EPREL 13-19
AỊZAYA 52-53
Abụ nke 18 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe Jizọs bu osisi na-aga n’ebe a ga-egbu ya
1. Jizọs Hụrụ Ụmụ Mmadụ n’Anya Nke Ukwuu
(Nkeji 10)
A ga-eleda Jizọs anya (Aịza. 53:3; Mat. 26:67, 68; w10 11/15 7 ¶2)
Jizọs ga-ekwe ka e mekpaa ya ahụ́ (Aịza. 53:7; ip-2 205 ¶25)
Ọ bụ maka na Jizọs hụrụ Jehova na ụmụ mmadụ n’anya mere o ji kweta ịta ahụhụ ka o wee mee uche Jehova ma buru mmehie anyị (Aịza. 53:10-12; Jọn 14:31; 15:13)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 52:11—Kọwaa otú ndị ohu Jehova ga-esi eme ihe a e buru n’amụma na ha ga-eme. (it “Arịa” ¶2)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 53:3-12 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
Abụ nke 20
7. Bụrụ Enyi Jehova—Ịhụnanya Kachanụ E Gositụrụla
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee otú àjà Jizọs chụrụ si bụrụ onyinye?
Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ọ chụrụ?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 76-77