Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 50
  • Ì Kwesịrị Ikwe Nkwa na Ị Gaghị Enwe Mmekọahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Kwesịrị Ikwe Nkwa na Ị Gaghị Enwe Mmekọahụ?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ mmadụ ikwe nkwa na ya agaghị enwe mmekọahụ?
  • Nkwa a ọ̀ na-eme ka ndị na-eto eto ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye?
  • Ihe ka mma ị ga-eme
  • Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?
    Teta!—2004
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 50
Ebe ndị na-eto eto isii gba mgbaaka n’otu mkpịsị aka aka ekpe ha

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ì Kwesịrị Ikwe Nkwa na Ị Gaghị Enwe Mmekọahụ?

  • Gịnị bụ mmadụ ikwe nkwa na ya agaghị enwe mmekọahụ?

  • Nkwa a ọ̀ na-eme ka ndị na-eto eto ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ nwunye?

  • Ihe ka mma ị ga-eme

Gịnị bụ mmadụ ikwe nkwa na ya agaghị enwe mmekọahụ?

N’obodo ụfọdụ, ndị na-eto eto na-edejupụta akwụkwọ ma ọ bụ jiri ọnụ ha kwee nkwa na ha agaghị enwe mmekọahụ ruo mgbe ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye.

Ọtụtụ ndị matara banyere ihe a n’afọ 1990, mgbe Southern Baptist Convention dị n’Amerịka malitere ihe omume ha kpọrọ “True Love Waits,” ya bụ, “Ezigbo Ịhụnanya Na-enwe Ndidi.” N’ihe omume ahụ, ha na-agwa ndị na-eto eto ka ha na-eme ihe dị mma, jirikwa ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru na-agba ha ume ka ha ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.

Ka obere oge gara, a malitere ihe omume ọzọ yiri nke mbụ ahụ. Ma na nke a, a na-enye ndị kwere nkwa ahụ mgbaaka ọlaọcha iji gosi na ha ekweela nkwa ahụ nakwa ka ọ na-echetara ha na ha agaghị enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.

Nkwa a ọ̀ na-eme ka ndị na-eto eto ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye?

Ihe ndị mmadụ na-aza dị iche iche.

  • Christine C. Kim na Robert Rector kwuru na ‘ọtụtụ nchọpụta e mere gosiri na nkwa a ndị na-eto eto na-ekwe na-eme ka ha ghara ịmalite na nwata nwewe mmekọahụ ma ọ bụ ka ha na-enwe ya naanị mgbe ụfọdụ.’

  • Nchọpụta ndị Guttmacher Institute mere gosiri na ndị na-eto eto kwere nkwa a nwere ike inwewe mmekọahụ otú ahụ ndị nke na-ekweghị ya na-eme.

Gịnị mere nchọpụta ndị e mere ji ekwu ihe dị iche iche?

  • N’ụfọdụ nchọnchọ ndị e mere, ndị e ji mee ha bụ ndị kwere nkwa a na ndị nke na-ekweghị nkwa a, ma ha niile na-ele inwe mmekọahụ anya otú dị iche iche.

  • Ná nchọpụta ndị ọzọ, ọ bụ ndị kwere nkwa ahụ na ndị na-ekweghị ka e ji mee ya, ma ha kweere otu ihe banyere inwe mmekọahụ.

Olee ihe nchọpụta ndị e ji ndị kweere otu ihe mee na-egosi? Dr. Janet Rosenbaum, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike ndị na-eto eto, kwuru na afọ ise ndị na-eto eto ji kwe nkwa a gachaa, anaghịzi enwe ihe dị iche ná ndị kwere nkwa ahụ na ndị nke na-ekweghị.

Ihe ka mma ị ga-eme

Ndị malitere ihe gbasara ikwe nkwa enweghị mmekọahụ nwere ezigbo ihe ha bu n’obi. Ma, nsogbu dị na ya bụ na ha anaghị akụziri ndị na-eto eto ihe ndị ga-enyere ha aka imezu nkwa ahụ. Dr. Rosenbaum kwuru na ọtụtụ n’ime ndị na-ekwe nkwa a ejighị obi ha niile eme ya. Ọ sịrị na ọ bụ onye ọ bụla n’otu n’otu ga-eji aka ya kpebie na ọ gaghị enwe mmekọahụ tupu ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye ọ bụghị ide ya n’akwụkwọ.

Baịbụl gbakwara anyị ume iji aka anyị kpebie na anyị agaghị enwe mmekọahụ. Ma ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ime ya abụghị ịgwa ha ka ha dejupụta akwụkwọ ma ọ bụ jiri ọnụ kwee nkwa, kama ọ bụ inyere ha aka ‘ịzụ ikike nghọta ha azụ,’ ka ha nwee ike ịmata ihe dị iche n’ihe dị́ mma na ihe na-adịghị mma. (Ndị Hibru 5:​14) A sị ka e kwuwe, ịjụ inwe mmekọahụ tupu mmadụ alụọ di ma ọ bụ nwunye abụghị naanị ka onye ahụ zere ibute ọrịa na afọ ime, kama ọ bụkwa otu n’ime ụzọ onye ahụ si akwanyere Chineke, bụ́ onye malitere alụmdi na nwunye, ùgwù.​—Matiu 5:​19; 19:​4-6.

Iwu ndị dị na Baịbụl na-abara anyị uru. (Aịzaya 48:17) N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ikpebisi ike ịna-erube isi n’iwu Chineke nyere ka anyị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:​18) Mgbe onye ahụ lụziri di ma ọ bụ nwunye, obi ga-eru ya ala, ọ gaghịkwa na-echegbu onwe ya ma ọ bụ na-akwa mmakwaara otú ahụ ndị nwere mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-eme.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya