Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwwd isiokwu 2
  • Ụda Dọlfin Na-emepụta O Ji Na-achọta Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụda Dọlfin Na-emepụta O Ji Na-achọta Ihe
  • È Kere Ya Eke?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?
    Teta!—2003
È Kere Ya Eke?
ijwwd isiokwu 2

È KERE YA EKE?

Ụda Dọlfin Na-emepụta O Ji Na-achọta Ihe

Azụ̀ dọlfin na-emepụta ụda dị iche iche ná mmiri ma na-ege ntị iji mata ebe ndị ọ ga-aga nakwa ihe ndị nọ gburugburu ya. N’ihi ya, ndị sayensị na-elere anya n’ihe a azụ̀ dọlfin imi ogologo (Tursiops truncatus) na-eme, na-arụ ngwá ọrụ ha ga-edowe n’ime mmiri iji dozie nsogbu ndị nyịrị nkà na ụzụ e nwere ugbu a.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ụda a dọlfin na-emepụta na-enyere ya aka ịhụ azụ̀ ndị zoro n’ájá dị n’ala mmiri. Ọ hụ azụ̀ ya amata na ọ bụ azụ̀, ọ hụkwanụ okwute ya amata na ọ bụ okwute. Otu nwoke aha ya bụ Keith Brown, nke na-akụzi ihe na Heriot-Watt University, dị n’Edinbọg, Skọtland, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e tinye ezigbo mmiri, mmiri nnu, mmiri a pịpụtara ná mkpụrụ osisi nakwa mmanụ ụgbọala n’ololo dị iche iche, tinye ha n’ime osimiri, azụ̀ a nwere ike ịnọ n’ebe dịtụ anya chọpụta nke bụ́ nke.” Ndị sayensị ga-achọ imepụta ihe ndị na-eme ụdị ihe ndị ahụ.

Ebe dọlfin ji ụda ọ na-emepụta na-achọpụta ihe dị n’ololo

Azụ̀ dọlfin nwere ike ịnọ n’ebe dịtụ anya chọpụta ihe dị n’ololo dị iche iche

Ndị na-eme nchọpụta nyochara otú dọlfin si emepụta ụda na otú o si anụ ebe ụda ahụ gara ma gbalịa iji ya mepụta ngwá ọrụ ga na-eme ụdị ihe ndị ahụ. Ha mepụtara ihe ndị e ji anụ ụda n’ime mmiri nke nwere ọtụtụ ngwá ọrụ elektrọniks bụ́ ọkpọka ma tinye ya n’ime cylinder na-erughị otu mita. A na-ewerezi ya tinye na robọt ndị a na-etinye n’ime mmiri. Ihe mere e ji rụọ ụdị ngwá ọrụ a bụ iji ha mata ihe ndị dị n’ala ala mmiri, waya ma ọ bụ paịpụ mmanụ e liri n’ala ma chọpụta otú ha dị n’ebughị ụzọ ruo n’ebe ha dị. Ndị na-emepụta ngwá ọrụ a tụrụ anya na ọ ga-abara ụlọ ọrụ ndị na-amịpụta mmanụ uru. Ngwá ọrụ a e leere azụ̀ dọlfin anya mepụta ga-enyere ndị ọkachamara aka ka ha nwee ike ịmatakwu ihe dị iche iche dị na mmiri karịa otú nke ha nwere ugbu a na-eme, nyekwara ha aka ịrụnye ngwá ọrụ ndị ha chọrọ itinye ná mmiri n’ebe ha kwesịrị ịdị. Ọ ga-enyekwara ha aka ịchọpụta nke nwere nsogbu, dị ka mgbe paịpụ mmanụ e liri na mmiri gbawara, nakwa mgbe ihe sụchiri paịpụ ndị ahụ.

Gịnị ka i chere? Ụda dọlfin imi ogologo na-emepụta o ji na-achọta ihe, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka, è kere ya eke?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya