Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 94
  • Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee otú Chineke si ele Babịlọn Ukwu anya?
  • Gịnị ga-eme Babịlọn Ukwu?
  • Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Ga-eme Okpukpe Dị Iche Iche?—Ihe Baịbụl Kwuru
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 94
Ebe e sere nwaanyị akwụna yi ákwà na-acha pọpụl na uhie uhie ma na-amakụ otu eze. Nwaanyị ahụ nọchiri anya Babịlọn Ukwu. Onye ụkọchukwu na-ekpunye eze ahụ okpueze n’azụ ha.

Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu?

Ihe Baịbụl kwuru

Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere “otu nwaanyị” bụ́ “oké nwaanyị akwụna,” onye aha ya “dị omimi.” Aha ya ahụ bụ “Babịlọn Ukwu.” (Mkpughe 17:1, 3, 5) Nwaanyị a nọchiri anya okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, bụ́ ndị “ji eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.”a (Ndị Rom 1:25) N’agbanyeghị na e nwere otú okpukpe ndị ahụ si dị iche n’ibe ha, e nweghị nke na-enyere ndị mmadụ aka ife ezi Chineke, bụ́ Jehova.​—Diuterọnọmi 4:35.

Ihe ụfọdụ ị ga-eji amata ihe Babịlọn Ukwu pụtara

  1. Babịlọn Ukwu nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Ihe dị n’akwụkwọ Mkpughe bụ “ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha.” N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na Babịlọn Ukwu abụghị nwaanyị nkịtị, kama o nwere ihe ọ nọchiri anya ya. (Mkpughe 1:1) Ihe ọzọ bụ na ọ “nọ ọdụ n’elu mmiri na-asọ ike ike,” nke nọchiri anya “agbụrụ dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.” (Mkpughe 17:1, 15) Nwaanyị nkịtị agaghị emeli ihe a.

  2. Babịlọn Ukwu nọchiri anya ihe zuru ụwa ọnụ. A kpọrọ nwaanyị a “obodo ukwu ahụ nke na-achị ndị eze na-achị ụwa.” (Mkpughe 17:18) N’ihi ya, o zuru ụwa ọnụ. E nweghịkwa ebe ike ya na-erughị.

  3. Babịlọn Ukwu bụ òtù okpukpe, ọ bụghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ òtù azụmahịa. Na Babịlọn oge ochie, ndị mmadụ na-ekpe okpukpe dị iche iche. Ihe e ji mara obodo ahụ bụ ‘ịgwọ ọgwụ’ na ‘ịgba afa.’ (Aịzaya 47:1, 12, 13; Jeremaya 50:1, 2, 38) Ndị obodo ahụ na-ekpe okpukpe ụgha, bụ́ ihe ezi Chineke bụ́ Jehova kpọrọ asị. (Jenesis 10:8, 9; 11:2-4, 8) Ndị ọchịchị Babịlọn dị mpako. Ha bulikwara onwe ha elu karịa Jehova na ofufe ya. (Aịzaya 14:4, 13, 14; Daniel 5:2-4, 23) Ihe e jikwa mara Babịlọn Ukwu bụ ‘mgbaasị ọ na-eme.’ Ihe a gosiri na ọ bụ òtù okpukpe.​—Mkpughe 18:23.

    E nweghị otú Babịlọn Ukwu ga-esi abụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na “ndị eze ụwa” ga-ebere ya ákwá mgbe a ga-ebibi ya. (Mkpughe 17:1, 2; 18:9) Ọ bụghịkwa òtù azụmahịa n’ihi na Baịbụl gosiri na ọ dị iche ná “ndị ahịa ụwa.”​—Mkpughe 18:11, 15.

  4. Foto a natara ndị British Museum ikike see

    Ebe a kpụrụ Eze Babịlọn bụ́ Nabonaịdọs na ihe nọchiri anya chi atọ n’ime otu bụ́ Sin, Ishta, na Shamash

  5. Ihe ndị e kwuru gbasara Babịlọn Ukwu na-egosi na ọ nọchiri anya okpukpe ụgha. Okpukpe ụgha anaghị akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi bịaruo ezi Chineke bụ́ Jehova nso, kama ọ na-eme ka ha fewe chi ọzọ. Baịbụl kwuru na ọ bụ ‘ịkpa àgwà ka ndị akwụna gaa fewe chi’ ọzọ. (Levitikọs 20:6; Ọpụpụ 34:15, 16) Ọtụtụ okpukpe ụgha ka na-akụzi ozizi ndị malitere na Babịlọn oge ochie, dị ka, ozizi atọ n’ime otu, ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, nakwa iji ihe a kpụrụ akpụ efe ofufe. Okpukpe ndị a na-akwadokwa mmadụ ịhụ ụwa n’anya. Baịbụl kpọrọ ha ndị na-akwa iko n’ihi otú ha na ụwa si emekọ ihe.​—Jems 4:4.

    Akụnụba okpukpe ụgha nwere na otú ha si eme okomoko dabara n’ihe Baịbụl kwuru banyere Babịlọn Ukwu, bụ́ onye “yi ákwà na-acha pọpụl na ákwà na-acha uhie uhie,” jirikwa “ọlaedo na nkume dị oké ọnụ na nkume pel chọọ onwe ya mma.” (Mkpughe 17:4) Ọ bụ na Babịlọn Ukwu ka “ihe ndị rụrụ arụ dị n’ụwa,” ya bụ, ozizi na omume ndị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịna-asọpụrụ Chineke si. (Mkpughe 17:5) Ọ bụ ndị nọ n’okpukpe ụgha bụ “agbụrụ dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” ndị na-akwado Babịlọn Ukwu.​—Mkpughe 17:15.

Aka Babịlọn Ukwu dị n’ọnwụ “ndị niile e gburu n’ụwa.” (Mkpughe 18:24) Kemgbe ụwa, okpukpe ụgha na-akpata agha na mpụ juru ebe niile. Ha anaghịkwa akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:8) Ihe a ataala isi ọtụtụ ndị.

Foto dị iche iche: Katidral na ụlọ ụka ndị okpukpe Hindu na Buda, e sekwara otú dị iche iche okpukpe ụgha si akwado agha kemgbe ụwa. 1. Agha ndị chọọchị na ndị Alakụba lụrụ. 2. Agha Ụwa Mbụ. 3. Ebe onye ụkọchukwu chọọchị na-agọzi onye agha. 4. Ebe onye pastọ Afrịka na-aja ndị na-alụ agha agbụrụ na agbụrụ. 5. Ebe ndị agha Japan na-efe eze ukwu ha.

Olee otú Chineke si ele Babịlọn Ukwu anya?

N’anya Chineke, ‘mmehie Babịlọn Ukwu karịrị akarị.’ (Mkpughe 18:4, 5) Chineke na-ewesa okpukpe ụgha iwe maka na ha anaghị agwa ndị mmadụ eziokwu banyere ya nakwa maka na ha na-emesi ndị òtù ha ike.

Gịnị ga-eme Babịlọn Ukwu?

Baịbụl kwuru na ‘Chineke amaala Babịlọn Ukwu ikpe.’ (Mkpughe 18:20) Baịbụl ji ihe atụ dị iche iche kwuo na Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:8) Chineke ga-eme ka otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie, nke nọchiri anya otu ọchịchị siri ike, kpọọ okpukpe asị, bibiekwa ya kpamkpam. (Mkpughe 17:16, 17) “Otú a ka a ga-esi atụda obodo ukwu a bụ́ Babịlọn ngwa ngwa. A gaghịzi ahụ ya ọzọ.” (Mkpughe 18:21) N’ihi ya, ndị chọrọ ime ihe dị Chineke mma ga-esirịrị “ebe ha nọ pụọ,” ya bụ, si n’okpukpe ụgha pụta.​—2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya