Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 4/8 p. 32
  • Ihe Enyemaka Nkụzi Maka Ibi Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Enyemaka Nkụzi Maka Ibi Ndụ
  • Teta!—1997
Teta!—1997
g97 4/8 p. 32

Ihe Enyemaka Nkụzi Maka Ibi Ndụ

Otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ na Zimbabwe, Africa, kwuru na na Kọleji Nyatsime, ebe ọ na-akụzi, a na-enwe ihe ọmụmụ bụ́ “Nkụzi Maka Ibi Ndụ.” Ọ kọwara nsogbu ezinụlọ ndị o nweworo ma kweta na ya enwewo mkpa maka enyemaka iji gwọta ha.

N’ịkọwa ihe mere mgbe ọ gbasịrị akwụkwọ nke ya, o kwuru, sị: “Nsogbu malitere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ wee duje n’anyị ikpebi ikewa na November 1989.” E nwekwara nsogbu ndị ọzọ. O dere, sị: “Abụ m diọkpara nne m, onye bụ nwunye mbụ nke nna m. Mgbe m nọ n’afọ nke abụọ nke usoro ọzụzụ m dị ka onye nkụzi, nna m nwụrụ, na-ahapụ m ilekọta ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị m tọrọ 16.”

Isoro Ndịàmà Jehova n’ọmụmụ Bible nyeere onye nkụzi ụlọ akwụkwọ a aka ịgwọta nsogbu ezinụlọ ya. E jikọtaghachila ya na nwunye ya, ha nwekwara obi ụtọ. O dere, sị: “Mụ na nwunye m amụtawo site n’ahụmahụ anyị siri ike na mgbalị mmadụ ịgwọta nsogbu ya n’adabereghị na Chineke adịghị amịta mkpụrụ.” Ma, olee banyere inyere ụmụ akwụkwọ ya aka ná nsogbu ha?

“Atụụrụ m hedimasta ụlọ akwụkwọ anyị na ndị nkụzi ndị ọzọ aro inweta akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work dị ka akwụkwọ ọmụmụ ihe kwesịrị ekwesị,” ka o dere. “Ha nile kwetara, ụlọ akwụkwọ ahụ nyekwara m ọda maka akwụkwọ 56, bụ́ nke m bugarala ụlọ akwụkwọ ahụ eri mgbe.”

Anyị kwere na gị onwe gị kwa ga-erite uru dị ukwuu site n’ihe enyemaka nkụzi a nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peji 320. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmata otú ị ga-esi nweta otu n’ime ya ma ọ bụ nwee mmasị ka e duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya