Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 62
  • Gịnị Ka A Na-eme n’Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka A Na-eme n’Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị na gịnị ka a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?
  • Ebee ka ha na-anọ agba akwụkwọ?
  • Ònye nwere ike ịbịa?
  • È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?
  • Ndị na-abịa agbamakwụkwọ hà ga-eweta onyinye?
  • À ga-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọrọ ndị na-agba akwụkwọ ọfọ ọma?
  • Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị na-agba akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ihe ọzọ n’ahụ́?
  • À ga-enye ndị bịaranụ nri na mmanya?
  • À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?
  • Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ?
  • Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Otú Ị Ga-esi Hazie Agbamakwụkwọ Gị Ka E Too Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Agbamakwụkwọ Ndị Dị Ùgwù n’Anya Chineke Na Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 62
Ebe nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ. Nke nwoke na-agbanye nke nwaanyị mgbaaka.

Gịnị Ka A Na-eme n’Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?

A na-ahazi agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova nke ọma, e nweghịkwa ọtụtụ ihe a na-eme na ya. A na-ekwukarị okwu dị nkenke si na Baịbụl. Di na nwunye gbachaa akwụkwọ, e nwekwara ike inwe nnọkọ bụ́ ebe e nwere ike inye ndị bịaranụ ihe oriri.a Jizọs gara ụdị oriri agbamakwụkwọ a n’obodo a na-akpọ Kena obere oge ọ malitere ozi ya n’ụwa.​—Jọn 2:1-11.

  • Gịnị na gịnị ka a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?

  • Ebee ka ha na-anọ agba akwụkwọ?

  • Ònye nwere ike ịbịa?

  • È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?

  • Ndị na-abịa agbamakwụkwọ hà ga-eweta onyinye?

  • À ga-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọrọ ndị na-agba akwụkwọ ọfọ ọma?

  • Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị na-agba akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ihe ọzọ n’ahụ́?

  • À ga-enye ndị bịaranụ nri na mmanya?

  • À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?

  • Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ?

Gịnị na gịnị ka a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova?

Isi ihe a na-eme n’agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ okwu agbamakwụkwọ Onyeàmà Jehova na-ekwu. Okwu a na-ewe ihe dị ka nkeji iri atọ. Okwu a na-agba ume na-eme ka di na nwunye mata otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka ka ha na-ahụ ibe ha n’anya, na-enwe obi ụtọ, na-ebikwa n’udo.​—Ndị Efesọs 5:33.

N’ọtụtụ mba, gọọmenti na-enye ụfọdụ Ndịàmà Jehova ikike ijikọ nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ. Ọ bụrụ na ha mere otú ahụ, e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ, nwoke na nwaanyị ahụ na-ekwe ibe ha nkwa. Ha nwekwara ike ịgbanye ibe ha mgbaaka. Onye kwuru okwu agbamakwụkwọ na-ekwuzi na ha abụrụla di na nwunye.

Ná mba ụfọdụ, ọ bụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti ka a na-anọ ejikọ nwoke na nwaanyị ka ha bụrụ di na nwunye. Ya dị otú ahụ, a na-ekwu okwu agbamakwụkwọ obere oge e jikọchara ha. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ahụ ekweghị ibe ha nkwa n’ụlọ ọrụ gọọmenti, ha nwere ike ime otú ahụ ma e kwuchawa okwu agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha ekweela ibe ha nkwa, ha nwere ike ikwughachi ya ọzọ, ma ha ga-ekwuzi ya otú ga-egosi na ha ekwebuola ibe ha nkwa. Iji pịachie okwu agbamakwụkwọ, a na-ekpe ekpere rịọ Chineke ka ọ gọzie di na nwunye ahụ.

Ebee ka ha na-anọ agba akwụkwọ?

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze agba akwụkwọ.b Ọ bụrụ na ndị gbara akwụkwọ chọọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ha ga-achọta ebe ọzọ ha ga-anọ mee ya.

Ebe nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu Onyeàmà Jehova si na Baịbụl na-ekwu okwu agbamakwụkwọ.

Ònye nwere ike ịbịa?

Ọ bụrụ na agbamakwụkwọ ga-abụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma Ndịàmà Jehova ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịbịa. Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ka ndị mmadụ bịa kụọ ngaji n’ezé, ọ bụ ha ga-ekpebi ndị ha ga-akpọ.

È nwere ụdị uwe a ga-achọ ka ndị ga-abịa yiri?

N’eziokwu, e nweghị ụdị uwe a kapịrị ọnụ ka ndị mmadụ yiri bịa agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ka ha mee ihe Baịbụl kwuru ma na-eyi uwe dị mma n’anya nakwa nke na-egosi na ha na-akwanyere ihe a bịara ùgwù. Ọ na-amasị ha ma ndị ọzọ bịara agbamakwụkwọ mee otú ahụ. (1 Timoti 2:9) Otu ihe ahụ ka a chọkwara ka ndị na-abịa ịkụ ngaji n’ezé mee, ma ọ bụrụ na a ga-enwe nnọkọ oriri.

Ndị na-abịa agbamakwụkwọ hà ga-eweta onyinye?

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-emesapụ aka. (Abụ Ọma 37:21) Ọ na-amasị Ndịàmà Jehova inye ndị na-agba akwụkwọ onyinye ma ọ bụ ịnata onyinye n’agbamakwụkwọ ha. (Luk 6:38) Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa ndị mmadụ ka ha nye ha onyinye, ha anaghịkwa akpọ aha ndị nyere ha onyinye. (Matiu 6:3, 4; 2 Ndị Kọrịnt 9:7; 1 Pita 3:8) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ịmanye ndị mmadụ inye onyinye na ịkpọ aha ndị nyere onyinye adịghị mma. Ime otú a nwekwara ike ime ka ihere mewe ndị ọzọ bịara agbamakwụkwọ.

À ga-eweli iko mmanya kụkọta ha ọnụ iji gọọrọ ndị na-agba akwụkwọ ọfọ ọma?

Baịbụl ekwughị na ịkụkọta iko ọnụ gọọrọ mmadụ ọfọ ọma bụ ihe ọjọọ. Ma, ụfọdụ di na nwunye nwere ike ịgwa ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ha ka ha ghara ime otú ahụ maka na ha achọghị ime ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ.​—Ndị Rom 14:21.

Ndị bịara agbamakwụkwọ hà ga-awụ ndị na-agba akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ihe ọzọ n’ahụ́?

Mba. N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-awụ ndị gbara akwụkwọ osikapa ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ n’ahụ́. Ha kweere na ọ ga-ewetara di na nwunye ihu ọma, obi ụtọ, na ogologo ndụ. Ma Ndịàmà Jehova anaghị eme ihe ọ bụla gbasara ozizi ụgha. Ịgọrọ mmadụ ọfọ ihu ọma so na ya, Baịbụl akwadoghịkwa ya.​—Aịzaya 65:11.

À ga-enye ndị bịaranụ nri na mmanya?

A naghị anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eri ihe oriri ma ọ bụ aṅụ mmanya ma a gbawa akwụkwọ. Ma, ọ na-abụ ụfọdụ di na nwunye gbachaa akwụkwọ, ha enwee nnọkọ oriri bụ́ ebe ha na-enye ndị bịara agbamakwụkwọ ha ihe oriri ma ọ bụ ihe ha ga-eji megharịa ọnụ. (Ekliziastis 9:7) Ọ bụrụ na ha kpebiri inye ndị bịara agbamakwụkwọ ha mmanya na-aba n’anya, ha anaghị ekwe ka ọ karịa akarịa, ha na-ahụkwa na ọ bụ naanị ndị toruru ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka a ga-enye ya.​—Luk 21:34; Ndị Rom 13:1, 13.

À ga-akụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú?

Ọ bụrụ na ndị ahụ gbara akwụkwọ kpọrọ ndị bịaranụ ka ha bịa kụọ ngaji n’ezé, ha nwere ike ikpebi ka a kụọ egwú ma ọ bụ gbaa egwú. (Ekliziastis 3:4) Ụdị egwú ha ga-ahọrọ ka a kụọ ga-abụ ụdị egwú na-amasị ha ma ọ bụ ndị obodo ha. Ma, ha kwesịrị ijide n’aka na ọ ga-abụ egwú dị mma nke na-agaghị eme ka ndị bịaranụ chewe ihe na-adịghị mma. A gbawa akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-akpọkarị egwú ndị ihe e kwuru na ha si n’Akwụkwọ Nsọ.

Ebe di na nwunye gbara akwụkwọ na-agba egwú n’oriri agbamakwụkwọ, ha na ụfọdụ ndị ha kpọrọ oriri.

Ndịàmà Jehova hà na-eme ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ?

Baịbụl ekwughị ma ime ememme e ji echeta ụbọchị agbamakwụkwọ ọ̀ dị mma ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. N’ihi ya, ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ma hà ga-eme ya ka ọ̀ bụ na ha agaghị eme. Ọ bụrụ na ha kpebiri ime ya, ha nwere ike ime ya naanị ha ma ọ bụkwanụ ha akpọọ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha ka ha soro ha mee ya.

a Omenala, otú e si eme ihe, na iwu na-achị obodo dị iche iche nwere ike ime ka otú e si agba akwụkwọ n’otu ebe dị iche n’otú e si agba ya n’ebe ọzọ.

b A naghị akwụ onye kwuru okwu agbamakwụkwọ ụgwọ, a naghịkwa akwụ ụgwọ maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya