Ị̀ Na-ekpebi Ihe Site n’Ọdịdị A Na-ahụ Anya?
Ị̀ NA-EKPEBI ihe akwụkwọ bụ site ná mkpo ya? A pụrụ imegharị gị anya. Iji zere nke ahụ, ị ga-ebu ụzọ chọpụta ihe ndị dị n’ime ya. E mere ihe atụ nke a n’ọnọdụ nke onye a ma ama a kpọtụrụ uche n’akụkọ ọdịnala ndị Turkey, bụ́ Nasreddin Hoja. (Okwu Turkish bụ́ hoja pụtara “onye nkụzi.”) Ọ “dị aghụghọ ma na-eme omume ime obodo, ọ maara ihe, dịkwa nzuzu . . . O ji okpukpe kpọrọ ihe, ma o nwere adịghị ike mmadụ.” Ọ bụ “onye ihe ndabara ọjọọ nke ndụ na-adịghị emeri.”—Tales of the Hoja, nke John Noonan dere, Aramco World, September-October 1997.
A kọrọ otu akụkọ banyere njem o mere ileta otu onyeisi bụ́ onye Turkey na isoro ya rie nri. “N’ụzọ nganga, [Nasreddin] rịdatara ma kụọ aka ná nnukwu ibo ụzọ mbata. Mgbe e meghere ya, ọ hụrụ na oriri ahụ amalitelarị. Ma tupu ọ kọwaa onwe ya, onye kpọrọ ya òkù, n’ile anya n’uwe njem ya ihe gburu, gwara ya ná nkenke na a dịghị anabata ndị arịrịọ.”
Nasreddin pụrụ, gaa n’akpa ịnyịnya ya, ma “yiri ákwà ya kasị mma: uwe mwụda silk mara mma a kwanyere aji, na ihe mfụchi isi silk buru ibu. N’ijike otú a, ọ laghachiri n’ibo ụzọ mbata ahụ ma kụọ aka ọzọ.
“Ugbu a, onye kpọrọ ya òkù nabatara ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ . . . Ndị odibo debere nri ọma dị iche iche n’ihu ya. Nasreddin Hoja wụnyere otu efere ofe n’ime akpa uwe mwụda ya. N’ụzọ juru ndị ọbịa ndị ọzọ anya, o tinyere anụ a hụrụ n’ọkụ n’ime ihe mfụchi isi ya. Mgbe ahụ, n’ihu onye ahụ kpọrọ ya òkù na-amaghị ihe ọ ga-eme, o tinyere ajị dị n’ihu uwe mwụda ya n’ime efere osikapa, na-atamu, sị, ‘Rie ihe, ajị, rie ihe!’
“‘Gịnị ka nke a pụtara?’ ka onye ahụ kpọrọ ya òkù jụrụ.
“‘Ọga m,’ ka Hoja ahụ zaghachiri, ‘Ana m enye uwe m nri. Dabere ná mmeso i mesoro m n’ọkara hour gara aga, o doro anya na ọ bụ uwe m, ọ bụghịkwa mụ, bụ ihe i lere ọbịa!’”
Lee ka anyị si na-ekpebikarị ihe n’ụzọ na-adịghị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị mma site n’ọdịdị a na-ahụ anya nanị! Mgbe Samuel onye amụma chere na nwanne Devid bụ́ Elaịab aghaghị ịbụ onye Jehova họọrọ ịbụ eze ọzọ nke Israel, Jehova gwara ya, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Ee, Jehova na-ekpebi ihe site n’ọnọdụ obi, ọ bụghị site n’ọdịdị a na-ahụ anya. Gịnị ka ị na-eme?
[Foto dị na peeji nke 31]
Jehova dọrọ Samuel aka ná ntị ka ọdịdị a na-ahụ anya ghara imegharị ya anya