Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 7
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 7
Abụ nke 86 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 4 ¶1-15 na igbe dị na peeji nke 39 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe E Mere 10-14 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ihe E Mere 13:13-22 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma? (Nkeji 5)
Nke 3: Ọchịchị Ònye Ga-eme Ka Ndị Mmadụ Na-enwe Obi Ụtọ ma Biri n’Udo Otú Chineke Bu n’Obi Mgbe O Kere Mmadụ?—wp14 5/1 p.16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.”—Ọrụ 14:22.
Nkeji 10: “Anyị Aghaghị Ịbanye n’Alaeze Chineke Site n’Ọtụtụ Mkpagbu.” Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:21, 22 na 1 Pita 4:12-14. Kọwaakwa ha. (Gụọ Ụlọ Nche Septemba 15, 2014, p. 13, para. 3-6.) Ná nkenke, gosi otú ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a si gbasa isiokwu ọnwa a. Gbaa mmadụ niile ume ka ha kirie vidio Ụmụnna Anyị Nọ n’Ụwa Dum iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe n’izu na-abịa.
Nkeji 10: Olee Otú I Kwesịrị Isi Zaghachi? (Kọl. 4:6) Okwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 69, paragraf nke 1-3. A ga-eme ihe ngosi abụọ. Na nke mbụ, onye nwe ụlọ gwara onye nkwusa okwu otú na-adịghị mma, onye nkwusa ahụ agwagwara ya. Otú a o si zaghachi ya mere ka onye ahụ ghara ige ya ntị. Ma, n’ihe ngosi nke abụọ, onye nkwusa ahụ ji olu ọma zaghachi onye nwe ụlọ okwu ọjọọ ọ gwara ya. Otú a o si zaghachi ya mere ka onye ahụ ọ bịara izi ozi ọma gee ya ntị.
Nkeji 10: “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Habakọk Onye Amụma.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 74 na Ekpere