Ihe Enyemaka Nkụzi Maka Ibi Ndụ
Otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ na Zimbabwe, Africa, kwuru na na Kọleji Nyatsime, ebe ọ na-akụzi, a na-enwe ihe ọmụmụ bụ́ “Nkụzi Maka Ibi Ndụ.” Ọ kọwara nsogbu ezinụlọ ndị o nweworo ma kweta na ya enwewo mkpa maka enyemaka iji gwọta ha.
N’ịkọwa ihe mere mgbe ọ gbasịrị akwụkwọ nke ya, o kwuru, sị: “Nsogbu malitere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ wee duje n’anyị ikpebi ikewa na November 1989.” E nwekwara nsogbu ndị ọzọ. O dere, sị: “Abụ m diọkpara nne m, onye bụ nwunye mbụ nke nna m. Mgbe m nọ n’afọ nke abụọ nke usoro ọzụzụ m dị ka onye nkụzi, nna m nwụrụ, na-ahapụ m ilekọta ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị m tọrọ 16.”
Isoro Ndịàmà Jehova n’ọmụmụ Bible nyeere onye nkụzi ụlọ akwụkwọ a aka ịgwọta nsogbu ezinụlọ ya. E jikọtaghachila ya na nwunye ya, ha nwekwara obi ụtọ. O dere, sị: “Mụ na nwunye m amụtawo site n’ahụmahụ anyị siri ike na mgbalị mmadụ ịgwọta nsogbu ya n’adabereghị na Chineke adịghị amịta mkpụrụ.” Ma, olee banyere inyere ụmụ akwụkwọ ya aka ná nsogbu ha?
“Atụụrụ m hedimasta ụlọ akwụkwọ anyị na ndị nkụzi ndị ọzọ aro inweta akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work dị ka akwụkwọ ọmụmụ ihe kwesịrị ekwesị,” ka o dere. “Ha nile kwetara, ụlọ akwụkwọ ahụ nyekwara m ọda maka akwụkwọ 56, bụ́ nke m bugarala ụlọ akwụkwọ ahụ eri mgbe.”
Anyị kwere na gị onwe gị kwa ga-erite uru dị ukwuu site n’ihe enyemaka nkụzi a nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peji 320. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmata otú ị ga-esi nweta otu n’ime ya ma ọ bụ nwee mmasị ka e duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.