Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 108
  • Gịnị Bụ Amụma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Amụma?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee Otú Chineke Si Duzie Odide Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ozi Jehova Maka Oge Gara Aga Nakwa Ugbu A
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Ònye Chepụtara Baịbụl?
    Teta!—2008
  • Ịmata Onye Bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 108
Jọn Onye Na-eme Baptizim

Gịnị Bụ Amụma?

Ihe Baịbụl kwuru

Amụma bụ ozi si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ya bụ, ihe Chineke mere ka a mata. Baịbụl kwuru na “mmụọ nsọ nọ na-edu ndị [amụma], ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.” (2 Pita 1:20, 21) N’ihi ya, onye amụma bụ onye Chineke na-ezi ozi, ya agazie zie ya ndị ọzọ.​—Ọrụ Ndịozi 3:18.

Olee otú Chineke si zie ndị amụma ozi?

Chineke si n’ụzọ dị iche iche mee ka ndị amụma mara uche ya:

  • Ihe e dere ede. Ọ dịkarịa ala, e nwere otu mgbe Chineke si otú a zie otu onye amụma ozi, ya bụ, mgbe o ji aka ya nye Mosis Iwu Iri e dere ede.​—Ọpụpụ 31:18.

  • Iji ndị mmụọ ozi ezi ozi. Dị ka ihe atụ, Chineke zigara mmụọ ozi ya ka ọ gaa gwa Mosis ihe ọ ga-agwa Fero Ijipt. (Ọpụpụ 3:2-4, 10) Mgbe ọ bụla Chineke na-achọghị ka onye amụma jiri okwu nke ya kọwaa ihe ọ chọrọ ka ọ gwa ndị ọzọ, ọ na-agwa ya kpọmkwem ihe ọ ga-ekwu. Ọ bụ ihe o mere mgbe ọ gwara Mosis, sị: “Ị ga-ede okwu ndị a ede, n’ihi na mụ na gị na ndị Izrel ga-agbakwasị ụkwụ n’ihe ndị a m kwuru gbaa ndụ.”​—Ọpụpụ 34:27.a

  • Ọhụụ. Mgbe ụfọdụ, a na-eme ka onye amụma hụ ọhụụ mgbe ọ mụ anya. (Aịzaya 1:1; Habakọk 1:1) Ụfọdụ ndị amụma sodị mee ihe ha nọ na-ahụ n’ọhụụ maka na ha hụrụ ihe ndị ahụ mgbe ha mụ anya. (Luk 9:28-​36; Mkpughe 1:10-​17) N’oge ndị ọzọ, e mere ka ndị amụma hụ ọhụụ mgbe ha na-amụchaghị anya. (Ọrụ Ndịozi 10:10, 11; 22:17-​21)b Chineke sikwa ná nrọ zie ndị amụma ya ozi mgbe ha na-ehi ụra.​—Daniel 7:1; Ọrụ 16:9, 10.

  • Iduzi echiche ha. Chineke duziri echiche ndị amụma ya ka ha nwee ike izi ndị mmadụ ozi o ziri ha. Ọ bụ ihe a ka Baịbụl na-ekwu mgbe ọ sịrị: “Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” Okwu bụ́ “si n’ike mmụọ nsọ Chineke” nwekwara ike ịpụta “Chineke kunyere ume.” (2 Timoti 3:16) Chineke ji mmụọ nsọ ya ma ọ bụ ike ya ‘kunye’ ihe o bu n’obi n’uche ndị ohu ya. Ihe ndị amụma buru n’amụma bụ ozi Chineke, ma ha ji okwu nke aka ha buo ya.​—2 Samuel 23:1, 2.

Ọ̀ bụ mgbe niile ka ibu amụma pụtara ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu?

Mba. Amụma ndị dị na Baịbụl abụghị naanị gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọtụtụ n’ime ha bụ gbasara ọdịnihu, nakwa otú ihe ga-adịrị ndị mmadụ n’ihi ihe ha kpebiri ime. Dị ka ihe atụ, ndị amụma Chineke dọrọ ndị Izrel oge ochie aka ná ntị ugboro ugboro gbasara àgwà ọjọọ ha na-akpa. Ha gwara ha ngọzi ndị ga-abịara ha n’ọdịnihu ma ha rube isi, gwakwa ha ahụhụ ha ga-ata ma ha nupụ isi. (Jeremaya 25:4-6) Ọ bụ ihe ha họọrọ ime ga-ekpebi otú ihe ga-adịrị ha.​—Diuterọnọmi 30:19, 20.

Amụma Baịbụl ndị na-ekwughị gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu

  • O nwere mgbe ndị Izrel rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka, ya ezie otu onye amụma ka ọ gaa gwa ha na ihe mere na ya anaghịzi enyere ha aka bụ maka na ha jụrụ irubere ya isi.​—Ndị Ikpe 6:6-​10.

  • Mgbe Jizọs gwara nwaanyị Sameria okwu, ọ gwara ya otú o si bie ndụ n’oge gara aga. Ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ka Jizọs mara ihe a ọ gwara ya. Nwaanyị a kwuru na Jizọs bụ onye amụma n’agbanyeghị na Jizọs agwaghị ya ihe ọ bụla gbasara ọdịnihu.​—Jọn 4:17-​19.

  • Mgbe ndị iro Jizọs na-ekpe ya ikpe, ha kpuchiri ya ihu, na-eti ya ihe ma sị ya: “Buo amụma, gwa anyị onye tiri gị ihe?” Ihe ha na-agwa ya abụghị ka o kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Kama, ha na-agwa ya ka o jiri ike Chineke mata onye tiri ya ihe.​—Luk 22:63, 64.

a Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ọ̀ bụ Chineke ji ọnụ ya gwa Mosis okwu n’amaokwu a, ma Baịbụl gosiri na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka Chineke si n’aka ha nye Mosis Iwu Iri ahụ.​—Ọrụ Ndịozi 7:53; Ndị Galeshia 3:19.

b Otú e si dee amaokwu ndị a n’asụsụ Grik e ji dee Baịbụl gosiri na ndị a Chineke ziri ozi amụchaghị anya mgbe o ziri ha ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya