IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Mee Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Ga-azọpụtali Gị
Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 13:25–14:4 ka ị hụ otú ndị Izrel si gosi na ha atụkwasịghị Jehova obi.
Matakwuo ihe ndị merenụ. Gịnị mere obi ji kwesị isi ndị Izrel ike na Jehova ga-azọpụtali ha mgbe ha si n’Ijipt pụọ? (Ọma 78:12-16, 43-53) Gịnị mere ha ji kwụsị ịtụkwasị Jehova obi? (Diut. 1:26-28) Olee otú Joshụa na Keleb si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi?—Ọnụ Ọgụ. 14:6-9.
Mekwuo nchọnchọ. Gịnị ka ndị Izrel gaara eme ka obi sikwuo ha ike na Jehova ga-azọpụtali ha? (Ọma 9:10; 22:4; 78:11) Olee otú ịtụkwasị Jehova obi si gbasa ịkwanyere ya ùgwù?—Ọnụ Ọgụ. 14:11.
Chee ihe ndị ọ na-akụziri gị. Jụọ onwe gị, sị:
‘Olee oge ndị o nwere ike isiri m ike ịtụkwasị Jehova obi?’
‘Gịnị ka m ga-eme ka m tụkwasịkwuo Jehova obi ugbu a nakwa n’ọdịnihu?’
‘Gịnị ka obi siri m ike na ya ka oké mkpagbu ji ọsọ na-abịa?’—Luk 21:25-28.