Gịnị Ga-eme Okpukpe Dị Iche Iche?—Ihe Baịbụl Kwuru
Ike okpukpe ọ̀ gwụla gị ka ọ̀ bụ na ihe a na-eme na ya na-asọzi gị oyi? N’agbanyeghị na okpukpe emeerela ụfọdụ ndị nakwa obodo ụfọdụ ihe ọma, ọ kpatakwala ọtụtụ nsogbu. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion and War kwuru na ụfọdụ n’ime agha ndị kpụ ọkụ n’ọnụ a lụrụ n’ụwa a bụ n’ihi na ihe otu okpukpe kweere dị iche n’ibe ya. Ndị isi okpukpe na-ejikarị okpukpe ha akwado ihe ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ, kama iji ya na-akwado ofufe Chineke. Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-ekpuchikwa ihe ọjọọ ndị isi okpukpe ibe ha na-eme, dị ka, imetọ ụmụaka na mpụ ndị ọzọ ha na-eme n’okwu ego.
Ọ bụrụ na ihe ndị okpukpe na-eme agwụla gị ike, oleezi otú i chere obi dị Chineke maka ha? Baịbụl gosiri na obi adịghị Chineke mma maka ihe ọtụtụ okpukpe na-eme. Baịbụl bukwara amụma dị iche iche ndị kwuru ihe Chineke ga-eme okpukpe ndị ahụ. Baịbụl ji ihe atụ gosi na Chineke ga-eme okpukpe niile dị n’ụwa ihe a na-emetụbeghị mbụ.
Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-eme okpukpe n’ọdịnihu?
Amụma: N’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe, e kwuru banyere otu nwaanyị akwụna aha ya bụ Babịlọn Ukwu. Nwaanyị akwụna a nọ ọdụ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie. Ma, anụ ọhịa ahụ mechara kpọọ nwaanyị ahụ asị ma gbuo ya.—Mkpughe 17:3, 5, 16.
Ihe ọ pụtara: Nwaanyị akwụna ahụ a kpọrọ Babịlọn Ukwu nọchiri anya okpukpe ụgha niile, ya bụ, okpukpe niile Chineke na-anaghị anabata.a Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nọchiri anya Òtù Mba Ụwa (UN),b ebe anụ ọhịa nke nwere mpi iri nọchiri anya ọchịchị niile dị n’ụwa.c Ọdụ nwaanyị akwụna ahụ nọ n’elu anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie na-egosi otú okpukpe ụgha si na-agba mbọ na-eme ka Òtù Mba Ụwa na-eme ihe ọ chọrọ. Ogbugbu anụ ọhịa abụọ ahụ gburu nwaanyị akwụna ahụ na-egosi na Òtù Mba Ụwa na ndị ọchịchị mba dị iche, bụ́ ndị na-akwado ya, ga-alụso okpukpe ụgha niile dị n’ụwa ọgụ ma bibie ha. A ga-esi otú a kpochapụ okpukpe ụgha niile. Ụdị ihe a emetụbeghị mbụ.
Olee otú a ga-esi ebibi okpukpe ụgha?
Amụma: “Mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, nara ya ihe niile o nwere . . . ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam. N’ihi na Chineke mere ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi [n’obi ndị ọchịchị ụwa], ya bụ, ka ha jiri otu obi nye anụ ọhịa ahụ alaeze ha . . . Ọ bụ ya mere a ga-eji taa ya ahụhụ niile a ga-ata ya n’otu ụbọchị. Ọ ga-eru uju. Ọ ga-anọ n’ụkọ nri. Ọ ga-anwụ, a ga-akpọkwa ya ọkụ kpamkpam, n’ihi na Jehovad Chineke, bụ́ onye mara ya ikpe, dị ike.”—Mkpughe 17:16, 17; 18:8.
Ihe ọ pụtara: Chineke ga-eme ka “imezu nzube ya” dịrị ndị ọchịchị ụwa n’obi. Ọ ga-eme ka ha nye Òtù Mba Ụwa “alaeze ha,” ya bụ, ikike ọchịchị ha. Òtù Mba Ụwa ga-ejizi ikike ọhụrụ a e nyere ya bibie okpukpe ụgha n’ụwa niile. Ọ ga-adị ka ihe a dị ịtụnanya ò mere “n’otu ụbọchị,” ya bụ na ọ ga-eme ngwa ngwa. Ọ ga-ejụkwa ọtụtụ ndị mmadụ anya n’ihi na ha agaghị atụ anya ya.—Mkpughe 18:21
Gịnị mere a ga-eji bibie okpukpe ụgha?
Amụma: “Mmehie ya karịrị akarị, Chineke ga-ekpekwa ya ikpe maka ihe ọjọọ ndị o mere.”—Mkpughe 18:5.
Ihe ọ pụtara: Okpukpe ụgha emeela ọtụtụ ihe ọjọọ kemgbe ọtụtụ narị afọ. Legodị ụfọdụ “mmehie ya” ndị mere Chineke ji kpebie ibibi ya:
Itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kama ka ha tụkwasị Alaeze Chineke obi, bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.e (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; Jọn 6:15; 18:36) Ma, okpukpe ụgha na-agba ndị mmadụ ume ka ha tụkwasị ọchịchị ụmụ mmadụ obi. Ebe ọ bụ na okpukpe ụgha, bụ́ Babịlọn Ukwu, na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, gharakwa ịna-erubere Chineke isi, amụma dị n’Akwụkwọ Mkpughe kwuru na ọ “kwara iko.” Ọ dabakwara adaba na a kpọrọ ya “oké nwaanyị akwụna” n’amụma ahụ.—Mkpughe 17:1, 2; Jems 4:4.
Tigbuo zọgbuo. E kwuru na ọbara “ndị niile e gburu n’ụwa” dị n’isi okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:24) Ọtụtụ okpukpe anaghị akụziri ndị òtù ha ka ha na-eme udo. Ọtụtụ n’ime ha na-akwado agha, na-agbakwa ndị mmadụ ume ka ha soro lụọ agha ma tinye aka na tigbuo zọgbuo.
Anyaukwu. Okpukpe ụgha na-ebi “ndụ okomoko.” (Mkpughe 17:4; 18:7) Ọtụtụ okpukpe ejirila ike ha nwere, sikwa n’aka ndị enyi ha nọ n’ọkwá ukwu kpakọjuo ọtụtụ akụnụba. Anyaukwu ha na-akpasu Chineke iwe.—Taịtọs 1:7.
Ụgha. Okpukpe ụgha na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị na-adịghị na Baịbụl, na-emekwa ka ha na-eme ihe dị iche n’ihe Baịbụl kwuru.f Ọtụtụ ihe ndị mmadụ kweere na ihe ndị mmadụ na-eme, bụ́ ndị na-eduhie ndị mmadụ ma na-emebi aha Chineke, si n’aka okpukpe ụgha. Ọ bụ ya mere amụma Baịbụl ji kpọọ ya “nne ihe ndị rụrụ arụ dị n’ụwa.”—Mkpughe 17:5; 18:23.
À ga-ebibi okpukpe niile?
Mba. Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere ìgwè mmadụ si ebe dị iche iche n’ụwa niile, ndị ọ kpọrọ “oké ìgwè mmadụ.” (Mkpughe 7:9) O kwuru na oké ìgwè mmadụ a “yi uwe mwụda na-acha ọcha” nke pụtara na ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ìgwè mmadụ a anwụghị n’oge “oké mkpagbu.” “Oké mkpagbu” bụ aha Baịbụl kpọrọ oge a ga-ebibi okpukpe ụgha na ndị iro Chineke ndị ọzọ niile. (Mkpughe 7:13, 14; 19:11, 19-21) Oké ìgwè mmadụ ahụ ndị yi uwe mwụda na-acha ọcha nọ n’ezigbo okpukpe bụ́ nke ga-adịru ebighị ebi.g
Ọkọ agaghị akọ ìgwè mmadụ ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha
Olee otú mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha si gbasa gị?
Ịmata na Chineke akwadoghị arụrụala ndị okpukpe na-arụ ga-eme ka obi ruo gị ala. Obi ga-esili gị ike na ọdịnihu ga-aka mma n’ihi na ị ma na n’oge na-adịghị anya agaghịzi enwe ụdị okpukpe dị iche iche ndị na-emebi aha Chineke ma na-akpatara ndị mmadụ ahụhụ.
Ka obi sie gị ike na mmadụ ga-efeli Chineke otú Chineke ga-anabata. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ sịrị, “Ndị na-efe Nna m otú ọ chọrọ ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na n’eziokwu, Nna m na-achọ ụdị ndị ahụ ka ha fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Chineke na-agwa ndị chọrọ ife ya, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya (ya bụ, Babịlọn Ukwu) pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie, ọ bụrụkwa na unu achọghị ka a taa unu ahụhụ a ga-ata ya.” (Mkpughe 18:4, 5) N’eziokwu, Chineke na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa fee ya n’eziokwu. (1 Timoti 2:3, 4) Ọ na-ekwe ndị niile zara òkù a nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.
a Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu?” ka ị hụ ihe anọ ga-enyere gị aka ịmata ihe Babịlọn Ukwu pụtara.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Na-acha Uhie Uhie E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 17?” ka ị hụ ihe isii ga-enyere gị aka ịmata ihe anụ ọhịa ahụ bụ.
c Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?” ka ị hụ otú ị ga-esi amata anụ ohịa ahụ.
d Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”
e Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? ka ị matakwuo banyere isiokwu a.
f Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “È nwere okpukpe ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst so na Babịlọn Ukwu?” ka ị hụ ihe atụ ụfọdụ.
g Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?” ka ị hụ otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịma okpukpe bụ́ nke ezigbo ya.