Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 10/8 p. 13
  • Ọdachi nke Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdachi nke Agha
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Mgbanwe Ndị Kasị Ukwuu’
    Teta!—1999
  • Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Agha Hà Bụ Ihe A Na-apụghị Izere Ezere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gịnị Bụ Ọdịnihu nke Agha?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 10/8 p. 13

Ọdachi nke Agha

N’ỤLỌ Ndebe Ihe Agha Oge Ochie nke Alaeze Ukwu Britain dị na London, England, otu klọọkụ pụrụ iche na otu ígwè electronic nke na-agụkọ akara ọnụ ọgụgụ, na-akpali mmasị ndị nleta. Klọọkụ a abụghị maka idebe oge. Nzube e ji rụọ ya bụ iji nyere ụmụ mmadụ aka ịghọta ịdị ukwuu nke otu ihe pụtakasịrị ìhè na narị afọ a—agha. Ka aka klọọkụ ahụ na-aga, ihe ngụkọ ahụ na-etinye ihe n’ọnụ ọgụgụ ya kwa sekọnd 3.31 ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ nke ọ bụla na-anọchite anya otu nwoke, nwanyị, ma ọ bụ nwatakịrị nwụworonụ n’ihi agha n’ime narị afọ nke 20.

Ihe ngụkọ ahụ malitere ọrụ na June 1989. Ngụkọ ahụ ga-akwụsị n’etiti abalị na December 31, 1999. Mgbe ahụ ọ ga-eru otu narị nde, bụ́ ọnụ ọgụgụ e leziri anya mee atụmatụ ya ịbụ ndị nwụrụ n’agha na 100 afọ gara aga.

Cheedị echiche—otu narị nde mmadụ! Nke ahụ karịrị ọnụ ọgụgụ ndị bi n’England okpukpu abụọ. Ma, ihe ndekọ ahụ ekpugheghị ihe ọ bụla banyere ihe ike mere ndị ahụ nwụrụ anwụ na ihe mgbu ha nwere. Ọ kọwaghịkwa ahụhụ nke ndị ndị ahụ nwụrụ anwụ hụrụ n’anya na-ata—nde kwuru nde ndị nne na nna, ụmụnne ndị nwanyị na ndị nwoke, ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei. Ihe ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị bụ nke a: Narị afọ nke anyị abụwo nke kasị nnọọ bibie ihe n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ; obi ọjọọ dị na ya enweghị atụ.

Akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20 na-egosikwa ókè ụmụ mmadụ bụruru ndị ọkachamara na nkà igbu mmadụ. N’akụkọ ihe mere eme nile, mkpụpụta nke ngwá agha ndị ọhụrụ gara nwayọọ nwayọọ ruo na narị afọ nke 20, bụ́ nke a nọworo na ya kpụpụta ngwá agha dị ukwuu na mberede. Mgbe agha ụwa nke mbụ malitere na 1914, usuu ndị agha Europe gụnyere ndị ikom ji ube ma nọkwasị n’elu ịnyịnya. Taa, site n’enyemaka nke ihe mgbaàmà e tinyere n’efere ụzarị ozi na nke usoro nduzi nke kọmputa na-achịkwa, mgbọ ogbunìgwè pụrụ igbu mmadụ n’akụkụ ọ bụla n’ụwa, gaa kpọmkwem n’ụzọ dị ịtụnanya n’ebe a gbagara ya. N’afọ ndị gafeworonụ, a kpụpụtawo ma meziwanye égbè, ụgbọ agha, ụgbọ agha okpuru mmiri, ụgbọelu e ji eje agha, ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na ndị e ji mmiri ọgwụ mee nakwa “bọmbụ.”

N’adịghị ka ihe a tụrụ anya ya, ihe a kpọrọ mmadụ enwewo nkà dị ukwuu n’ịlụ agha nke na agha bụzi asọmpi nke ihe a kpọrọ mmadụ na-enweghịzi ike ikere òkè na ya. Dị ka akụkọ ifo Frankenstein, nke a kọrọ banyere ajọ anụ buru oké ibu nke riri onye kpụrụ ya, agha na-eyi egwu ibibi ndị nyere ya ikike dị ukwuu dị otú ahụ. À pụrụ ịchịkwa ajọ anụ a buru oké ibu ma ọ bụ kpochapụ ya? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ a.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 13]

Foto U.S. National Archives

Foto U.S. Coast Guard

Site n’ikike nke Imperial War Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya