Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 131
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ntecha na Iyi Ọla?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ntecha na Iyi Ọla?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Baịbụl ekwughị na mmadụ ịchọ mma dị njọ
  • Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ite ntecha na iyi ọla
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ò Kwesịrị Ka Ụmụ Nwanyị Na-ezo Mma ha?
    Teta!—2005
  • Nọgidesie Ike n’Okwukwe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Uwe na Ejiji Gị—Ọ̀ Gbasara Chineke?
    Teta!—1998
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 131
Otu nwaanyị yi ihe olu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ntecha na Iyi Ọla?

Ihe Baịbụl kwuru

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara ite ntecha, iyi ọla, ma ọ bụ iji ihe ndị ọzọ achọ mma, ma o kwughị na ime ihe ndị a dị njọ. Baịbụl kwuru na ihe Chineke ji kpọrọ ihe abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́, kama ọ bụ ‘mbọ onye ahụ na-agba ka ọ bụrụ onye obi ruru ala na onye dị nwayọọ.’​—1 Pita 3:3, 4.

Baịbụl ekwughị na mmadụ ịchọ mma dị njọ

  • Ụmụ nwaanyị fere Jehova n’oge ochie chọrọ onwe ha mma. Ribeka, onye Aịzik nwa Ebreham lụrụ, na-agba ọla imi e ji ọlaedo mee, ọla aka e ji ọlaedo mee, nakwa ọla ndị ọzọ dị oké ọnụ nna di ya nyere ya. (Jenesis 24:22, 30, 53) Esta natakwara “ihe ọ ga-eji na-achọ mma” mgbe a na-ele ma ọ̀ ga-abụ nwunye eze na-achị Alaeze Ukwu Peshia. (Esta 2:7, 9, 12) Ọ ga-abụ na ụdị ihe dị iche iche a na-ete n’ihu nakwa n’anya so n’ihe ndị ahụ ọ natara.

  • E ji ọla mee ihe atụ ndị dị mma na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e ji onye na-enye ezigbo ndụmọdụ tụnyere “ọla ntị e ji ọlaedo rụọ.” (Ilu 25:12) Chineke jikwa otú o si meso ndị Izrel ihe tụnyere di ji ọla aka, ihe olu, na ọla ntị chọọ nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ mma. Otú a o si chọọ ha mma mere ka ha “bụrụ asampete.”​—Ezikiel 16:11-​13.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ite ntecha na iyi ọla

Ụgha: Na 1 Pita 3:3, Baịbụl akwadoghị “ịkpa isi na iyi ihe ndị e ji ọlaedo mee.”

Eziokwu: Ihe e kwuru n’amaokwu ndị ọzọ dị na 1 Pita isi 3 gosiri na ihe Baịbụl na-ekwu ebe ahụ bụ na mmadụ ịchọ obi ya mma bara uru karịa ịchọ mma elu ahụ́. (1 Pita 3:3-6) E kwukwara ihe yiri ihe a n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl.​—1 Samuel 16:7; Ilu 11:22; 31:30; 1 Timoti 2:9, 10.

Ụgha: Ite ntecha dị njọ ebe ọ bụ na Jezibel obi tara mmiri, bụ́ nwunye eze, tere “uri anya.”​—2 Ndị Eze 9:30.

Eziokwu: Ihe mere e ji gbuo Jezibel bụ maka na ọ gbara afa, gbuokwa ndị mmadụ, ọ bụghị maka na ọ na-ete ntecha.​—2 Ndị Eze 9:7, 22, 36, 37.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya