NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?
Gịnị mere i kwesịrị iji na-ahazi oge gị ahazi?
Oge dị ka ego. Ọ bụrụ na i jiri ya mee ihe ndị na-abaghị uru, ị gaghịzi enwe nke ị ga-eji mee ihe ndị bara uru. Ma, ị hazie oge gị nke ọma, ị ga-enwe oge ị ga-eji kporie ndụ.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ọtụtụ ihe na-agụ onye umengwụ agụụ, ma e nweghị ihe ọ bụla o nwere. Ma afọ ga-eju onye na-arụsi ọrụ ike.”—Ilu 13:4.
Ihe ị ga-eburu n’obi: Ịhazi oge gị ahazi ga-eme ka i jiri oge gị na-eme ọtụtụ ihe, kama iji ya na-eme ihe ole na ole.
Ịmụta ịna-ahazi oge ahazi ga-abara gị uru ma i too. Otú i si ahazi oge gị nwedịrị ike ime ka a chụọ gị n’ọrụ ma ọ bụ mee ka a ghara ịchụ gị n’ọrụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na i nwere onye na-arụrụ gị ọrụ, ị̀ ga-ahapụ ya ka ọ nọgide na-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na ọ na-abịakarị ọrụ n’azụ oge?
Ihe Baịbụl kwuru: “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe.”—Luk 16:10.
Ihe ị ga-eburu n’obi: E nwere ike iji otú i si ahazi oge gị mata ụdị mmadụ ị bụ.
N’eziokwu, ịhazi oge ahazi anaghị adị mfe. Lee ihe ụfọdụ mere na ọ naghị adị mfe.
Nke 1: Ndị enyi
“Ndị enyi m gwa m ka anyị pụọ, m na-ekweta ọtụtụ mgbe soro ha pụọ ọ bụrụgodị na e nwechaghị m ohere. M na-agwa onwe m, sị, ‘M lọta, ọ gaghị ewe oge mụ emechaa ihe ndị m hapụrụ gawa.’ Ma, ọ naghị adị otú ahụ m si eche ya ọtụtụ mgbe. Ihe a emebiekwalara m ọtụtụ ihe.”—Cynthia.
Nke 2: Ihe ndị nwere ike ime ka uche mmadụ pụọ n’ihe ọ chọrọ ime
“Tiivi dị ka magnetọ e ji adọta ígwè. Otú ahụ magnetọ si adọta ígwè ka fim na ihe ndị ọzọ a na-egosi na tiivi si adọta mmadụ, ọ naghịkwa adị mfe ịhapụ ile ha.”—Ivy.
“M na-eji ọtụtụ awa apị ekwentị m. M pịgide ya batrị ya agwụ, obi m na-ebido mawa m ikpe.”—Marie.
Nke 3: Ịna-eyigharị ihe
“Oge m kwesịrị ime ihe omume e nyere m n’ụlọ akwụkwọ na oge m kwesịrị ime ihe ọ bụla ọzọ dị mkpa ruo, m na-eyigharị ime ha oge ọzọ. M na-eji oge m na-eme ihe ndị na-abaghị uru ruo mgbe ọ fọziiri m naanị obere oge iji mee ihe omume ahụ. Ihe a abụghị otú ka mma mmadụ isi na-ahazi oge ya.”—Beth.
Ịhazi oge gị ahazi ga-eme ka i jiri oge gị na-eme ọtụtụ ihe, kama iji ya na-eme ihe ole na ole
Ihe i nwere ike ime
Depụta ihe ndị dịịrị gị ime. Ihe ụfọdụ i nwere ike ide bụ ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ n’ụlọ na ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ. Dee oge imecha nke ọ bụla n’ime ha ga-ewe gị n’otu izu.
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.
Depụta ihe ndị ị na-enwe mmasị ime mgbe i nwere ohere. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ịga n’ebe ndị a na-ezirịta ozi n’Ịntanet na ile tiivi. Deekwa oge i ji eme nke ọ bụla n’ihe ndị a n’izu.
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”—Ndị Kọlọsi 4:5.
Hazie ihe ndị ị chọrọ ime n’usoro. Leruo ihe niile ahụ i depụtara ị na-eji oge gị eme anya. Ì wepụtaara ihe ndị dị mkpa oge buru ibu? Ì kwesịrị isi n’oge ị na-eji eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa wepụtakwuo oge?
Aro: Depụta ihe ndị ị chọrọ ime n’ụbọchị ọ bụla, nke ọ bụla i mechara gị akanye ya ihe na i mechaala ya.
Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”—Ilu 21:5.
Na-eme ihe ndị dịịrị gị otú i si hazie ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọọ ịna-eme ihe ndị dị mkpa, i nwere ike ị gaghị na-ekweta ịga ọtụtụ ihe a kpọrọ gị ka ị bịa. Ma, ị ga-achọpụta na ịhazi ihe ndị ị chọrọ ime ahazi ga-eme ka i nwekwuo oge fọọrọ gị ime ihe ndị ọzọ. Obi ga-erukwa gị ala karịa ma i jiri oge ahụ na-eme ihe ị chọrọ iji ya eme.
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-arụsinụ ọrụ ike. Unu adịla umengwụ.”—Ndị Rom 12:11.
Na-ekpori ndụ ma i mechaa ihe dịịrị gị ime, ọ bụghị mgbe ị na-emechabeghị ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tara sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m mechaa ihe abụọ n’ime ihe ndị m depụtara ime n’ụbọchị, m na-agwa onwe m na m nwere ike ịga jiri nkeji iri na ise letụ tiivi ma laghachikwa mechaa ihe ndị fọrọnụ. Ma, m na-esizi ná nkeji iri na ise lere tiivi ruo otu awa, ma lerekwa na-aga. Tupu mụ amata ihe na-eme, m jirila awa abụọ lee tiivi.”
Ihe ị ga-eme ka ihe a ghara ime gị? Na-ele mkpori ndụ anya ka ihe i ji eme onwe gị obi ụtọ ma i mechaa ihe ndị dịịrị gị ime. Elela ya anya ka ihe dịịrị gị ime n’ụbọchị.
Ihe Baịbụl kwuru: “E nweghị ihe dị mma karịa mmadụ . . . ikpori ndụ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike.”—Ekliziastis 2:24.