Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya?
Ọ bụ ihe Baịbụl kwuru mere anyị ji ele olili ozu anya otú anyị si ele ya, ọ bụkwa ya mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme n’oge a na-eli ozu. Lee ụfọdụ n’ime ha:
Mmadụ iru uju ma onye nke ya nwụọ adịghị njọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ruru uju mgbe ndị nke ha nwụnahụrụ ha. (Jọn 11:33-35, 38; Ọrụ Ndịozi 8:2; 9:39) Ọ bụ ya mere na anyị anaghị ewere oge olili ozu ka oge oriri na nkwari. (Ekliziastis 3:1, 4; 7:1-4) Kama, anyị na-ewere ya ka oge e kwesịrị ịkasi ndị na-eru uju obi.—Ndị Rom 12:15.
Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. N’agbanyeghị agbụrụ anyị si ma ọ bụ omenala a na-eme n’obodo anyị, anyị anaghị eme omenala ma ọ bụ ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akwadoghị ndị mmadụ na-eme maka na ha kweere na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ nakwa na ha nwere ike inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ mesie ha ike. (Ekliziastis 9:5, 6, 10) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ịmụrụ onye nwụrụ anwụ anya abalị, imere onye nwụrụ anwụ nnukwute ememme olili ozu ma ọ bụ ememme ịkwa ozu, ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase, ịrịọ ha arịrịọ, nakwa ịgba mkpe. Anyị anaghị etinye aka n’omenala niile ahụ n’ihi na anyị na-erube isi n’iwu dị na Baịbụl nke bụ́: “Nọrọkwanụ iche. Unu emetụzila ihe na-adịghị ọcha aka.”—2 Ndị Kọrịnt 6:17.
Olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ. Baịbụl na-akụziri anyị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na oge na-abịa mgbe ọnwụ na-agaghịzi adị. (Ọrụ Ndịozi 24:15; Mkpughe 21:4) Olileanya a nyeere Ndị Kraịst oge ochie aka, ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịna-eru uju ka ndị na-enweghị olileanya.—1 Ndị Tesalonaịka 4:13.
Baịbụl gwara anyị ka anyị na-emeru ihe n’ókè. (Ilu 11:2) Oge olili ozu abụghị oge ‘mmadụ kwesịrị igosi’ na ọ bụ aka ji akụ̀ ma ọ bụ onye a ma ama. (1 Jọn 2:16) Anyị anaghị akwadebe olili ozu ga-efu nnukwu ego iji mee ndị mmadụ obi ụtọ ma ọ bụkwanụ zụọ igbe ozu na uwe dara oké ọnụ ka ndị mmadụ jawa anyị ike.
Anyị anaghị amanye ndị ọzọ ka ha kweta ihe anyị kweere gbasara olili ozu. N’ihe gbasara olili ozu, anyị na-esoro ihe a Baịbụl kwuru: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:12) Ma, ọ bụrụ na mmadụ enye anyị ohere, anyị ‘na-emeda obi’ kọwaara ya ihe anyị kweere, anyị ‘na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù mgbe anyị na-akọwa ya.’—1 Pita 3:15.
Onyeàmà Jehova nwụọ, olee otú Ndịàmà Jehova si eli ya?
Ebe a ga-anọ: Ọ bụrụ na ezinụlọ mmadụ nwụnahụrụ ekpebie na a ga-ekwuru onye nwụnahụrụ ha okwu olili ozu, ọ bụ hanwa ga-ekwu ebe a ga-anọ ekwu ya. O nwere ike ịbụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ n’akụkụ ebe a ga-eli ya.
Ihe a na-eme: A na-ekwu okwu si na Baịbụl iji kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. A na-akọwakwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ nakwa olileanya e nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 11:25; Ndị Rom 5:12; 2 Pita 3:13) N’okwu ahụ, a ga-ekwu àgwà ọma ụfọdụ e ji mara onye ahụ nwụrụ anwụ. E nwekwara ike ikwu ihe ọma ndị ọzọ nwere ike ịmụta n’otú o si rubere Jehova isi.—2 Samuel 1:17-27.
E nwere ike ịbụ abụ si na Baịbụl. (Ndị Kọlọsi 3:16) A ga-ekpe ekpere na-akasi obi, jiri ya pịachie ihe omume ahụ.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ịkwụ ụgwọ ma ọ bụ ịna ụtụ: Anyị anaghị ana ndị mmadụ ego ma e kwuoro ha okwu si na Baịbụl ma ọ bụ ma e kwuoro ha okwu olili ozu, anyị anaghịkwa asị ndị mmadụ tụọ ụtụ n’ọmụmụ ihe anyị.—Matiu 10:8.
Ndị ga-abịa: Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gere okwu olili ozu. Onye ọ bula nwere ike ịbịa nnọkọ a otú ahụ onye ọ bụla nwekwara ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ.
Ndịàmà Jehova hà na-aga olili ozu ndị okpukpe ndị ọzọ haziri?
Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebiere onwe ya ma ọ̀ ga-aga ma ọ̀ bụ na ọ gaghị aga. (1 Timoti 1:19) Ma, anyị anaghị eso okpukpe ndị ọzọ eme ihe ndị anyị ma na Baịbụl akwadoghị.—2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.