere ndị mere okenye karị n’ọrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-egosi nchegbu ka ukwuu maka ndị ahịa ma na-egosipụta ịma banyere otú a ga-esi mee ihe ndị a na-enweghị ntụziaka e dere ede banyere ha. Ha na-agbasokwa “ụkpụrụ omume ndị ụlọ ọrụ pụrụ ịhapụwo,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya