Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 92
  • Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Okpukpe
    Teta!—2014
  • Ị̀ Chọtawo Ezi Okpukpe Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 92
Ebe otu nwoke kwụ na-echebara ihe e dowere n’ụzọ nke na-arụ aka n’ụzọ dị iche iche echiche

Olee Otú M Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ji ihe atụ mee ka a mata ihe dị iche ná ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na ndị na-anaghị ekpe ezigbo okpukpe. Ọ sịrị: “Unu ga-eji mkpụrụ ha mata ha. Ndị mmadụ anaghị aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke.” (Matiu 7:16) Otú ahụ a na-esi n’ihe osisi nke ọ bụla mịpụtara amata nke bụ́ osisi vaịn na osisi ogwu, ka i nwekwara ike isi n’ihe ndị nọ n’okpukpe dị iche iche na-eme, ya bụ, mkpụrụ ha na-amị mata ma okpukpe ha ọ̀ bụ nke ezigbo ya.

  1. Ezigbo okpukpe na-akụzi eziokwu ndị dị na Baịbụl, ọ bụghị echiche ụmụ mmadụ. (Jọn 4:24; 17:17) Ọ na-akụzi eziokwu gbasara mkpụrụ obi nakwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs. (Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 35:5, 6; Ezikiel 18:4) Ọ na-agbakwa ụgha ndị okpukpe na-agha n’anwụ.​—Matiu 15:9; 23:27, 28.

  2. Ezigbo okpukpe na-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye Chineke bụ, na-akụzikwara ha na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18; Aịzaya 42:8; Jọn 17:3, 6) Ọ naghị akụzi na Jehova nọ anyị ebe dị anya ma ọ bụ na anyị agaghị amatali ụdị onye ọ bụ. Kama, ọ na-akụzi na Jehova chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.​—Jems 4:8.

  3. Ezigbo okpukpe na-akụzi na Jizọs Kraịst bụ onye Chineke si n’aka ya azọpụta ndị mmadụ. (Ọrụ Ndịozi 4:10, 12) Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-eme ihe Jizọs nyere n’iwu, na-agbakwa mbọ ịna-eme ka ya.​—Jọn 13:15; 15:14.

  4. Ezigbo okpukpe kweere na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu niile dị n’ụwa a. Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-agbasi mbọ ike ịgwa ndị ọzọ gbasara Alaeze a.​—Matiu 10:7; 24:14.

  5. Ezigbo okpukpe na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’atụghị anya irite ihe ọ bụla n’aka ha. (Jọn 13:35) Ọ na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù ma ghara ịkpọ mmadụ asị n’agbanyeghị agbụrụ ya, omenala ya, ma ọ bụ asụsụ ya. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe anaghị alụ agha n’ihi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya.​—Maịka 4:3; 1 Jọn 3:11, 12.

  6. Ezigbo okpukpe enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ. A naghịkwa etu ndị na-akụziri ha ihe okpookpo aha.​—Matiu 23:8-12; 1 Pita 5:2, 3.

  7. Ezigbo okpukpe anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16; 18:36) Ma, ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-asọpụrụ ma na-erubere ndị ọchịchị obodo ha isi. Ha si otú a na-eme ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, “kwụọnụ Siza ihe Siza [Siza nọchiri anya ndị ọchịchị], ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”​—Mak 12:17; Ndị Rom 13:1, 2.

  8. Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe na-akpa àgwà dị mma mgbe niile, ọ bụghị ihe ha na-eme iji mezuo iwu. Ha na-eso ezigbo ntụziaka dị na Baịbụl gbasara omume ọma na omume ọjọọ n’ihe niile ha na-eme. (Ndị Efesọs 5:3-5; 1 Jọn 3:18) Ma, ọ pụtaghị na ha anaghị ekpori ndụ, kama, ha na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-efe “Chineke, onye obi ụtọ.”​—1 Timoti 1:11.

  9. Ndị na-ekpe ezigbo okpukpe dị ole na ole. (Matiu 7:13, 14) A na-eledakarị ndị na-ekpe ezigbo okpukpe anya, na-achị ha ọchị, na-akpagbukwa ha n’ihi na ha na-eme uche Chineke.​—Matiu 5:10-12.

Ezigbo okpukpe abụghị naanị okpukpe ọ bụla masịrị mmadụ

Ọ bụrụ na ihe mere anyị ji ekpe okpukpe anyị na-ekpe bụ naanị maka otú o si amasị anyị, ọ pụtara na nsogbu dị. Baịbụl kwuru na e nwere oge ndị mmadụ ‘ga-akpọkọtara onwe ha ndị [okpukpe] ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ.’ (2 Timoti 4:3) Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị soro ndị na-ekpe “okpukpe dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị,” ọ bụrụgodị na ọ bụghị okpukpe ọtụtụ ndị na-ekpe​—Jems 1:27 na ihe e dere n’ala ala peeji ya; Jọn 15:18, 19.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya