NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Kpasuo M Iwe?
Ihe i kwesịrị ịma
E nweghị ndị enyi na-anaghị akpasu ibe ha iwe. Ebe ọ bụ na enyi ọma gị, ma ọ bụ onye i weere ka ezigbo enyi gị, ezughị okè, o nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-akpasu gị iwe. Gịnwa ezughịkwa okè. N’eziokwu, ọ̀ bụ na e nwetụbeghị mgbe ị kpasuru onye ọzọ iwe?—Jems 3:2.
Ịntanet nwere ike ime ka ọ dịkwuo mfe ịkpasu gị iwe. Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa na-eto eto aha ya bụ David kwuru, sị: “Ị gaa n’Ịntanet hụ foto enyi gị sere mgbe ọ gara oriri, i nwere ike na-eche ihe mere na a kpọghị gị ka i soro gaa oriri ahụ. Ihe a nwere ike ime ka iwe wewe gị, gị echewekwa na o mere gị ihe ọjọọ.”
Ị ga-amụtali ihe i kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee.
Ihe i nwere ike ime
Chebara onwe gị echiche. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka iwe na-ewe gị ọsọ ọsọ, n’ihi na ọ bụ ndị nzuzu na-ewe iwe ọsọ ọsọ.”—Ekliziastis 7:9.
“Mgbe ụfọdụ, i nwere ike imecha chọpụta na ihe na-ewe gị iwe abụchaghị oké ihe.”—Alyssa.
Ihe ị ga-echebara echiche: Obere ihe ọ̀ na-ewe gị iwe? Ebe ọ bụ na ndị ọzọ ezughị okè, ị̀ ga-amụtakwu ịna-eleghara ihe ha na-eme anya?—Ekliziastis 7:21, 22.
Chebara uru ịgbaghara ndị ọzọ bara echiche. Baịbụl kwuru, sị: ‘A ga-aja mmadụ mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.’—Ilu 19:11.
“Ọ bụrụgodị na mmadụ mejọrọ gị, ọ dị mma ka ị gbaghara ya kpamkpam. Ọ pụtara na ị gaghịzi na-echetara onye ahụ ihe o mere ma ọ bụ na-achọ ka ọ rịọ gị mgbaghara mgbe ọ bụla i kwuru ihe o mere gị. Ị gbaghara ya, ekwukwala gbasara ya ọzọ.”—Mallory.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ihe a o mere m, ọ̀ dị njọ nke otú ahụ? Ị̀ ga-agbaghara ya ka unu nwee ike dịwakwa ná mma?—Ndị Kọlọsi 3:13.
Enyi na enyi ịna-akpa isiokwu mgbe ọ bụla ha nwetụrụ nghọtahie dị ka ebe mmadụ na-emepegharị ọnụ ụzọ n’oge ifufe na-efesi ike, ifufe ana-ebubata ahịhịa na uzuzu n’ime ụlọ a zachara nke ọma
Chee gbasara enyi gị. Baịbụl kwuru, sị: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”—Ndị Filipaị 2:4.
“Ọ bụrụ na gị na enyi gị hụrụ ibe unu n’anya ma na-akwanyere ibe unu ùgwù, ọ ga-eme ka unu kpezie ngwa ngwa maka na unu ji ibe unu kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na unu agbaala mbọ bụrụ ezigbo enyi, obere ihe ekwesịghị ime ka unu tisaa.”—Nicole.
Ihe ị ga-echebara echiche: È nwetụrụ ihe dị mma ị ga-ahụ n’otú enyi gị si ele ihe anya?—Ndị Filipaị 2:3.
Ihe ị ga-eburu n’obi: Ịmụta ihe i kwesịrị ime mgbe ọ bụla a kpasuru gị iwe bụ nkà ga-abara gị ezigbo uru ma i too. Gbaa mbọ ka ị mụta nkà a ugbu a.