Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwhf isiokwu 37
  • Di ma Ọ Bụ Nwunye ịṅụbiga Mmanya Ókè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Di ma Ọ Bụ Nwunye ịṅụbiga Mmanya Ókè
  • Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata nsogbu n’ezinụlọ
  • Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?
  • Ekwula na mmanya abụrụghị gị nsogbu
  • Ihe i nwere ike ime
  • Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́
    Teta!—2005
  • Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
ijwhf isiokwu 37
Mgbaaka abụọ na karama mmanya na-aba n’anya dịcha n’elu tebụl.

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Di ma Ọ Bụ Nwunye ịṅụbiga Mmanya Ókè

Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwatụla gị na otú i si aṅụ mmanya na-aba n’anya na-echegbu ya? Ọ bụrụ na ọ gwatụla gị ya, e nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

  • Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata nsogbu n’ezinụlọ

  • Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?

  • Ekwula na mmanya abụrụghị gị nsogbu

  • Ihe i nwere ike ime

Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata nsogbu n’ezinụlọ

Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata ọrịa dị iche iche, dị ka, ọrịa obi, ọrịa imeju, nakwa ọrịa kansa. Ma, ọ bụghị naanị ọrịa ka ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata, ọ na-akpatakwa nsogbu ndị ọzọ n’ezinụlọ, dị ka, di ma ọ bụ nwunye iti ibe ya ihe, nsogbu ego, di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí, nakwa ịgba alụkwaghịm.

Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ aṅụbiga mmanya ókè, “ọ na-ata ka agwọ, ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala.” (Ilu 23:32) Olee otú ị ga-esi ama ma ịnụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?

Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ò riela gị ahụ́?

Ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịmata ma ò riela gị ahụ́:

  • Ọ̀ na-esiri gị ike ịma ebe ị ga-aṅụru mmanya kwụsị?

  • Ị̀ na-adị echekarị banyere oge ọzọ ị ga-aṅụ mmanya?

  • Ị̀ ka na-anụ mmanya n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ na-akpatara gị, ma nsogbu ezinụlọ?

  • Ahụ́ ọ̀ na-arịawa gị oge ọ bụla ị kwụsịwara ịṅụ mmanya?

  • Otú i si aṅụ mmanya ọ̀ na-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-arụkarị ụka?

  • Ị̀ na-aṅụzi mmanya na-aba n’anya karịa otú ị na-aṅụbu?

  • Ị̀ na-ezo ezo aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụkwanụ zoo ya n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ?

Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu ma ọ bụ karịa n’ime ajụjụ ndị a, o nwere ike ịbụ na mmanya na-aba n’anya eriela gị ahụ́. O nwere ike ịbụ na mmanya ị na-aṅụ akpatarala gị nsogbu, gị abụrụzie aṅụrụma.

Ekwula na mmanya abụrụghị gị nsogbu

Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwatụla gị na otú i si aṅụ mmanya na-echegbu ya? Ọ bụrụ na ọ gwatụla gị, o nwere ike ịbụ na ị gbalịala ime ka ọ dị ka mmanya ị na-aṅụ abụghị nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị taadịla ndị ọzọ ụta, ma di gị ma ọ bụ nwunye gị, kwuo ihe ndị dị ka:

  • “A sị na ị na-emeta m ọfụma, agaghị m na-aṅụ mmanya.”

  • “A sị na ị na-arụ ụdị ọrụ a na-agwụ ike m na-arụ, ị gakwaara na-aṅụ mmanya.”

  • “E nwere ọtụtụ ndị m ma na-aṅụ mmanya karịa m.”

Ọ bụrụ na i kwuru ụdị ihe ndị a, ọ̀ ga-abụ na ị na-ewere na ịṅụ mmanụ dị mkpa karịa gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ịna-enwe obi ụtọ? Olee nke kwesịrị ị ka gị mkpa?

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye lụrụ nwaanyị na-echegbu onwe ya . . . na-achọ ime ihe dị nwunye ya mma.”​—1 Ndị Kọrịnt 7:33.

Foto na-egosi ihe abụọ dị iche n’ibe ya nwoke nwere ike ime ma nwunye ya gwawa ya na mmanya ọ na-aṅụ na-echegbu ya. 1. Di ya nọ n’azụ mgbidi e ji brik rụọ, o jikwa otu karama mmanya n’aka. Karama abụọ ọzọ dị n’ala ebe ahụ. Nwunye ya kwụ n’akụkụ nke ọzọ nke mgbidi ahụ, ihu ya gbarụrụ agbarụ, ọ naghịkwa ahụ di ya. 2. Di ya si na nnukwu windo na-ele nwunye ya anya, na-egekwa ya ntị.

Ikwu na mmanya na-aba n’anya anaghị akpatara gị nsogbu dị ka ebe mgbidi nọchiri nwunye gị ịgwa gị okwu, ma ikweta na i nwere nsogbu dị ka ebe i si na window na-ege nwunye gị ntị

Ihe i nwere ike ime

  • Ejila ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru egwu egwu. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka mmanya ị na-aṅụ abụchaghị nsogbu, leenụ ma è nwere ihe ụfọdụ ị ga-agbanwe? Ọ bụrụ na e nweghị ihe ọ bụla ị ga-agbanweli, ọ bụrụkwa na i sie ọnwụ na ị ka ga na-aṅụ mmanya n’agbanyeghị na otú i si aṅụ ya na-echegbu di gị ma ọ bụ nwunye gị, o nwere ike ịpụta na ịṅụ mmanya na-aba n’anya abụrụla gị nsogbu.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

  • Mata eziokwu gbasara mmanya. Ọ bụrụ na onye agha chọrọ imeri n’agha, o kwesịrị ịmata otú ndị iro ya si alụ ọgụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị gị. Ị chọọ ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya, i kwesịrị ịmata ihe niile gbasara ya na otú o si etinye mmadụ ná nsogbu. I kwesịkwara ịma ihe ị ga-eme ka mmanya gharazie iri gị ahụ́ nakwa ka ị ghara ịmalitekwa ịṅụ ya ọzọ.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Na-agbara ihe ọjọọ ndị gị na ha na-alụ ọgụ ọsọ.’​—1 Pita 2:11.

  • Gaa ka e nyere gị aka. E nwere ndị na-ahụ maka ahụ́ ike na-enyere ndị ha na mmanya na-aba n’anya na-alụ aka. Ha na-ahazi ihe ụfọdụ ndị ahụ nwere ike ịna-eme, ebe ha ga-aga nara ọgwụ, nakwa ụlọ ọgwụ ndị ha nwere ike ịga. I nwekwara ike ịgwa enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka ịmata ihe ndị ọzọ mere mmanya na-aba n’anya ji rie gị ahụ́. Gaakwa ka enyi gị a nyere gị aka mgbe ọ bụla ọ gụwara gị agụụ ibidokwa ṅụwa oké mmanya.

    Ebe nwoke ahụ nọ n’oche na-agwa onye ọrụ ahụ́ ike okwu.

    Maranụ ma ị̀ ga-aga ka ndị na-ahụ maka ahụ́ ike nyere gị aka

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Ịṅụbiga mmanya ókè abụghị obere nsogbu mmadụ ga-akwụsị naanị ma ọ gụọ otu obere isiokwu ma ọ bụkwanụ naanị ma o kwuo na ya ga-agba mbọ kwụsị ịṅụ mmanya. Ma, i kwesịrị ịma na ihe ọ bụla i mere gbasara ya ga-agbasa ahụ́ ike gị, gbasakwa di gị ma ọ bụ nwunye gị.

Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe a: Gụọ isiokwu ndị a ka ị hụ otú ndị ọzọ si kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè.

‘Anaghịzi M Echi Nwunye M Ọnụ n’Ala’

“Ihere Onwe M Anaghịzi Eme M”

“M Malitere Ibi n’Okporo Ámá”

Leekwa vidio isiokwu ya bụ ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike’

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya