Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Nọvemba p. 16-21
  • Jizọs Bụ Nnukwu Onye Nchụàjà Anyị Na-eme Ebere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Bụ Nnukwu Onye Nchụàjà Anyị Na-eme Ebere
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỌKPARA CHINEKE Ọ HỤRỤ N’ANYA BỊARA N’ỤWA
  • JIZỌS NA-ENWERE NDỊ MMADỤ ỌMỊIKO
  • OTÚ ANYỊ SI EME KA NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ ANYỊ TAA
  • NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ ANYỊ GA-ENYELIRI GỊ AKA
  • Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Ụbọchị Iri Anọ Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụwa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Nọvemba p. 16-21

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

Jizọs Bụ Nnukwu Onye Nchụàjà Anyị Na-eme Ebere

“N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-agaghị emetere anyị ebere.”​—HIB. 4:15 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere anyị ga-eji kwuo na Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà kacha mma nakwa ụzọ dị iche iche o si enyere anyị aka taa.

1-2. (a) Gịnị mere Jehova ji zite Ọkpara ya n’ụwa? (b) Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a? (Ndị Hibru 5:7-9)

IHE dị ka puku afọ abụọ (2,000) gara aga, Jehova zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya n’ụwa. N’ihi gịnị? Otu ihe mere o ji zite ya bụ ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ nakwa ka o wepụ nsogbu niile Ekwensu kpataara anyị. (Jọn 3:16; 1 Jọn 3:8) Jehova makwa na ndụ Jizọs ga-ebi n’ụwa ga-akwadebe ya ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà ga-emetere anyị ebere. Jizọs ghọrọ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị mgbe o mechara baptizim n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst.a

2 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu otú ndụ Jizọs biri n’ụwa si nyere ya aka ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà na-emetere anyị ebere. Ka anyị na-aghọtakwu otú Jizọs si bụrụ onye ‘zuru okè’ maka ọrụ a, ọ ga-adịrị anyị mfe ikpe ekpere ma na-abịaru Jehova nso, ọ bụrụgodị na mmehie anyị mere ka obi na-ajọ anyị njọ.​—Gụọ Ndị Hibru 5:7-9.

ỌKPARA CHINEKE Ọ HỤRỤ N’ANYA BỊARA N’ỤWA

3-4. Olee ihe ndị Jizọs hapụrụ n’eluigwe bịa n’ụwa? Oleekwa otú ihe dịịrị ya mgbe ọ nọ n’ụwa?

3 Ihe agbanweela ná ndụ ọtụtụ n’ime anyị. O nwere ike ịbụ na anyị si ebe anyị bibu maara anyị ahụ́ kwaga ebe ọzọ, hapụ ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị. Ụdị mgbanwe ahụ anaghị adị mfe. Mana, e nwebeghị mmadụ ihe gbanweere otú ọ gbanweere Jizọs. Ọ bụ mmụọ ozi mbụ nakwa mmụọ ozi kacha mkpa n’eluigwe. Jehova hụrụ ya n’anya. Obi na-adịkwa ya ezigbo ụtọ mgbe niile n’ihi na ọ nọ “n’aka nri” Nna ya na-arụ ọrụ. (Ọma 16:11; Ilu 8:30) N’agbanyeghị ya, Ndị Filipaị 2:7 sịrị na “ọ hapụrụ ihe niile ọ bụ” n’eluigwe bịa n’ụwa, ya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebiri.

4 Cheekwa gbasara afọ ndị mbụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. A mụrụ ya n’ezinụlọ dara ogbenye. Otú anyị si mara bụ na nne na nna ya ji naanị obere nnụnụ abụọ chụọ àjà mgbe a mụrụ ya. (Lev. 12:8; Luk 2:24) Mgbe Eze Herọd obi fere azụ nụrụ na a mụrụ Jizọs, ọ nwara igbu ya. Nne na nna Jizọs kpọ ya gbaga Ijipt ruo oge ụfọdụ ka a ghara igbu ya. (Mat. 2:13, 15) Ndụ Jizọs n’ụwa dị nnọọ ezigbo iche ná ndụ ọ dị n’eluigwe.

