Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb26 Jenụwarị p. 6-7
  • Jenụwarị 19-25

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenụwarị 19-25
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026
mwb26 Jenụwarị p. 6-7

JENỤWARỊ 19-25

AỊZAYA 24-27

Abụ nke 159 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Onye A Bụ Chineke Anyị”

(Nkeji 10)

E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri Chineke anyị, bụ́ Jehova, na-anya isi (Aịza. 25:9; cl 15 ¶21)

E nwere ọtụtụ ihe o kwere nkwa na ọ ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ. Otu n’ime ha bụ na ọ ga-enye anyị ezigbo nri n’ụba (Aịza. 25:6; w24.12 6 ¶14)

Ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi (Aịza. 25:7, 8; w25.01 28-29 ¶11-12)

Ebe nwanna nwoke merela agadi, onye nọ n’oche ndị ngwọrọ, na-ezi onye na-elekọta ya ozi ọma.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M mewe ihe ndị dịịrị m n’izu a, ònye ka m ga-akọrọ nkwa ndị Jehova kwere?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 24:2​—Gịnị bụ otu n’ime ihe ndị e degharịrị na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ amaokwu a gosiri? (w15 12/15 17 ¶1-3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Aịza. 25:1-9 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ. Gosi ya ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, jw.org. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe ngosi. ijwbq isiokwu nke 160​—Isiokwu: Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke? (th ihe ọmụmụ nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 144

7. Jiri Obi Gị Niile Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-akwadebe Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ịwa Ahụ́

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Jehova na-echebe “ndị ji obi ha niile tụkwasị [ya] obi.” (Gụọ Aịzaya 26:3.) Mgbe anyị na-akwadebe ịga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ́, anyị ga-egosi na anyị ji obi anyị niile tụkwasị Jehova obi ma anyị nabata aka o si ná nzukọ ya na-enyere anyị.

Foto ndị si na vidio bụ́ “Ì Jikerela Maka Ihe Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ?” 1. Ebe nwanna nwoke ji Baịbụl nakwa isi nke 39 n’akwụkwọ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi” na-eme nchọnchọ. 2. Ebe nwanna nwoke na-edejupụta kaadị DPA. 3. Ebe nwanna nwoke so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ si n’ekwentị na-enyere mmadụ aka. 4. Ebe nwanna nwaanyị na-enye dọkịta akwụkwọ ya.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Ì Jikerela Maka Ihe Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe atọ ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ịga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ́?

  • Olee otú akwụkwọ ndị e wepụtaraa na-ekwu gbasara ahụ́ ike si enyere anyị aka?

  • Gịnị mere o ji kacha mma ịkpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ?

  • Olee otú obi dị gị maka ụzọ ndị a Jehova si enyere anyị aka maka na ọ hụrụ anyị n’anya?

Nkwa Jehova kwere n’Aịzaya 26:3 na ọ ga-eme ka ndị ya “na-ebi n’udo mgbe niile” apụtaghị na ọ ga-echebe anyị ka ọrịa ọ bụla ghara ịrịa anyị. Kama, ihe ndị o si ná nzukọ ya na-enye anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka ka obi ruo anyị ala ma anyị rịawa ọrịa.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 54-55

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 53 na Ekpere

a Ihe Ụmụ Nwaanyị Dị Ime Kwesịrị Ịma (S-401), Ihe Ndị A Chọrọ Ịwa Ahụ́ na Ndị Na-arịa Ọrịa Kansa Kwesịrị Ịma (S-407), na nke a na-akpọ Ihe Ndị Nne na Nna Nwere Ike Ime Iji Hụ na A Mịnyeghị Ụmụ Ha Ọbara (S-55). I nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha nye gị nke ị chọrọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya