Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 82
  • Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere i kwesịrị iji na-ahazi oge gị ahazi?
  • Ihe i nwere ike ime
  • Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Olee Otú M Ga-esi Hazie Oge M?
    Teta!—2009
  • E Nye M Ọrụ, Olee Otú M Ga-esi Rụwa Ya Ozugbo Kama Ịna-asị Mgbe E Mechara?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Oge Iji Mee Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ E Nyere M Ime n’Ụlọ?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 82
Ebe obi na-ajọ otu nwata nwoke njọ n’ihi otú o si hazie oge ya​—O bu ụzọ gaa gbaa bọl ma lee tiivi tupu mewa ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?

  • Gịnị mere i kwesịrị iji na-ahazi oge gị ahazi?

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere i kwesịrị iji na-ahazi oge gị ahazi?

  • Oge dị ka ego. Ọ bụrụ na i jiri ya mee ihe ndị na-abaghị uru, ị gaghịzi enwe nke ị ga-eji mee ihe ndị bara uru. Ma, ị hazie oge gị nke ọma, ị ga-enwe oge ị ga-eji kporie ndụ.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Ọtụtụ ihe na-agụ onye umengwụ agụụ, ma e nweghị ihe ọ bụla o nwere. Ma afọ ga-eju onye na-arụsi ọrụ ike.”​—Ilu 13:4.

    Ihe ị ga-eburu n’obi: Ịhazi oge gị ahazi ga-eme ka i jiri oge gị na-eme ọtụtụ ihe, kama iji ya na-eme ihe ole na ole.

  • Ịmụta ịna-ahazi oge ahazi ga-abara gị uru ma i too. Otú i si ahazi oge gị nwedịrị ike ime ka a chụọ gị n’ọrụ ma ọ bụ mee ka a ghara ịchụ gị n’ọrụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na i nwere onye na-arụrụ gị ọrụ, ị̀ ga-ahapụ ya ka ọ nọgide na-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na ọ na-abịakarị ọrụ n’azụ oge?

    Ihe Baịbụl kwuru: “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe.”​—Luk 16:10.

    Ihe ị ga-eburu n’obi: E nwere ike iji otú i si ahazi oge gị mata ụdị mmadụ ị bụ.

N’eziokwu, ịhazi oge ahazi anaghị adị mfe. Lee ihe ụfọdụ mere na ọ naghị adị mfe.

Nke 1: Ndị enyi

“Ndị enyi m gwa m ka anyị pụọ, m na-ekweta ọtụtụ mgbe soro ha pụọ ọ bụrụgodị na e nwechaghị m ohere. M na-agwa onwe m, sị, ‘M lọta, ọ gaghị ewe oge mụ emechaa ihe ndị m hapụrụ gawa.’ Ma, ọ naghị adị otú ahụ m si eche ya ọtụtụ mgbe. Ihe a emebiekwalara m ọtụtụ ihe.”​—Cynthia.

Nke 2: Ihe ndị nwere ike ime ka uche mmadụ pụọ n’ihe ọ chọrọ ime

“Tiivi dị ka magnetọ e ji adọta ígwè. Otú ahụ magnetọ si adọta ígwè ka fim na ihe ndị ọzọ a na-egosi na tiivi si adọta mmadụ, ọ naghịkwa adị mfe ịhapụ ile ha.”​—Ivy.

“M na-eji ọtụtụ awa apị ekwentị m. M pịgide ya batrị ya agwụ, obi m na-ebido mawa m ikpe.”​—Marie.

Nke 3: Ịna-eyigharị ihe

“Oge m kwesịrị ime ihe omume e nyere m n’ụlọ akwụkwọ na oge m kwesịrị ime ihe ọ bụla ọzọ dị mkpa ruo, m na-eyigharị ime ha oge ọzọ. M na-eji oge m na-eme ihe ndị na-abaghị uru ruo mgbe ọ fọziiri m naanị obere oge iji mee ihe omume ahụ. Ihe a abụghị otú ka mma mmadụ isi na-ahazi oge ya.”​—Beth.

Ebe obi dị otu nwata nwoke ụtọ n’ihi otú o si hazie oge ya​—O bu ụzọ gụọ akwụkwọ, gazie mee ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ, nweekwa oge o ji gaa gbaa bọl

Ịhazi oge gị ahazi ga-eme ka i jiri oge gị na-eme ọtụtụ ihe, kama iji ya na-eme ihe ole na ole

Ihe i nwere ike ime

  1. Depụta ihe ndị dịịrị gị ime. Ihe ụfọdụ i nwere ike ide bụ ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ n’ụlọ na ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ. Dee oge imecha nke ọ bụla n’ime ha ga-ewe gị n’otu izu.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Ndị Filipaị 1:10.

  2. Depụta ihe ndị ị na-enwe mmasị ime mgbe i nwere ohere. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ịga n’ebe ndị a na-ezirịta ozi n’Ịntanet na ile tiivi. Deekwa oge i ji eme nke ọ bụla n’ihe ndị a n’izu.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Kọlọsi 4:5.

  3. Hazie ihe ndị ị chọrọ ime n’usoro. Leruo ihe niile ahụ i depụtara ị na-eji oge gị eme anya. Ì wepụtaara ihe ndị dị mkpa oge buru ibu? Ì kwesịrị isi n’oge ị na-eji eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa wepụtakwuo oge?

    Aro: Depụta ihe ndị ị chọrọ ime n’ụbọchị ọ bụla, nke ọ bụla i mechara gị akanye ya ihe na i mechaala ya.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”​—Ilu 21:5.

  4. Na-eme ihe ndị dịịrị gị otú i si hazie ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọọ ịna-eme ihe ndị dị mkpa, i nwere ike ị gaghị na-ekweta ịga ọtụtụ ihe a kpọrọ gị ka ị bịa. Ma, ị ga-achọpụta na ịhazi ihe ndị ị chọrọ ime ahazi ga-eme ka i nwekwuo oge fọọrọ gị ime ihe ndị ọzọ. Obi ga-erukwa gị ala karịa ma i jiri oge ahụ na-eme ihe ị chọrọ iji ya eme.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-arụsinụ ọrụ ike. Unu adịla umengwụ.”​—Ndị Rom 12:11.

  5. Na-ekpori ndụ ma i mechaa ihe dịịrị gị ime, ọ bụghị mgbe ị na-emechabeghị ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tara sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m mechaa ihe abụọ n’ime ihe ndị m depụtara ime n’ụbọchị, m na-agwa onwe m na m nwere ike ịga jiri nkeji iri na ise letụ tiivi ma laghachikwa mechaa ihe ndị fọrọnụ. Ma, m na-esizi ná nkeji iri na ise lere tiivi ruo otu awa, ma lerekwa na-aga. Tupu mụ amata ihe na-eme, m jirila awa abụọ lee tiivi.”

    Ihe ị ga-eme ka ihe a ghara ime gị? Na-ele mkpori ndụ anya ka ihe i ji eme onwe gị obi ụtọ ma i mechaa ihe ndị dịịrị gị ime. Elela ya anya ka ihe dịịrị gị ime n’ụbọchị.

    Ihe Baịbụl kwuru: “E nweghị ihe dị mma karịa mmadụ . . . ikpori ndụ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike.”​—Ekliziastis 2:24.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Cheyenne

“M na-edepụta ihe ndị m chọrọ ime n’usoro ka m nwee ike na-ahụ ihe niile dịịrị m ime. M na-edepụtakwa oge m ga-eji ezu ike n’ihi na izu ike na-enyere m aka inwetaghachi ume. Ịhazi ihe ndị m chọrọ ime ahazi na-enyere m aka ịma ihe ndị m ga-elegide anya mepụ na ndị m nwere ike na-eme nwayọọ nwayọọ.”​—Cheyenne.

Samuel

“Amụtala m ịsị mba mgbe ọ bụla mmadụ gwara m mee ihe na-agaghị adabara m ime. Ọ naghị adịcha mfe ikwu na ị gaghị eme ihe ahụ, ma ndị mmadụ anaghị ewere m iwe ma m kọwaara ha na ihe mere na agaghị m eme ihe ha gwara m bụ na uche m niile agaghị adị na ya.”​—Samuel.

Brooklyn

“E nwee oge ihe ndị m dere ime karịrị akarị, ihi ụra na imega ahụ́ na-abụrụ m ọgụ na mgba. Ma ọtụtụ mgbe, m wepụta oge hie ụra ma ọ bụ megaa ahụ́, m na-enwekwu ike ime ọtụtụ ihe ma chi bọọ, obi na-adịkwa m ụtọ karịa. Ilebara ahụ́ ike gị anya dị mkpa.”​—Brooklyn.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya