Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Emeso Ndị Na-abụghịzi Ndị Okpukpe Ha?
Anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị jiri obiọma na-emeso mmadụ niile ihe, hụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. Ọ bụrụ na onye bụbu Onyeàmà Jehova akwụsịlata iso anyị efe Jehova ma ọ bụ kwụsịchaa ime otú ahụ, anyị na-agbalị gakwuru ya, mee ka ọ mata na anyị ka hụrụ ya n’anya ma nyere ya aka ka ọ maliteghachi ife Jehova.—Luk 15:4-7.
Mgbe ụfọdụ, àgwà ọjọọ mmadụ na-akpa nwere ike ime ka e kewapụ ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrịnt 5:13) Ma, ebe ọ bụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu, anyị na-agbalịsi ike ka anyị nyere onye ọ bụla aka tupu ihe eruo nke ikewapụ ya n’ọgbakọ. Ọ bụrụgodị na e kewapụ mmadụ n’ọgbakọ, anyị ka ga na-egosi ya na anyị hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù, otú Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-eme.—Mak 12:31; 1 Pita 2:17.
Gịnị na-eme ka e kewapụ mmadụ n’ọgbakọ?
Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ ma jụ ịgbanwe, e kwesịrị ikewapụ ya n’ọgbakọ.a (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13) Baịbụl kwuru ụdị mmehie ndị dị oké njọ, ndị nwere ike ime ka e kewapụ mmadụ n’ọgbakọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịkwa iko, ịṅụ oké mmanya, igbu mmadụ, mmadụ imegbu ndị ezinụlọ ya, na izu ohi.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Ndị Galeshia 5:19-21; 1 Timoti 1:9, 10.
Ma, ọ naghị abụ mmadụ mehaala mmehie dị oké njọ, anyị ekewapụ ya n’ọgbakọ ozugbo. Ndị okenye ọgbakọb na-ebugodị ụzọ gbalịa inyere ya aka ka ọ gbanwee àgwà ọjọọ ya. (Ndị Rom 2:4) Ha na-eji obiọma emeso ya ihe ma gbalịa ịgwa ya okwu ga-eru ya n’obi. (Ndị Galeshia 6:1) Iji aka a soro onye mere ihe ọjọọ nwere ike ime ka ọ ghọta na ihe o mere adịghị mma, ya echegharịa. (2 Timoti 2:24-26) Ma, ọ bụrụ na a gbalịchaa inyere ya aka, ya akpọchie ntị na-eme mmehie ma ghara ichegharị, a ga-ekewapụ ya n’ọgbakọ. Ihe ndị okenye ga-emezi bụ ịmara ọgbakọ ọkwa na onye ahụ abụghịzi Onyeàmà Jehova.
Ndị okenye na-eji obiọma emeso onye mere ihe ọjọọ ihe ma gbalịa ịgwa ya okwu ga-eru ya n’obi
Olee uru isi n’ọgbakọ kewapụ onye kpebiri na ya ga na-eme ihe ọjọọ bara? Otu n’ime uru ọ bara bụ na ọ na-egosi na ọgbakọ na-akwado ọchịchọ Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya ghara ịna-eme omume rụrụ arụ. Ikewapụ ụdị onye a n’ọgbakọ na-emekwa ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ ya. (1 Ndị Kọrịnt 5:6; 15:33; 1 Pita 1:16) Uru ọzọ ọ bara bụ na o nwere ike ime ka onye e kewapụrụ n’ọgbakọ kwụsị ime ihe ọjọọ, gbanwee ma kpawazie ezigbo àgwà.—Ndị Hibru 12:11.
Olee otú Ndịàmà Jehova si emeso ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ ihe?
Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na e kewapụ mmadụ n’ọgbakọ, ya na Ndị Kraịst ‘ga-akwụsị ịna-emekọrịta ihe, ha na ya agaghịdị ‘erikọ ihe.’ (1 Ndị Kọrịnt 5:11) N’ihi ya, anyị na onye e kewapụrụ n’ọgbakọ anaghị akpakọrịta. Ma, ọ pụtaghị na e nweghịzi ihe jikọrọ anyị na ya. Anyị na-akwanyere onye ahụ ùgwù. O nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụ mgbakọ anyị. Ya bịa, ụfọdụ Ndịàmà Jehova bịaranụ nwere ike ikele ya ma ha chọọ.c O nwekwara ike ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya.
Ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị
Gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na onye e kewapụrụ n’ọgbakọ nwere di ma ọ bụ nwunye na ụmụaka ndị ka bụ́ Ndịàmà Jehova? Ọ bụ eziokwu na o soghịzi ndị ezinụlọ ya efe Jehova, ma ha na ya ka bụ otu ezinụlọ. Ebe ọ bụ na ha bi n’otu ụlọ, di ya ma ọ bụ nwunye ya ka kwesịrị ịna-emeso ya ihe otú nwunye ma ọ bụ di kwesịrị ịna-emeso di ya ma ọ bụ nwunye ya, ụmụ ya ka kwesịkwara ịna-akwanyere ya ùgwù.
Onye e kewapụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha bịa ná nke ya. Ọ bụrụ na ndị okenye agaa ileta ya, ha ga-esi na Baịbụl nye ya ndụmọdụ ma gbaa ya ume ka o chegharịa ma lọghachikwute Chineke. (Zekaraya 1:3) Ọ bụrụ na ọ kwụsị omume ọjọọ ọ na-eme ma gosi na o ji obi ya niile chọọ ibi ndụ otú Baịbụl kwuru, ọ ka nwere ike ịlọghachi n’ọgbakọ. Ya lọghachi, ọgbakọ ga-eji “obiọma gbaghara ya ma kasie ya obi” otú Ndị Kraịst bi na Kọrịnt meere otu onye mere mmehie ma mechaa kwụsị mmehie ọ na-eme.—2 Ndị Kọrịnt 2:6-8.
Olee otú obi na-adị ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ ma ha mechaa lọghachi?
Legodị ihe ụfọdụ Ndịàmà Jehova e kewapụburu n’ọgbakọ ma ha emechaa kpebie ịlọchachikwute Chineke kwuru.
“Mgbe m kpebiri na m ga-alọghachi n’ọgbakọ, echere m na ndị okenye ga-achọ ka m kọọrọ ha ihe ọjọọ niile m nọ na-eme n’ime ọtụtụ afọ e kewapụrụ m n’ọgbakọ. Kama ime otú ahụ, ha gwara m, sị, ‘Ihe anyị chọrọ bụ ka i lekwasị anya n’ihe ndị i kwesịrị ime bido ugbu a gawa.’ Mgbe ha gwachara m ihe a, obi ruru m nnọọ ala.”—Maria, Amerịka.
“Ndị nọ n’ọgbakọ nọ na-atụsi anya ike ka m lọghachi. M ghọtara na ha ji m kpọrọ ihe. Ụmụnna m nyeere m aka ka m ghọta na Jehova agbagharala m nakwa na hanwa agbagharala m. Ihe a nyeere aka ilekwasị anya n’otú m ga-esi mewekwa nke ọma. N’oge niile ahụ, ndị okenye nọ na-enyere m aka ka mụ na Jehova dịghachi ná mma. Ha kasiri m obi ma nyere m aka ịhụ na Jehova ka ji m kpọrọ ihe ma hụ m n’anya.”—Malcom, Siera Lion.
“Obi dị m ụtọ na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya nke ukwuu nke mere o ji ahụ na e debere ọgbakọ ya ọcha. Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ chere na ikewapụ mmadụ n’ọgbakọ adịghị mma, ma o kwesịrị ekwesị, ọ bụkwa otú e si egosi mmadụ na a hụrụ ya n’anya. Obi dị m ụtọ na Nna anyị nke eluigwe bụ Chineke onye hụrụ ndị ya n’anya ma na-agbaghara ha mmehie.”—Sandi, Amerịka.
a Mgbe mbụ, anyị na-asị na a chụpụla onye na-eme omume ọjọọ nke na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Ma ugbu a, anyị na-ekwu ya otú e dere ya na Baịbụl, ya bụ, na e kewapụla onye ahụ n’ọgbakọ.
b Ndị a na-akpọ ndị okenye bụ ụmụ nwoke ma nke a na-akọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị na-ejikwa Akwụkwọ Nsọ akụziri ndị na-efe Jehova ihe, na-azụ ha ka atụrụ, na-enyere ha aka ma na-agba ha ume. A naghị akwụ ha ụgwọ maka ọrụ ndị a ha na-arụ.—1 Pita 5:1-3.
c Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịhapụ ọgbakọ ma bidozie ịgba ọgbakọ mgba okpuru ma ọ bụkwanụ mewe ihe ga-eme ka ndị ọzọ soro ya mewe ihe ọjọọ. Ụdị ihe a mee, anyị na-esoro ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ “unu ekelekwala ya.”—2 Jọn 9-11.