5. Gịnị ka Jizọs hụrụ mgbe ọ bịara n’ụwa? Oleekwa otú ndụ ọ dịrị n’ụwa si kwadebe ya ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà na-emetere anyị ebere? (Kọwaakwa foto.)

5 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ hụrụ ka ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ. Ọ ma otú ọ na-adị mmadụ ma onye ya nwụọ. O doro anya na e nwere ụfọdụ ndị Jizọs ma nwụrụnụ mgbe ọ nọ n’ụwa. O nwekwara ike ịbụ na Josef, bụ́ nna ya n’ụwa, sokwa na ha. Mgbe ọ na-eje ozi ya, ọ hụrụ ndị ekpenta, ndị ìsì, ndị ngwọrọ, nakwa ndị ụmụ ha nwụrụ. O metekwaara ha ebere. (Mat. 9:2, 6; 15:30; 20:34; Mak 1:40, 41; Luk 7:13) Ọ bụ eziokwu na mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ hụrụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata, ma mgbe ọ bụ mmadụ n’ụwa, ọ ghọtakwuru otú obi na-adị ndị na-ata ahụhụ. (Aịza. 53:4) Ihe ndị ọ hụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa nyeere ya aka ịghọta ahụhụ ndị mmadụ na-ata na otú obi na-adị ha ma ihe dị iche iche mee. E nwekwara oge ndị ezigbo ike gwụrụ ya, oge ndị o chegburu onwe ya, na oge ndị ihe wutere ya.

Ebe ìgwè mmadụ gbara Jizọs gburugburu na-arịọ ya ka ọ gwọọ ha ọrịa ha. O meteere otu nwoke mere agadi na-arịa ọrịa ebere ma jide ya aka.

Jizọs nweere ndị mmadụ ezigbo ọmịiko. Ahụhụ ha na-ata na-emetụkwa ya n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


JIZỌS NA-ENWERE NDỊ MMADỤ ỌMỊIKO

6. Gịnị ka anyị na-amụta n’amụma Aịzaya buru gbasara otú Jizọs ga-esi emetere ndị mmadụ ebere? (Aịzaya 42:3)

6 N’oge niile Jizọs jere ozi ya n’ụwa, o meteere ndị na-adịghị ike na ndị a na-emegbu emegbu ebere. O si otú ahụ mezuo amụma dị na Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru na-eji ndị gbasiri ike na ndị bara ọgaranya atụnyere ubi na-eme nke ọma ma ọ bụ osisi toro ogologo ma sie ike. (Ọma 92:12; Aịza. 61:3; Jere. 31:12) Ma, ọ na-eji ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha na ndị a na-emegbu emegbu atụnyere ahịhịa amị huuru ehuru na owu mpanaka na-achọ ịnyụ anyụ. (Gụọ Aịzaya 42:3; Mat. 12:20) Jehova mere ka Aịzaya onye amụma jiri ihe atụ ndị a buo amụma otú Jizọs ga-esi hụ ndị a na-emegbu emegbu n’anya ma na-emetere ha ebere.

7-8. Olee otú Jizọs si mezuo amụma Aịzaya?

7 Matiu gosiri na Jizọs mezuru amụma ahụ Aịzaya buru. Aịzaya sịrị: “Ọ gaghị agbaji ahịhịa amị huuru ehuru. Ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.” Ụfọdụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ baara ndị a na-emegbu emegbu na ndị chere na nke ha na-eme agwụla uru. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke ekpenta zuru ahụ́. O nwere ike ịbụ na o chere na e nweghị otú a ga-esi agwọ ya ma ọ bụ na ya na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya enweghị ike ịnọkọ ọzọ. (Luk 5:12, 13) E nwere nwoke ọzọ dara ogbi, ntị chikwara. Chegodị otú obi na-adị ya ma ọ hụ mgbe ndị ọzọ na-akparịta ụka, mana ọ naghị anụ ihe ha na-ekwu. (Mak 7:32, 33) A ka nwekwara nsogbu ọzọ.

8 N’oge Jizọs, ọtụtụ ndị Juu kwetara na onye ọ bụla na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye ọ bụla nwere nkwarụ na-ata ahụhụ n’ihi mmehie ya ma ọ bụ mmehie nne na nna ya. (Jọn 9:2) Ihe a na-abụghị eziokwu ha kweere mere ka a na-emegbu ndị dị otú ahụ, ya emee ka ha na-eche na o nweghị uru ha bara. Jizọs mezuru amụma Aịzaya. Ọ gwọrọ ha, nyekwara ha aka ịmata na Chineke hụrụ ha n’anya. Olee otú ihe a si eme ka obi sie anyị ike taa?

9. Olee otú Ndị Hibru 4:15, 16 si gosi na Nnukwu Onye Nchụàjà anyị na-emetere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere?

9 Gụọ Ndị Hibru 4:15, 16 na ihe e dere n’ala ala peeji ya. Obi ga-esi anyị ike na Jizọs ga na-emetere anyị ebere mgbe niile. Okwu Grik a sụgharịrị “imetere ebere” pụtara ịghọta otú ihe si ewute ndị ọzọ na otú ihe si egbu ha mgbu, ya emetụkwa gị n’ahụ́. Ọ dị mma ịmata na Pọl kwukwara otu okwu Grik ahụ ná Ndị Hibru 10:34 iji gosi na anyị na-emetara ndị nọ na mkpọrọ ebere. Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-egosi na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụ ya nnọọ n’obi. Ihe mere o ji gwọọ ndị mmadụ abụghị naanị na ọ bụ ihe o kwesịrị ime, kama ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi, ya achọọkwa inyere ha aka. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gwọrọ onye ekpenta ahụ, ọ gaara anọ ebe dị anya rụọ ọrụ ebube gwọọ ya. Mana, o bu ụzọ metụ ya aka. O nwere ike ịbụ na nke ahụ bụ nke mbụ mmadụ metụrụ nwoke ahụ aka kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe Jizọs chọkwara ịgwọ nwoke ahụ ntị chiri, o bu ụzọ kpọpụ ya n’ebe ahụ ndị mmadụ juru ma gwọọ ya. E nwekwara otu nwaanyị chegharịrị n’ihe ọjọọ ọ na-eme. Mgbe o ji anya mmiri ya saa ụkwụ Jizọs, jirikwa ntutu isi ya hichaa ya, obi adịghị otu onye Farisii mma maka ya. Ma, Jizọs gbachiteere nwaanyị ahụ. (Mat. 8:3; Mak 7:33; Luk 7:44) Anyị hụrụ na Jizọs agbaraghị ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị mere mmehie dị oké njọ ọsọ. Kama, ọ chọrọ ka ha bịakwute ya. O gosikwara ha na ọ hụrụ ha n’anya. Ka obi sie anyị ike na ọ ga-emetere anyị ebere otú ahụ.

OTÚ ANYỊ SI EME KA NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ ANYỊ TAA

10. Olee ihe ndị anyị ga-eji enyere ndị ntị chiri na ndị kpuru ìsì aka? (Kọwaakwa foto.)

10 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị na-agbalịsi ike ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-enwekwara ha ọmịiko ka Jizọs. (1 Pita 2:21; 3:8) Anyị agaghị arụli ọrụ ebube gwọọ ndị ntị chiri na ndị ìsì. Ma, anyị nwere ike inyere ha aka ka ha mụta gbasara Jehova ma bịarukwuo ya nso. Dị ka ihe atụ, e nwere akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu narị (100) asụsụ ndị ogbi. E nwekwara akwụkwọ anyị ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’ihe karịrị asụsụ iri isii, nakwa vidio ndị a na-akọwa ihe ndị a na-egosi na ha n’ihe karịrị otu narị (100) asụsụ. Ihe ndị a na-enyere ndị ogbi na ndị ìsì aka ka ha na Jehova na Jizọs dịrị ná mma.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe ụmụnna ji asụsụ ndị ogbi na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe. 2. Ebe otu nwanna nwaanyị kpuru ìsì na-agụ Baịbụl e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.

A na-ebipụta akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ

N’aka ekpe: Ihe karịrị otu narị (100) asụsụ ndị ogbi

N’aka nri: Ihe karịrị asụsụ iri isii ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Olee otú nzukọ Jehova si na-egosi na ha na-enwere ụdị mmadụ niile ọmịiko ka Jizọs? (Ọrụ Ndịozi 2:5-7, 33) (Kọwaakwa foto.)

11 Nzukọ Jehova na-agbasi mbọ ike inyere ụdị mmadụ niile aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Cheta na mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ ka onye ọ bụla bịara maka ememme Pentikọst nwee ike ịnụ ozi ọma “n’asụsụ nke ya.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:5-7, 33.) Taa, Jizọs na-eduzi nzukọ Jehova, ha ana-ebipụta akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ndị na-asụ ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ dị obere. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mmadụ ole na ole na-asụ ụfọdụ asụsụ a na-asụ na Kọntinent Saụt Amerịka na Nọt Amerịka. N’agbanyeghị ya, a na-ebipụta akwụkwọ anyị n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri isii (160) a na-asụ n’ebe ahụ ka mmadụ niile na-asụ asụsụ ndị ahụ nwee ohere ịnụ ozi ọma. A na-ebipụta akwụkwọ anyị n’ihe karịrị asụsụ ndị Roma iri abụọ. Ọtụtụ puku ndị na-asụ asụsụ ndị ahụ amalitela ife Jehova.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna nwaanyị na-asụ otu n’ime asụsụ ndị a na-asụ na Kọntinent Saụt Amerịka na Nọt Amerịka na-amụmụ ọnụ ọchị ka o ji Baịbụl e dere n’asụsụ ya. 2. Ebe otu nwanna nwaanyị na-asụ asụsụ Roma na nwa ya nwaanyị na-ege ntị n’ihe omume a na-eme.

N’aka ekpe: Ihe karịrị otu narị asụsụ na iri isii (160) a na-asụ na Kọntinent Saụt Amerịka na Nọt Amerịka

N’aka nri: Ihe karịrị asụsụ ndị Roma iri abụọ

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Olee ihe ndị ọzọ nzukọ Jehova na-emere ndị mmadụ taa?

12 E wezụga inyere ndị mmadụ aka ka ha nụ ozi ọma, nzukọ Jehova na-enyere ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara aka ọjọọ aka. Ọtụtụ puku ụmụnna anyị na-ewepụta onwe ha enyere ụmụnna ha ọdachi dakwasịrị aka. Nzukọ Jehova na-enyekwa aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe ndị mmadụ ga-anọ mụtakwuo otú Chineke si hụ ha n’anya.

NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ ANYỊ GA-ENYELIRI GỊ AKA

13. Olee ụzọ ndị Jizọs si enyere anyị aka?

13 Ebe Jizọs bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ anyị, ọ na-ahụ na anyị nwetara ihe niile ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma. (Jọn 10:14; Efe. 4:7) Mgbe ụfọdụ, otú ihe si dịrị anyị nwere ike ime ka anyị dị ka ahịhịa amị huuru ehuru ma ọ bụ owu mpanaka na-achọ ịnyụ anyụ. Obi nwekwara ike ịna-ajọ anyị njọ n’ihi ajọ ọrịa, ihe anyị mejọrọ, ma ọ bụ nghọtahie anyị na nwanna anyị nwere. O nwere ike isiri anyị ike ịhapụ ịna-eche gbasara nsogbu anyị nwere ugbu a ma lekwasị anya n’olileanya anyị nwere. Ma, cheta na Jizọs na-ahụ otú ihe si dịrị gị. Ọ ghọtakwara otú obi dị gị nke ọma. Ebe ọ bụ na ọ na-enwere gị ọmịiko, ọ chọrọ inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, o nwere ike iji mmụọ nsọ mee ka i nwee ike mgbe ike na-adịghị gị. (Jọn 16:7; Taị. 3:6) Ihe ọzọ bụ na Jizọs nwere ike iji ndị okenye na ụmụnna gị gbaa gị ume, kwado gị, nyekwara gị aka.​—Efe. 4:8.

14. Gịnị ka anyị ga-eme ma obi na-ajọ anyị njọ?

14 Ọ bụrụ na obi dara gị mbà, cheta na Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị. Cheekwa ihe ndị ọ ga-emere gị. Cheta na Jehova zitere ya ka ọ nwụọ maka anyị nakwa ka ọ ghọtakwuo nsogbu ndị ha na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-alụ. Ọ bụrụ na obi ana-ajọ anyị njọ maka mmehie anyị, Jizọs dị njikere inyere anyị aka “n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka,” ọ ga-enyekwara anyị aka.​—Hib. 4:15, 16.

15. Gịnị nyeere otu nwanna e kewapụrụ n’ọgbakọ aka ịlọghachite?

15 Jizọs na-eduzikwa ndị ya ná mbọ ha na-agba ịchọta atụrụ Jehova pụrụ n’ọgbakọ na inyere ha aka. (Mat. 18:12, 13) Ka anyị kwuo gbasara otu nwanna aha ya bụ Stefano.b Mgbe e kewapụrụ ya n’ọgbakọ, afọ iri na abụọ agaa, ọ gara ọmụmụ ihe. Ọ sịrị: “Ọ dịrịghị m mfe. Ma, m chọrọ iso ụmụnna m fewekwa Jehova. Ndị okenye mụ na ha nọkọrọ mere ka ahụ́ ruo m ala. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ewuteru m n’ọkpụkpụ na m pụrụ n’ọgbakọ, mụ achọọkwa ịkwụsị ịgba mbọ ịlọghachi. Mana, ndị okenye chetaara m na Jehova na Jizọs chọrọ ka m ghara ịkwụsị. Mgbe a nabatara m n’ọgbakọ, ọgbakọ niile ji obi ụtọ nabata mụ na ezinụlọ m. Nwunye m mechara mụwa Baịbụl. Mụ na ezinụlọ m na-efe Jehova ugbu a.” Obi na-adị Nnukwu Onye Nchụàjà anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka a na-enyere ndị mere mmehie chegharịrịnụ aka ka ha lọghachite n’ọgbakọ.

16. Gịnị mere obi ji dị anyị ụtọ na anyị nwere Nnukwu Onye Nchụàjà hụrụ anyị n’anya?

16 N’oge Jizọs dị ndụ n’ụwa, o nyeere ọtụtụ ndị aka n’oge ọ dị ha mkpa. Taa, obi sikwara anyị ezigbo ike na ọ ga-enyere anyị aka n’oge ọ bụla ọ dị anyị mkpa. N’ụwa ọhụrụ, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị nwere onwe anyị n’ihe niile mmehie na ezughị okè kpataara anyị. Anyị na-ekele Jehova Chineke anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya nke na o nyere anyị Ọkpara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà na-emetere anyị ebere.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú ndụ Jizọs biri n’ụwa si kwadebe ya ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà kacha mma?

  • Olee otú Jizọs si mezuo amụma e buru n’Aịzaya 42:3?

  • Olee otú Nnukwu Onye Nchụàjà anyị si enyere anyị aka taa?

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

a Ị chọọ ịmatakwu otú Jizọs si nọchie anya nnukwu onye nchụàjà ndị Juu, gụọ isiokwu bụ́ “Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 2023, peeji nke 26, paragraf nke 7 ruo na nke 9.

b Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya