Ahụ Ike Akawo Mma n’Ụwa Nile—Ma Ọ bụghị Nye Mmadụ Nile
DỊ KA The World Health Report 1998, bụ́ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) bipụtara si kwuo, e nwewo mgbanwe gaa n’inwekwu ahụ ike, na ndụ dịwanyere ogologo n’ụwa nile. Akụkọ ahụ depụtara ihe atụ ụfọdụ.
Ọtụtụ ndị nwere usoro mkpofu ihe, mmiri dị mma, na nlekọta ahụ ike bụ́ isi, karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọzọkwa, a na-agbazi ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụaka nọ n’ụwa ọgwụ mgbochi ọrịa isii bụ́ isi na-arịa ụmụaka.a Nke a atụnyewo ụtụ ná mbelata e nwere n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-anwụnụ. Ọ bụ ezie na nde ụmụaka 21 na-erubeghị afọ ise nwụrụ na 1955, ọnụ ọgụgụ ahụ adalataruwo ihe dị ka nde 10 na 1997. Ka ọ dịgodị, e nwewo mbelata dị egwu nke ndị ọrịa obi na-egbu n’ọtụtụ mba ndị mepere emepe.
Otú ọ dị, akụkọ ahụ na-ekwukwa na ọganihu e nwere n’ihe banyere ahụ ike abụwo nnọọ ihe na-ezughị ebe nile. HIV/AIDS ka bụ ihe dị oké ize ndụ. N’ịbụ nke a na-amaghị tupu afọ 1981, ọrịa AIDS egbuwo ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde mmadụ 11.7 kemgbe ntiwapụ ahụ malitere. Ọ dịghịkwa olileanya e nwere ịgwọta ya n’isi nso. Na 1996, ụmụaka 400,000 na-erubeghị afọ 15 butere nje HIV. Na 1997 ọnụ ọgụgụ ụmụaka ndị nọ n’otu afọ ndụ ahụ butere ya ọhụrụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 600,000.
Ịda Ogbenye Ka Dị Ize Ndụ Nye Ahụ Ike
O siworo ọtụtụ narị nde mmadụ dara ogbenye ike karịsịa inwe ọganihu n’ihe metụtara ahụ ike. Ha bi karịsịa ná mba ndị dara ogbenye bụ́ ebe ibu arọ nke ọrịa dị ukwuu, olileanya na-adịghị maka ọdịnihu, ebe ndụ dịkwa mkpụmkpụ. Dr. Hiroshi Nakajima, bụ́bu ọga kpata kpata nke òtù WHO, na-ekwu, sị: “Ọdịiche dị n’etiti ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ike nke ndị bara ọgaranya na nke ndị dara ogbenye ma ọ dịghị ihe ọzọ dị ukwuu otú ọ dị n’ọkara narị afọ gara aga.” Ọ dị mwute ikwu na ọbụna ọdịiche ndị a na-ebuwanye ibu, ka otu ọkachamara nke òtù WHO na-ekwu, n’ihi na “ụzọ ihe ọjọọ abụọ na-adakwasị mba ndị ka na-emepe emepe. Ọ bụghị nanị na ọrịa ndị na-adịghị ala ala na-apụta ọhụrụ na-eche ha ihu kamakwa ọrịa ndị ka fọdụrụnụ a na-arịa n’ebe okpomọkụ na-eche ha ihu.”
Ya bụrụgodị otú ahụ, ọganihu abụghị ihe a na-apụghị inwe. N’eziokwu, a pụrụ igbochi ugbu a ọtụtụ n’ime ọtụtụ nde mmadụ ịnwụchu ọnwụ. Dị ka ihe atụ, “ọ dịkarịa ala ọrịa ndị e nwere ọgwụ mgbochi ha na-egbu nde ụmụaka 2 n’otu afọ,” ka Dr. Nakajima na-ekwu. N’ịrụ ụka na ọdịiche ahụ dị n’etiti ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ike nke ndị bara ọgaranya na nke ndị dara ogbenye aghaghị ibelata, Dr. Nakajima na-ekwukwa, sị: “Ugbu a bụ oge ịmata na ahụ ike bụ okwu zuru ụwa ọnụ.” “Njikọ mba nile maka ahụ ike, nke dabeere n’ikpe ziri ezi ọha na eze, ịha nhata na n’ịdị n’otu,” dịsi ụwa mkpa ike.
Ọ bụ ezie na njikọ ndị a nwere ike ha agaghị ewere ọnọdụ n’isi nso, mba nke ọ bụla pụrụ ime ihe dị ukwuu ugbu a iji meziwanye ahụ ike ndị bi na ya, ka The World Health Report 1998 na-ekwu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’izi ndị ya ịzụlite “nkà ndị dị mkpa ná ndụ na ụzọ ndụ na-akwalite ahụ ike” nke na-egbochi ma ọ bụ na-ebelata ọrịa. Ụkpụrụ Iwu nke òtù WHO tinyere ya otú a: “Echiche dabeere n’ihe ọmụma na ọha na eze imekọ ihe ọnụ bụ ihe ndị kasị mkpa n’imeziwanye ahụ ike.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọrịa isii ndị a na-arịa ụmụaka bụ, arụbara, ọrịa poliomyelitis, ụkwara nta, ọrịa diphtheria, ụkwara tịkọ tịkọ, na ọrịa tetanus ụmụ ọhụrụ.