Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwwd isiokwu 3
  • Aka Octopus Dị Ịtụnanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Aka Octopus Dị Ịtụnanya
  • È Kere Ya Eke?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tụkwasị Obi n’Ógwè Aka Nzọpụta nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ọchịchọ A Na-achọwanye Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara
    Teta!—2000
È Kere Ya Eke?
ijwwd isiokwu 3

È KERE YA EKE?

Aka Octopus Dị Ịtụnanya

Ndị njinia na-emepụta robọt na-agbalị imepụta robọt ga-enyekwuru ndị dọkịta aka ịwa mmadụ ahụ́ n’emepeghị ebe buru ibu n’ahụ́ onye ahụ. Otu ihe ha lekwasịrị anya na-achọ imepụta ngwá ọrụ a bụ aka Octopus nke na-emegharị ka ihe na-enweghị ọkpụkpụ.

Ihe ị ga-echebara echiche: Octopus nwere ike iji aka ya dị asatọ nke o nwere ike ịgbatị agbatị dọrọ ihe, jide ya ma jikpaa ihe ahụ ma n’ebe kpagidere akpagide. Ihe Octopus na-eme abụghị naanị ịhịgharị aka ya gaa n’ebe ọ bụla ọ chọrọ, o nwekwara ike ime ka akụkụ ọ bụla n’aka ya sie ike otú ọ bụla ọ chọrọ.

Ndị na-eme nnyocha kwuru na imepụta robọt aka ya na-ahịgharị ka nke Octopus ga-enyere ndị dọkịta ezigbo aka ịwa mmadụ ahụ́ n’emepeghị ebe buru ibu n’ahụ́ onye ahụ. Ụdị ngwá ọrụ a ga-eme ka ọ dị mfe ịwa ahụ́ ndị gaara esi ezigbo ike ma e si n’ụzọ ndị ọzọ waa ya.

Ihe a bụ otú aka Octopus si emegharị

E mepụtala rọbọt nwere ike imegharị aka ya ka nke Octopus. A na-ejikwa ya awa ahụ́. Otu n’ime aka rọbọt ndị ahụ dị inch ise nwere ike iwelite akụkụ ahụ́ ndị na-esichaghị ike n’akpataraghị akụkụ ahụ́ ndị ahụ nsogbu ọ bụla mgbe aka ya nke ọzọ na-awa ahụ́. Dr. Tommaso Ranzani, onye so ná ndị mepụtara robọt ahụ kwuru, sị: “O doro anyị anya na nke a bụ mmalite. Anyị na-atụ anya na rọbot ndị ọhụrụ a ka ga-emepụta ga-enwe ihe ọhụrụ ndị na-adịghị na nke mbụ a ga-eme ka ọ na-arụ ọrụ nke ọma karị.”

Aka octopus na aka rọbot

Aka octopus nke na-emegharị emegharị ka ihe na-enweghị ọkpụkpụ

Gịnị ka i chere? Aka Octopus ọ̀ nọkatara dịrị ka è kere ya eke?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya