Imagination World/stock.adobe.com
Ozi Ọma Si n’Okwu Chineke—Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Ga-enweli Olileanya
Kwa afọ, nde kwuru nde mmadụ na-esi n’ụlọ ha agbapụ n’ihi nsogbu dị n’ebe ha bi. Ì so ná ndị ihe a na-agbawa obi mere? Ọ bụrụ na i so, ka obi sie gị ike na e nwere onye ga-enyeliri gị aka. Chineke na-ekwe gị nkwa na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Ị ga-amụta banyere nkwa ahụ n’Akwụkwọ Nsọ.
Otu kọmishọna nke Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yuropa aha ya bụ Christos Stylianides kwuru, sị: “Ihe dị ndị gbara ọsọ ndụ mkpa abụghị naanị ihe ndị anyị ji gbatara ha ọsọ enyemaka, kama, e kwesịkwara ime ka ha nwee olileanya na ọdịnihu ga-aka mma.”b Ọ bụrụ na mmadụ nwere olileanya, obi na-esi ya ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ma, e wepụ olileanya, e kwesịkwara ịkasi ndị gbara ọsọ ndụ obi ka ha nwee ike idi nsogbu a bịaara ha.
“Mgbe m si n’obodo anyị gbapụ, hapụ ndị ezinụlọ m, ụdị owu nọ na-ama m amatụbeghị m mbụ. Ụjọ nọ na-atụ m, obi adịghị m mma, m nọkwa na-echegbu onwe m.”—Emmanuel, onye Heiti.
Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Ọ bụrụ na i si n’obodo unu gbapụ, e kwesịrị ịkasi gị obi, meekwa ka i nwee olileanya. Olee otú Okwu Chineke bụ́ Baịbụl ga-esi nyere gị aka?
Ihe Baịbụl kwuru ndị na-akasi obi
Baịbụl kwuru, sị: ‘Jehovac hụrụ onye mbịarambịa n’anya.’—Diuterọnọmi 10:17, 18.
Ihe a pụtara na ị nọghị naanị gị. Jehova Chineke, Onye e dere uche ya na Baịbụl, ghọtara otú ihe si dịrị gị, ọ hụrụ gị n’anya, otú obi dị gị na-emetụkwa ya n’obi.
Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”—Abụ Ọma 145:18.
Ihe a pụtara na i kpee ekpere, Jehova na-anụ ya. Ọ ga-emeli ka obi ruo gị ala. Na Baịbụl, ị ga-ahụkwa ihe ndị o kwuru ga-enyere gị aka idi nsogbu gị na ya na-alụ.
Baịbụl kwuru, sị: “Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ . . . Onye Pụrụ Ime Ihe Niile anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.”—Job 34:10, 12.
Ihe a pụtara na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ị na-ata. Ọ naghị ata gị ahụhụ, ọ naghịkwa eme ka ihe siere gị ike iji nwaa gị.
Ihe Baịbụl kwuru ndị na-eme ka anyị nwee olileanya
Baịbụl kwuru ihe Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Legodị otú okwu ndị ahụ si enyere ndị gbara ọsọ ndụ aka.
Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”—Mkpughe 21:4.
Ihe a pụtara na ahụhụ ga-akwụsị. Chineke kwere nkwa na ọ ga-akwụsị nsogbu niile na-eme ka ike ndụ gwụ mmadụ.
“N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-akwụsị ikpe na-ezighị ezi na ihe ọjọọ niile na-emenụ. Nkwa a na-eme ka m na-eche banyere ụbọchị ahụhụ niile ga-akwụsị.”—Karla, onye El Salvadọ.
Baịbụl kwuru, sị: “A gaghịzi echeta ihe niile mere na mbụ. Ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịzaya 65:17.
Ihe a pụtara na obi agaghịzi na-agbawa anyị n’ihi ihe ọjọọ ndị mere anyị. Chineke ga-eme ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ n’ihi ihe ọjọọ ndị mere gị n’oge gara aga.
“Baịbụl kwere nkwa na anyị agaghịzidị echeta ahụhụ anyị tara na ihe ndị anyị hapụrụ gbapụ. Nkwa a na-enyere m aka idi nsogbu anyị nọ na ya n’ihi na m ma na ihe niile ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.”—Natalia, onye Yukren.
Baịbụl kwuru, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze . . . malite ịchị . . . Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa.”—Daniel 2:44.
Ihe a pụtara na e nwere otu ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe chịwa ụwa. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eji ọchịchị nke ya, nke dị n’eluigwe, dochie ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọchịchị a ga-eme ka udo dị n’ụwa, obi eruo mmadụ niile ala, a na-ekpe ikpe ziri ezi, a gaghịzikwa enwe onye dara ogbenye.—Maịka 4:3, 4.
“Obi bịara sie m ike mgbe m matara na nsogbu ndị dị ka mmegbu, ile mmadụ anya n’ihu, atụkwasịghị mmadụ obi, ịkpa ókè agbụrụ agaghị adịte aka. Alaeze Jehova ga-eme ka ha niile kwụsị n’oge na-adịghị anya.”—Mustafa, onye bi n’Eshia.
Nkwa ndị dị na Baịbụl ga-akasi gị obi
Ihe Baịbụl kwuru ndị na-eme ka anyị nwee amamihe
Ihe ndị bara uru Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe mere gị. Ha ga-enyekwara gị aka idi ihe ndị gbanwere ná ndụ gị, ma idi ihe ndị funahụrụ gị. Legodị otú ihe ndị a Baịbụl kwuru si enyere ndị gbara ọsọ ndụ aka:
Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”—Luk 12:15.
Otú ihe a bara uru Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka: O nwere ike ịbụ na obi na-ajọ gị njọ maka ihe ndị funahụrụ gị, otú ihe niile si mee aka na-emekwa gị ka ọ̀ bụ nro. Ma ọ bụrụ na i cheta na ndụ gị ka ihe ndị ahụ ị hapụrụ mkpa, ọ ga-eme ka obi kwụsịtụ ịjọ gị njọ maka ihe ndị ahụ.
“Ndụ ka ihe onwunwe mkpa. Oge ụfọdụ, ihe onwunwe ma ọ bụ ego agaghị enyere gị aka.”—Natalia, onye Yukren.
Baịbụl kwuru, sị: “Asịla, ‘Gịnị mere oge gara aga ji ka oge a mma?’”—Ekliziastis 7:10.
Otú ihe a bara uru Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka: O nwere ike ịbụ na ihe siiri gị ezigbo ike ugbu a, ma ọ bụrụ na ị naghị eji otú ihe dịịrị gị ugbu a atụnyere otú ihe dịbuuru gị, ọ ga-enye aka mee ka obi kwụsị ịjọ gị njọ.
“Iwere ụwa m otú m si hụ ya ugbu a na-enyere m aka ịna-enwe obi ụtọ.”—Eli, onye Rụwanda.
Baịbụl kwuru, sị: “Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”—1 Timoti 6:8.
Otú ihe a bara uru Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka: Gbalịa ka ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ i nwere ju gị afọ. Ọ bụrụ na ihe ndị i nwere eju gị afọ, ị gaghị na-echegbu onwe gị, obi ga-erukwa gị ala.
“Baịbụl na-enyere m aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị, kama ilekwasị anya n’ihe ndị anyị hapụrụ. Obi dị mụ na nwunye m ụtọ na anyị dị ndụ, nọrọkwa ebe ihe na-agaghị eme anyị.”—Ivan, onye Yukren.
Baịbụl kwuru, sị: “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.”—Matiu 7:12.
Otú ihe a bara uru Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka: Gị na ndị ọzọ ga-adị ná mma ma ị gbaa mbọ na-enwere ndị ọzọ ndidi, nweekwa obi ọma. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịnabata gị, ha agharakwa ịkpọ gị asị.
“Obi na-adị ndị mmadụ mma ma a kwanyere ha ùgwù, jiri obiọma meso ha ihe, gosikwa ha na a hụrụ ha n’anya. Àgwà ndị a nwere ike ime ka gị na ndị bi n’ebe ọhụrụ i bi dịrị ná mma.”—Angelo, onye Siri Lanka.
Baịbụl kwuru, sị: ‘Na-arịọsinụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, ga-eche obi unu na echiche unu nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Otú ihe a bara uru Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka: Kpee ekpere kọọrọ Chineke otú ọ dị gị n’obi, ihe na-akpa gị, ihe na-atụ gị ụjọ, nakwa ihe na-echegbu gị. Ikpe ekpere ga-emeli ka obi ruo gị ala, meekwa ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị banyere otú ihe si dịrị gị ugbu a.
“M na-ekpe ekpere mgbe ọ bụla m nwere nsogbu, Chineke na-azakwa m. Ihe ndị m mụtara na Baịbụl na-eme ka obi ruo m ala.”—Yo, onye Saụt Sudan.
“Ezigbo ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl na-eme ka obi ruo m ala, mezie ka m nwee ike idi ihe isi ike.”—Valentina, onye Yukren.
“Obi na-esi m ike ma m cheta na Jehova Chineke kwere nkwa na ndụ ga-aka mma n’ọdịnihu.”—Emmanuel, onye Heiti
Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere nkwa ndị Baịbụl kwere ndị ga-akasi gị obi ma mee ka i nwee olileanya nakwa ihe mere ị ga-eji tụkwasị ha obi? Kwuo ka Ndịàmà Jehova bịa na nke gị. Obi ga-adị ha ụtọ inyere gị aka.
a Kọmishọna nke Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop nke na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe gbata gbata.
b E nwere ụzọ ndị abụọ ngalaba Òtù Mba Ụwa nke na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ na-akpọ ndị gbara ọsọ ndụ. Ha bụ ndị gbagara na mpaghara ọzọ ná mba ha na ndị si ná mba ha gbaga ná mba ọzọ.
c Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”