Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 75
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Kpasuo M Iwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Kpasuo M Iwe?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe i kwesịrị ịma
  • Ihe i nwere ike ime
  • Gịnị Mere Enyi M Ji Kpasuo M Iwe?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • N’ihi Gịnị Ka Enyi M Ji Mejọọ M?
    Teta!—2000
  • Gịnị Ka Ịgbaghara Mmadụ Pụtara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Emekwala Ka “Ndị A Dị Nta” Sụọ Ngọngọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 75
Ebe otu nwa agbọghọ na-agwa nwa agbọghọ ibe ya okwu ọjọọ

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Kpasuo M Iwe?

  • Ihe i kwesịrị ịma

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ihe i kwesịrị ịma

  • E nweghị ndị enyi na-anaghị akpasu ibe ha iwe. Ebe ọ bụ na enyi ọma gị, ma ọ bụ onye i weere ka ezigbo enyi gị, ezughị okè, o nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-akpasu gị iwe. Gịnwa ezughịkwa okè. N’eziokwu, ọ̀ bụ na e nwetụbeghị mgbe ị kpasuru onye ọzọ iwe?​—Jems 3:2.

  • Ịntanet nwere ike ime ka ọ dịkwuo mfe ịkpasu gị iwe. Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa na-eto eto aha ya bụ David kwuru, sị: “Ị gaa n’Ịntanet hụ foto enyi gị sere mgbe ọ gara oriri, i nwere ike na-eche ihe mere na a kpọghị gị ka i soro gaa oriri ahụ. Ihe a nwere ike ime ka iwe wewe gị, gị echewekwa na o mere gị ihe ọjọọ.”

  • Ị ga-amụtali ihe i kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee.

Ihe i nwere ike ime

Chebara onwe gị echiche. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka iwe na-ewe gị ọsọ ọsọ, n’ihi na ọ bụ ndị nzuzu na-ewe iwe ọsọ ọsọ.”​—Ekliziastis 7:9.

“Mgbe ụfọdụ, i nwere ike imecha chọpụta na ihe na-ewe gị iwe abụchaghị oké ihe.”​—Alyssa.

Ihe ị ga-echebara echiche: Obere ihe ọ̀ na-ewe gị iwe? Ebe ọ bụ na ndị ọzọ ezughị okè, ị̀ ga-amụtakwu ịna-eleghara ihe ha na-eme anya?​—Ekliziastis 7:21, 22.

Chebara uru ịgbaghara ndị ọzọ bara echiche. Baịbụl kwuru, sị: ‘A ga-aja mmadụ mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.’​—Ilu 19:11.

“Ọ bụrụgodị na mmadụ mejọrọ gị, ọ dị mma ka ị gbaghara ya kpamkpam. Ọ pụtara na ị gaghịzi na-echetara onye ahụ ihe o mere ma ọ bụ na-achọ ka ọ rịọ gị mgbaghara mgbe ọ bụla i kwuru ihe o mere gị. Ị gbaghara ya, ekwukwala gbasara ya ọzọ.”​—Mallory.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ihe a o mere m, ọ̀ dị njọ nke otú ahụ? Ị̀ ga-agbaghara ya ka unu nwee ike dịwakwa ná mma?​—Ndị Kọlọsi 3:13.

Imepe ọnụ ụzọ ka ifufe na-ebubata ahịhịa na uzuzu n’ime ụlọ

Enyi na enyi ịna-akpa isiokwu mgbe ọ bụla ha nwetụrụ nghọtahie dị ka ebe mmadụ na-emepegharị ọnụ ụzọ n’oge ifufe na-efesi ike, ifufe ana-ebubata ahịhịa na uzuzu n’ime ụlọ a zachara nke ọma

Chee gbasara enyi gị. Baịbụl kwuru, sị: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”​—Ndị Filipaị 2:4.

“Ọ bụrụ na gị na enyi gị hụrụ ibe unu n’anya ma na-akwanyere ibe unu ùgwù, ọ ga-eme ka unu kpezie ngwa ngwa maka na unu ji ibe unu kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na unu agbaala mbọ bụrụ ezigbo enyi, obere ihe ekwesịghị ime ka unu tisaa.”​—Nicole.

Ihe ị ga-echebara echiche: È nwetụrụ ihe dị mma ị ga-ahụ n’otú enyi gị si ele ihe anya?​—Ndị Filipaị 2:3.

Ihe ị ga-eburu n’obi: Ịmụta ihe i kwesịrị ime mgbe ọ bụla a kpasuru gị iwe bụ nkà ga-abara gị ezigbo uru ma i too. Gbaa mbọ ka ị mụta nkà a ugbu a.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Kiana

“Ọ bụghị ihe niile na-adịghị mma e mere m ka m ga-achọ ka a kpawara isiokwu. Ọ bụrụ na m ga-edili ya, m ga-ahapụ ya ka nke ahụ gaa. Ime otú a na-eme ka udo dị kama ịkpawara obere ihe e mere m isiokwu.”​—Kiana.

Treigh

“Mgbe ọ bụla e mejọrọ m, m na-ajụ onwe m, sị, ‘Ihe a ọ̀ dị oké njọ nke na ọ ga-eme ka mụ na enyi m kwụsị ịdị ná mma? Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe m na-aza na nke ọ bụla bụ mba.”​—Treigh.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya