Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu?
Ihe Baịbụl kwuru
Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere “otu nwaanyị” bụ́ “oké nwaanyị akwụna,” onye aha ya “dị omimi.” Aha ya ahụ bụ “Babịlọn Ukwu.” (Mkpughe 17:1, 3, 5) Nwaanyị a nọchiri anya okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, bụ́ ndị “ji eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.”a (Ndị Rom 1:25) N’agbanyeghị na e nwere otú okpukpe ndị ahụ si dị iche n’ibe ha, e nweghị nke na-enyere ndị mmadụ aka ife ezi Chineke, bụ́ Jehova.—Diuterọnọmi 4:35.
Ihe ụfọdụ ị ga-eji amata ihe Babịlọn Ukwu pụtara
Babịlọn Ukwu nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Ihe dị n’akwụkwọ Mkpughe bụ “ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha.” N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na Babịlọn Ukwu abụghị nwaanyị nkịtị, kama o nwere ihe ọ nọchiri anya ya. (Mkpughe 1:1) Ihe ọzọ bụ na ọ “nọ ọdụ n’elu mmiri na-asọ ike ike,” nke nọchiri anya “agbụrụ dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.” (Mkpughe 17:1, 15) Nwaanyị nkịtị agaghị emeli ihe a.
Babịlọn Ukwu nọchiri anya ihe zuru ụwa ọnụ. A kpọrọ nwaanyị a “obodo ukwu ahụ nke na-achị ndị eze na-achị ụwa.” (Mkpughe 17:18) N’ihi ya, o zuru ụwa ọnụ. E nweghịkwa ebe ike ya na-erughị.
Babịlọn Ukwu bụ òtù okpukpe, ọ bụghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ òtù azụmahịa. Na Babịlọn oge ochie, ndị mmadụ na-ekpe okpukpe dị iche iche. Ihe e ji mara obodo ahụ bụ ‘ịgwọ ọgwụ’ na ‘ịgba afa.’ (Aịzaya 47:1, 12, 13; Jeremaya 50:1, 2, 38) Ndị obodo ahụ na-ekpe okpukpe ụgha, bụ́ ihe ezi Chineke bụ́ Jehova kpọrọ asị. (Jenesis 10:8, 9; 11:2-4, 8) Ndị ọchịchị Babịlọn dị mpako. Ha bulikwara onwe ha elu karịa Jehova na ofufe ya. (Aịzaya 14:4, 13, 14; Daniel 5:2-4, 23) Ihe e jikwa mara Babịlọn Ukwu bụ ‘mgbaasị ọ na-eme.’ Ihe a gosiri na ọ bụ òtù okpukpe.—Mkpughe 18:23.
E nweghị otú Babịlọn Ukwu ga-esi abụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na “ndị eze ụwa” ga-ebere ya ákwá mgbe a ga-ebibi ya. (Mkpughe 17:1, 2; 18:9) Ọ bụghịkwa òtù azụmahịa n’ihi na Baịbụl gosiri na ọ dị iche ná “ndị ahịa ụwa.”—Mkpughe 18:11, 15.
Ihe ndị e kwuru gbasara Babịlọn Ukwu na-egosi na ọ nọchiri anya okpukpe ụgha. Okpukpe ụgha anaghị akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi bịaruo ezi Chineke bụ́ Jehova nso, kama ọ na-eme ka ha fewe chi ọzọ. Baịbụl kwuru na ọ bụ ‘ịkpa àgwà ka ndị akwụna gaa fewe chi’ ọzọ. (Levitikọs 20:6; Ọpụpụ 34:15, 16) Ọtụtụ okpukpe ụgha ka na-akụzi ozizi ndị malitere na Babịlọn oge ochie, dị ka, ozizi atọ n’ime otu, ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, nakwa iji ihe a kpụrụ akpụ efe ofufe. Okpukpe ndị a na-akwadokwa mmadụ ịhụ ụwa n’anya. Baịbụl kpọrọ ha ndị na-akwa iko n’ihi otú ha na ụwa si emekọ ihe.—Jems 4:4.
Akụnụba okpukpe ụgha nwere na otú ha si eme okomoko dabara n’ihe Baịbụl kwuru banyere Babịlọn Ukwu, bụ́ onye “yi ákwà na-acha pọpụl na ákwà na-acha uhie uhie,” jirikwa “ọlaedo na nkume dị oké ọnụ na nkume pel chọọ onwe ya mma.” (Mkpughe 17:4) Ọ bụ na Babịlọn Ukwu ka “ihe ndị rụrụ arụ dị n’ụwa,” ya bụ, ozizi na omume ndị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịna-asọpụrụ Chineke si. (Mkpughe 17:5) Ọ bụ ndị nọ n’okpukpe ụgha bụ “agbụrụ dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” ndị na-akwado Babịlọn Ukwu.—Mkpughe 17:15.
Foto a natara ndị British Museum ikike see
Ebe a kpụrụ Eze Babịlọn bụ́ Nabonaịdọs na ihe nọchiri anya chi atọ n’ime otu bụ́ Sin, Ishta, na Shamash
Aka Babịlọn Ukwu dị n’ọnwụ “ndị niile e gburu n’ụwa.” (Mkpughe 18:24) Kemgbe ụwa, okpukpe ụgha na-akpata agha na mpụ juru ebe niile. Ha anaghịkwa akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:8) Ihe a ataala isi ọtụtụ ndị.
Olee otú Chineke si ele Babịlọn Ukwu anya?
N’anya Chineke, ‘mmehie Babịlọn Ukwu karịrị akarị.’ (Mkpughe 18:4, 5) Chineke na-ewesa okpukpe ụgha iwe maka na ha anaghị agwa ndị mmadụ eziokwu banyere ya nakwa maka na ha na-emesi ndị òtù ha ike.
Gịnị ga-eme Babịlọn Ukwu?
Baịbụl kwuru na ‘Chineke amaala Babịlọn Ukwu ikpe.’ (Mkpughe 18:20) Baịbụl ji ihe atụ dị iche iche kwuo na Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:8) Chineke ga-eme ka otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie, nke nọchiri anya otu ọchịchị siri ike, kpọọ okpukpe asị, bibiekwa ya kpamkpam. (Mkpughe 17:16, 17) “Otú a ka a ga-esi atụda obodo ukwu a bụ́ Babịlọn ngwa ngwa. A gaghịzi ahụ ya ọzọ.” (Mkpughe 18:21) N’ihi ya, ndị chọrọ ime ihe dị Chineke mma ga-esirịrị “ebe ha nọ pụọ,” ya bụ, si n’okpukpe ụgha pụta.—2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.
a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?”