Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Nọvemba p. 22-27
  • “Ị Bụ Onye A Hụrụ n’Anya nke Ukwuu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ị Bụ Onye A Hụrụ n’Anya nke Ukwuu”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ JIZỌS SI NYERE NDỊ MMADỤ AKA ỊGHỌTA NA HA BARA URU
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ELE ONWE ANYỊ ANYA OTÚ JEHOVA SI ELE ANYỊ
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Ụbọchị Iri Anọ Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụwa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Nọvemba p. 22-27

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

“Ị Bụ Onye A Hụrụ n’Anya nke Ukwuu”

“Ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.”​—DAN. 9:23.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-enyere ndị na-eche na e nweghị uru ha bara aka ịmata na Jehova hụrụ ha n’anya nke ukwuu.

1-2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmata na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu?

JEHOVA hụrụ ndị ya n’anya nke ukwuu. Mana, ụfọdụ n’ime ha echeghị na ha bara uru. O nwere ike ịbụ n’ihi na e nwere ndị mesoro ha ka ndị na-abaghị uru. È nwetụla mgbe ọ dị gị ka ị baghị uru? Ọ bụrụ na e nwetụla, gịnị ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?

2 Otu ihe nwere ike inyere gị aka bụ iche gbasara akụkọ ndị e dere na Baịbụl gosiri otú Jehova chọrọ ka e si na-ele ndị mmadụ anya ma na-emeso ha. Jizọs kwanyeere ndị mmadụ ùgwù, na-emesokwa ha ihe otú dị mma. Ihe ahụ o mere gosiri na ya na Nna ya ji ndị chere na e nweghị uru ha bara kpọrọ ezigbo ihe. (Jọn 5:19; Hib. 1:3) N’isiokwu a, anyị ga-ekwu (1) otú Jizọs si nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ha bara uru nakwa (2) otú anyịnwa ga-esi mee ka obi sie anyị ike na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.​—Hag. 2:7.

OTÚ JIZỌS SI NYERE NDỊ MMADỤ AKA ỊGHỌTA NA HA BARA URU

3. Olee otú Jizọs si meso ndị Galili bịara ka o nyere ha aka?

3 Mgbe Jizọs na-ekwusa ozi ọma na Galili, ọtụtụ ndị bịara ka ha gee ya ntị nakwa ka ọ gwọọ ha. Jizọs chọpụtara na “a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Ndị isi okpukpe nọ na-eleda ha anya, na-akpọdị ha “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:47-49) Ma, Jizọs kwanyeere ha ùgwù. Otú o si mee ya bụ na o wepụtara oge kụziere ha ihe ma gwọọ ha ọrịa ha. (Mat. 9:35) Ihe ọzọ o mere iji nyekwuoro ọtụtụ ndị aka bụ na ọ zụrụ ndịozi ya ikwusa ozi ọma, gwakwa ha ka ha ‘gwọọ ndị ọrịa.’​—Mat. 10:5-8.

4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si meso ndị a na-eleda anya?

4 Otú Jizọs si na-emere ndị ọzọ obiọma ma na-akwanyere ha ùgwù gosiri na ya na Nna ya ji ndị a na-eledakarị anya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ị na-efe Jehova, ma obi esighị gị ike na ọ hụrụ gị n’anya, chee gbasara otú Jizọs si meso ndị chọrọ ịmụta ihe n’aka ya. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu.

5. Kọwaa otú ihe si dịrị otu nwaanyị Jizọs hụrụ na Galili.

5 E wezụga ịkụziri ìgwè mmadụ ihe, Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe n’otu n’otu, nyekwara ha aka. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma na Galili, ọ hụrụ otu nwaanyị rịarala ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. (Mak 5:25) Iwu Mosis kwuru na ọ dịghị ọcha nakwa na onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-aghọkwa onye na-adịghị ọcha. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ na-anọrọ onwe ya ọtụtụ mgbe. Ọ naghịkwa eso ndị ọzọ efe Jehova n’ụlọ nsọ ma ọ bụ n’oge ememme. (Lev. 15:19, 25) O doro anya na ọ bụghị naanị na ahụ́ adịghị nwaanyị a, o nwekwara ike ịbụ na o chere na e nweghị onye hụrụ ya n’anya.​—Mak 5:26.

6. Olee otú e si gwọọ nwaanyị oruru ọbara?

6 Nwaanyị a ọrịa ji chọrọ ka Jizọs gwọọ ya. Ma, ọ gwaghị Jizọs ka ọ gwọọ ya. Maka gịnị? O nwere ike ịbụ na ọrịa ahụ na-eme ya ihere ma ọ bụkwanụ na ọ tụrụ ụjọ na Jizọs ga-achụpụ ya maka na o bu ọrịa ahụ bata n’ebe ìgwè mmadụ nọ. N’ihi ya, naanị ihe o mere bụ imetụ uwe elu Jizọs aka maka na obi siri ya ike na ọ ga-agbake ma o mee otú ahụ. (Mak 5:27, 28) Jehova gọziri ya maka okwukwe ya. Ọrịa ya ahụ lara. Jizọs jụziri onye metụrụ ya aka, nwaanyị ahụ agwa ya na ọ bụ ya. Olee otú Jizọs si meso ya?

7. Olee otú Jizọs si meso nwaanyị ahụ ọrịa na-ekweghị ṅụọ mmiri tọgbọ iko? (Mak 5:34)

7 Jizọs meere nwaanyị ahụ obiọma ma kwanyere ya ùgwù. Ọ chọpụtara na “ụjọ” ji ya, ya ‘ana-amakwa jijiji.’ (Mak 5:33) N’ihi otú obi dị nwaanyị ahụ, Jizọs gwara ya ihe ga-agba ya ume. Ọ kpọdịrị ya “nwa m nwaanyị.” Ihe a ọ kpọrọ ya gosiri na ọ na-akwanyere ya ùgwù, na-emere ya obiọma, ma hụ ya n’anya. (Gụọ Mak 5:34.) Ihe e ji kọwaa amaokwu a kwuru na ọ bụ nke a bụ naanị oge Baịbụl kwuru na Jizọs kpọrọ nwaanyị “nwa m nwaanyị.” O nwere ike ịbụ maka na ọ hụrụ na ezigbo ụjọ ji ya. Chegodị otú obi si ruo nwaanyị ahụ ala. A sị na Jizọs baara ya mba, obi gaara amawa ya ikpe mgbe ọ na-ala n’agbanyeghị na a gwọọla ya ọrịa ya. Kama ime otú ahụ, Jizọs nyeere ya aka ịghọta na Nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe.

8. Olee nsogbu ndị bịaara otu nwanna nwaanyị na Brazil?

8 Taakwa, ọrịa na-echi ụfọdụ ndị ohu Chineke ọnụ n’ala, ya emeekwa ka ha na-eche na e nweghị uru ha bara. E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile na Brazil. Aha ya bụ Maria.a Mgbe a mụrụ ya, o nweghị ụkwụ, o nweghịkwa aka ekpe. Ọ sịrị: “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-akọ m ọnụ n’ihi otú m dị. Ha gụrụ m aha ndị na-agbawa m obi. Mgbe ụfọdụ, ndị ezinụlọ anyị na-emesokwa m ka onye na-enweghị uru ọ bara.”

9. Gịnị nyeere Maria aka ịghọta na Jehova hụrụ ya n’anya?

9 Gịnị nyeere Maria aka? Mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova, ụmụnna gbara ya ume ma nyere ya aka ịna-ele onwe ya anya otú Jehova si ele ya. Ọ sịrị: “Ụmụnna nyeere m aka dị ọtụtụ. Eji m obi m niile na-ekele Jehova maka na ọ kpọbatara m n’ezinụlọ ya magburu onwe ya.” Ụmụnna nyeere Maria aka ịghọta na Chineke ji ya kpọrọ ihe.

10. Gịnị na gịnị bụ nsogbu Meri Magdalin nwere? (Kọwaakwa foto.)

10 Ka anyị hụ otú Jizọs si nyere onye ọzọ aka, ya bụ, Meri Magdalin. Mmụọ ọjọọ asaa nọ na-enye ya nsogbu. (Luk 8:2) Ọ ga-abụ na e nwere otú ọ na-emecha maka nsogbu ahụ ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya. N’ihi ya, ndị mmadụ na-agbara ya ọsọ. N’oge ahụ ọ na-ata ahụhụ, ọ ga-abụrịrị na ọ na-adị ya ka ọ̀ bụ onye a jụrụ ajụ na onye na-enweghị mmadụ. Ụjọ nọkwa na-atụ ya. Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ na-enye ya nsogbu, ya esosiwe Jizọs ike. Olee ihe ọzọ Jizọs meere Meri Magdalin iji nyere ya aka ịghọta na Chineke hụrụ ya n’anya nke ukwuu?

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe Jizọs na-ele Meri Magdalin ka o gbusara ikpere n’ala n’akụkụ ụlọ. Ìhè adịchaghị ebe ahụ. 2. Ebe Meri Magdalin ji obi ụtọ soro Jizọs na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ na-aga.

Olee otú Jizọs si mee ka obi sie Meri Magdalin ike na Jehova ji ya kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)


11. Olee otú Jizọs si gosi Meri Magdalin na Chineke hụrụ ya n’anya? (Kọwaakwa foto.)

11 Jizọs kpọrọ Meri Magdalin ka ọ bịa soro ya na ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-ekwusa ozi ọma.b O mere ka o nwee ike ịna-anụ ka Jizọs na-akụziri ndị ọzọ ihe. Jizọs pụtakwara n’ihu ya n’ụbọchị a kpọlitere ya n’ọnwụ. O so ná ndị mbụ Jizọs gwara okwu n’ụbọchị ahụ. Jizọs gwadịrị ya ka ọ gaa gwa ndịozi ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ. Jizọs ji ihe a niile o mere nyere Meri aka ịghọta na Jehova hụrụ ya n’anya.​—Jọn 20:11-18.

12. Gịnị mere Nwanna Nwaanyị Lidia ji chee na ya abaghị uru ọ bụla?

12 Otú ahụ ọ dị Meri Magdalin ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. Ha na-eche na e nweghị uru ha bara. E nwere otu nwanna nwaanyị si Spen. Aha ya bụ Lidia. O kwuru na mgbe mama ya dị ime ya, ọ chọrọ iwepụ ya. Lidia na-echeta otú mama ya si eleghara ya anya ma na-agwa ya okwu ọjọọ mgbe ọ ka dị ezigbo obere. Ọ sịrị: “Ihe m na-achọsi ike bụ ka ndị mmadụ nabata m ma hụ m n’anya. Ụjọ nọ na-atụ m na e nweghị onye ga-ahụli m n’anya ebe ọ bụ na mama m emeela ka m kweta na m bụ onye ọjọọ.”

13. Olee ihe nyeere Nwanna Nwaanyị Lidia aka ịghọta na Jehova hụrụ ya n’anya?

13 Mgbe Lidia batara n’ọgbakọ, ihe gbanwere. Ikpe ekpere, ịmụ Baịbụl, okwu ọma ụmụnna na-agwa ya, na omume ọma ha na-emeso ya mere ka ọ ghọta na Jehova hụrụ ya n’anya. Ọ sịrị: “Di m na-agwakarị m na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ọtụtụ mgbe, ọ na-echetara m àgwà ọma ndị m nwere. Ụmụnna ndị ọzọ na-emekwa otu ihe ahụ.” È nwere onye nọ n’ọgbakọ unu e kwesịrị inyere aka ịghọta na Jehova hụrụ ya n’anya?

