Ndị Inyom Ịdị Ndụ Ka Ogologo Ma Ọ Bụchaghị nke Ka Mma
GBURUGBURU ụwa ndị inyom na-alụ di mgbe ha mere okenye karị, na-ebelata aka n’ịmụ ụmụ, na-adịkwa ndụ ka ogologo. “Ndụ ndị inyom na-agbanwe agbanwe,” ka magazin bụ́ UNESCO Sources na-akọ. N’agbata 1970 na 1990, afọ ndụ ndị inyom na-adịru site n’ọmụmụ jiri afọ anọ rịa elu ná mba ndị mepere emepe na ihe fọrọ nke nta ka o ruo afọ itoolu ná mba ndị ka na-emepe emepe. “Nke a pụtara na n’ógbè ndị mepere emepe taa, ndị inyom na-eji nkezi nke afọ 6.5 adị ndụ karịa ndị ikom. N’ógbè ndị ka na-emepe emepe ọdịiche ya bụ afọ ise na Latin America na Caribbean, afọ 3.5 n’Africa na afọ atọ n’Esia na Pacific.”
Otú o sina dị, nye ọtụtụ ndị inyom, ịdị ndụ ka ogologo apụtaghị ịdị ndụ ka mma. Our Planet, magazin òtù Mba Ndị Dị n’Otu, na-ekwu na nye ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị inyom bi n’ụwa, ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ruuru mmadụ ka bụ “ihe ụtọ a wụkwasịrị na keki bụ́ nke ha na-edetụbeghị ire ma ọlị. Ha ka na-achọ achịcha nkịtị a na-etinyeghị ihe na mmiri.” Ma, ọbụna ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ, ka òtù UN na-ekwu, dị ebe na-agaghị eru ọtụtụ nde aka n’ihi na ihe ka ka ọnụ ọgụgụ nke ukwuu ná ndị iti, ndị gbara ọsọ ndụ, na ndị ogbenye bi n’ụwa bụ ndị inyom. N’agbanyeghị ọganihu ụfọdụ, ka UNESCO Sources na-ekwubi, “ọdịnihu dị ukwuu maka ndị inyom . . . yiri ihe olileanya na-adịghị ya.”