NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ndị Mmadụ Jiri M Na-agba Asịrị?
Ihe mere o ji ewute ewute
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ebu ihe ọjọọ n’obi na-eji ibe ha agba asịrị. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịkpachara anya ghaa ụgha ka o mebie aha gị. Ọ bụrụgodị na asịrị e ji gị gbaa adịchaghị njọ, ọ ka nwere ike iwute gị, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọ bụ onye i chere na gị na ya dị ná mma ji gị gbaa ya.—Abụ Ọma 55:12-14.
“Achọpụtara m na otu enyi m ji m na-agba asịrị, na-asị na ihe gbasara ndị ọzọ anaghị emetụ m n’obi. Ihe a were m iwe. Aghọtaghị m ihe mere ọ ga-eji ekwu ụdị ihe a.”—Ashley.
Nke bụ́ eziokwu: Ma ọ̀ bụ ezigbo enyi mmadụ ji ya gbaa asịrị ma ọ̀ bụ onye ọzọ, o nweghị onye obi na-adị mma ma ndị ọzọ na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ya.
Ihe na-adịghị mma na ya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ị ga-akwụsịli ya
E nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji agba asịrị. Lee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ya:
Ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ. E kere ụmụ mmadụ otú ha na ndị ọzọ ga na-akpakọrịta. N’ihi ya, ọ na-amasị anyị ka anyị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu, na-ekwukwa gbasara ibe anyị. N’eziokwu, Baịbụl gbara anyị ume ka anyị ‘na-achọ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.’—Ndị Filipaị 2:4.
“Ọ na-amasịkarị anyị ikwu gbasara ndị ọzọ.”—Bianca.
“N’eziokwu, m na-achọ ịmata ihe ndị ọzọ na-eme, m na-achọkwa ka mụ na ndị ọzọ kwuo gbasara ya. Amaghị m ihe kpatara ya, mana, ọ na-atọ m ụtọ.”—Katie.
Ike ọgwụgwụ. N’oge a na-ede Baịbụl, e nwere ndị ‘na-anaghị eji oge ha ji ezu ike eme ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ihe ọhụrụ ma ọ bụ igere ihe ọhụrụ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:21) Ọ bụkwa ihe ndị mmadụ na-eme n’oge a.
“Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na e nweghị ihe na-atọ ụtọ na-emenụ, ndị mmadụ na-amalite ikwu gbasara ndị ọzọ ka ha nweta ihe ga-eme ha obi ụtọ.”—Joanna.
Mmadụ ịna-ejikarị onwe ya atụnyere ndị ọzọ. E nwere ezigbo ihe mere Baịbụl ji dọọ anyị aka na ntị ka anyị ghara ịna-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ. (Ndị Galeshia 6:4) Ọ dị mwute na ihe ụfọdụ ndị na-eme maka na ọ na-adị ha ka ndị ọzọ hà ka ha mma bụ iji ha na-agba asịrị.
“Ndị mmadụ gbaa asịrị, o nwere ihe asịrị ha gbara na-egosi gbasara ha. Ihe ọ na-egosikarị bụ na ha na-emere ndị ha ji gbaa asịrị anyaụfụ. Ha na-akọsa ihe na-abụghị eziokwu iji mee ka obi dịtụ ha mma, ka ọ dị ha ka hà ka onye ha ji gbaa asịrị mma.”—Phil.
Nke bụ́ eziokwu: Ma ì kwere ma í kweghị, ndị mmadụ ga na-ekwu gbasara ma gịnwa ma ndị ọzọ.
Ihe dị mma na ya bụ na o kwesịghị igbochi gị ime ihe ndị i kwesịrị ime
O nwere ike ị gaghị egbochili ndị mmadụ iji gị agba asịrị. Ma, ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme ma e jiri gị gbaa asịrị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na e ji gị na-agba asịrị, ọ dịkarịa ala, e nwere ihe abụọ i nwere ike ime.
NKE 1: Leghara ya anya. Ọtụtụ mgbe, ihe kacha mma ime bụ ileghara ya anya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe e kwuru enweghị isi. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka iwe na-ewe gị ọsọ ọsọ.”—Ekliziastis 7:9.
“E nwere mgbe e ji m gbaa asịrị na mụ na otu nwa okorobịa na-akpa. Mana, mụ na nwa okorobịa ahụ ahụtụbedịghị. Ihe a ha kwuru na-atọcha ọchị, mụ achịfuo ya n’ọchị.”—Elise.
“Ihe kacha mma mmadụ ga-eji emeri asịrị bụ aha ọma ya. Ọ bụrụ na mmadụ nwere aha ọma, e jirigodị ya gbaa asịrị, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-anụ asịrị ahụ kweta. Ihe ndị mmadụ ga-ekweta bụ eziokwu ha ma gbasara gị.”—Allison.
Ihe i nwere ike ime: Dee (1) ihe e kwuru gbasara gị (2) otú o mere ka obi dị gị. Ozugbo i kwuru ‘ihe ị chọrọ ikwu n’obi gị,’ ọ ga-adịrị gị mfe ileghara ya anya.—Abụ Ọma 4:4.
NKE 2: Gakwuru onye malitere asịrị ahụ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike iche na asịrị e ji gị gbaa dị oké njọ nke na i kwesịrị ịgakwuru onye malitere ya ka gị na ya kpaa gbasara ya.
“Ọ bụrụ na ị gakwuru ndị ji gị agba asịrị, ha ga-amata na ihe ha kwuru mechara ruo gị ntị. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-eme ka ị gwa ha nke bụ́ eziokwu, o nwekwara ike ime ka gị na ha kpezie.”—Elise.
Tupu gị agakwuru onye ji gị gbaa asịrị, chebara ihe ndị a Baịbụl kwuru echiche, jụọkwa onwe gị ajụjụ ndị ha na ha so.
“Ọ bụrụ na mmadụ azaa okwu tupu ya anụ ihe merenụ, ọ na-egosi na ọ dị iberiibe.” (Ilu 18:13) ‘Àma m otú ihe niile si mee? Ọ̀ ga-abụ na onye kọọrọ m gbasara asịrị ahụ aghọtachaghị ihe e kwuru?’
‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa, na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) ‘Ihe a ọ̀ bụ oge dị mma ịgakwuru onye ahụ ji m gbaa asịrị? M̀ ji n’aka na m na-ele okwu a anya otú kwesịrị ekwesị? Ka ọ̀ ka mma ka m cheretụ ka oge gafetụ, ka obi nwee ike ịjụrụ m?’
“Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.” (Matiu 7:12) ‘Ọ bụrụ mụnwa ji onye ọzọ gbaa asịrị, olee otú m ga-achọ ka e si gwa m gbasara ya? Olee ebe m ga-achọ ka mụ na onye ahụ nọrọ kwuo gbasara ya? Olee ụdị okwu ga-eme ka ihe ka mma, oleekwa otú ihu na obi kwesịrị ịdị m ka ihe nwee ike ịka mma?’
Ihe i nwere ike ime: Tupu gị agakwuru onye ji gị gbaa asịrị, dee ihe ị chọrọ ikwu ede. Cherezie ka otu izu ma ọ bụ abụọ gafee, gị agụgharịa ihe ahụ i dere ka ị mara ma è nwere ihe ndị ị ga-agbanwe na ya. Gakwurukwa papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ otu enyi gị ma nke a na-akọ jụọ ya ihe o chere gbasara okwu ahụ.
Nke bụ́ eziokwu: Otú ahụ ọ na-abụghị gị na-ekpebi ọtụtụ ihe na-eme ná ndụ ka ọ na-abụghịkwa gị ga-ekpebi ma à ga-eji gị agba asịrị ka ọ̀ bụ na a gaghị eji gị agba. Ma, ọ pụtaghị na ị ga na-eme ihe ị na-ekwesịghị ime maka na e ji gị gbaa asịrị.