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ELE ONWE ANYỊ ANYA OTÚ JEHOVA SI ELE ANYỊ

14. Olee otú 1 Samuel 16:7 si enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele ndị mmadụ anya? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Mere Jehova Ji Jiri Ndị Ya Kpọrọ Ihe?”)

14 Cheta na Jehova anaghị ele gị anya otú ụwa si ele gị. (Gụọ 1 Samuel 16:7.) Ihe ọtụtụ ndị nọ n’ụwa ji ekpebi ma mmadụ ọ̀ bara uru bụ otú onye ahụ dị, otú o nweruru ego, ma ọ bụ ebe ọ gụruru akwụkwọ. Ma, Jehova anaghị eme otú ahụ. (Aịza. 55:8, 9) N’ihi ya, gbalịa na-ele onwe gị anya otú Jehova si ele gị, ọ bụghị otú ụwa si ele gị. Na Baịbụl, i nwere ike ịgụ akụkọ gbasara ndị chere mgbe ụfọdụ na ha abaghị uru, dị ka Ịlaịja, Naomi, na Hana. Ị gụwa akụkọ ha, chee otú Jehova hụruru ha n’anya. I nwere ike idetu ihe ndị merela ná ndụ gị gosiri gị na Jehova hụrụ gị n’anya, jirikwa gị kpọrọ ihe. I nwekwara ike ịgụ isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ anyị ndị kwuru gbasara mmadụ iche na ya abaghị uru.c

Gịnị Mere Jehova Ji Jiri Ndị Ya Kpọrọ Ihe?

Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha dị ezigbo iche n’ụmụ anụmanụ. O kere anyị otú anyị ga-enwe ike ime ka anyị na ya dị ná mma ma bụrụ enyi. (Jen. 1:27; Ọma 8:5; 25:14; Aịza. 41:8) Ihe a bụ ezigbo ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị bara uru. Mana, obi kwesịdịrị isikwu anyị ike ma ọ bụrụ na anyị na-agbalị ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, anyị enyefee ya onwe anyị ma na-erubere ya isi. Ime ihe ndị a ga-eme ka Chineke bụ́ Onye kere anyị hụ anyị n’anya n’eziokwu.​—Aịza. 49:15.

15. Gịnị mere Jehova ji ‘hụ Daniel n’anya nke ukwuu’? (Daniel 9:23)

15 Na-echeta na ebe ọ bụ na ị na-erubere Jehova isi, o ji gị kpọrọ ihe. E nwere mgbe ‘ike gwụchara’ Daniel onye amụma, obi adaakwa ya mbà. O nwere ike ịbụ mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị (100) afọ. (Dan. 9:20, 21) Olee otú Jehova si gbaa ya ume? O ziteere ya mmụọ ozi Gebriel ka o chetara ya na ọ bụ “onye a hụrụ n’anya nke ukwuu” nakwa na Chineke anụla ekpere ya. (Gụọ Daniel 9:23.) Gịnị mere Chineke ji hụ Daniel n’anya nke ukwuu? Ọ bụ n’ihi na Daniel bụ onye ezi omume, na-erubekwara Chineke isi. (Ezik. 14:14) Jehova mere ka e dee akụkọ ahụ na Baịbụl iji kasie anyị obi. (Rom 15:4) Jehova na-anụkwa ekpere gị taa, jirikwa gị kpọrọ ihe n’ihi na ị na-eme ihe dị mma, na-erubekwara ya isi.​—Maị. 6:8; Hib. 6:10.

16. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịghọta na Jehova bụ Nna hụrụ gị n’anya?

16 Ghọta na Jehova bụ Nna hụrụ gị n’anya. Ọ chọrọ ịna-enyere gị aka, ọ bụghị ịhụchata ihe i mejọrọ. (Ọma 130:3; Mat. 7:11; Luk 12:6, 7) Ichebara ihe a echiche enyerela ọtụtụ ndị chere na ha abaghị uru aka. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị si Spen aha ya bụ Eliana. Di ya ji okwu ọjọọ na-asa ya ahụ́ ruo ọtụtụ afọ, ya emee ka obi na-ajọ ya njọ, meekwa ka ọ na-eche na ya abaghị uru. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla obi dị m otú ahụ, m na-agbalị ịna-ahụ onwe m ka Jehova ku m n’aka, na-elekọta m ma na-echebe m.” (Ọma 28:9) Otu nwanna nwaanyị si Saụt Afrịka aha ya bụ Lauren na-agwa onwe ya, sị: “Ebe ọ bụ na Jehova ji obiọma na ịhụnanya dọta m n’ebe ọ nọ, nyere m aka ịnọ ya nso, jirikwa m kụziere ndị ọzọ ihe, o doro anya na o weere m ka onye bara uru.”​—Hos. 11:4.

17. Gịnị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe gị dị Jehova mma? (Abụ Ọma 5:12) (Kọwaakwa foto.)

17 Ka obi sie gị ike na Jehova na-emere gị amara, ma ọ bụ na ihe gị dị ya mma. (Gụọ Abụ Ọma 5:12.) Devid ji amara Jehova tụnyere “ọta ukwu” na-echebe ndị ezi omume. Ịmata na ihe gị dị Jehova mma nakwa na ọ na-akwado gị ga-eme ka ị ghara ichewe na ị baghị uru. Olee otú i nwere ike isi mata na ihe gị dị Jehova mma? Dị ka anyị kwuru, Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl emesi gị obi ike na ihe gị dị ya mma. Ọ na-ejikwa ndị okenye, ezigbo ndị enyi gị, na ndị ọzọ echetara gị na ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ndị ọzọ gwa gị okwu ọma?

Ebe otu nwanna nwaanyị na-achị ọchị mgbe o si n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-apụta na-achọ ịga ozi ọma. Nwanna nwaanyị ya na ya so konyere ya aka n’olu.

Ịmata na ihe anyị dị Jehova mma nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị iche na anyị abaghị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)


18. Gịnị mere i ji kwesị ịnabata mma ndị ọzọ na-aja gị?

18 Ndị ma gị ma hụ gị n’anya si n’obi ha jaa gị mma, nabata ya. Na-echeta na o nwere ike ịbụ na Jehova ji ha na-enyere gị aka ịghọta na ihe gị dị ya mma. Nwanna Nwaanyị Eliana anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Eji m nwayọọ nwayọọ na-anabata okwu ọma ndị ọzọ na-agwa m. Ọ dịrịghị m mfe. Mana, ama m na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka m mee.” Ndị okenye ejirikwala obiọma nyere nwanna nwaanyị a aka ịmata na ihe ya dị Jehova mma. Ugbu a, ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile, nọrọkwa n’ụlọ ya na-arụ ọrụ Betel.

19. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?

19 Jizọs ji obiọma na-echetara anyị na Nna anyị nke eluigwe ji anyị kpọrọ ihe nke ukwuu. (Luk 12:24) N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ka anyị na-echeta ihe a mgbe niile. Ka anyị na-agbakwa mbọ ka ndị ọzọ mata na Jehova hụkwara ha n’anya nke ukwuu.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú Jizọs si nyere ndị mmadụ aka ịghọta na Jehova hụrụ ha n’anya?

  • Olee otú Jizọs si nyere nwaanyị oruru ọbara aka?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ele onwe anyị anya otú Jehova si ele anyị anya?

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b O doro anya na Meri Magdalin so n’ụmụ nwaaanyị ndị so Jizọs na-aga ebe dị iche iche. Ha ji ihe ha nwere na-elekọta ya na ndịozi ya.​—Mat. 27:55, 56; Luk 8:1-3.

c Dị ka ihe atụ, gụọ isi nke 24 n’akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso. Gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị a tụrụ aro ha na ihe ndị Baịbụl kọrọ n’okpuru isiokwu bụ́ “Inwe Obi Abụọ” n’akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya