Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 23
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 23
Abụ nke 26 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 3 ¶1-13, na igbe dị na p. 29 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ihe E Mere 1-5 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ihe E Mere 3:14–4:6 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ịhụnanya Adịghị Ekwo Ekworo—1 Kọr. 13:4 (Nkeji 5)
Nke 3: Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke? Olee Otú E Si Dee Ya?—wp14 2/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.”—1 Kọr. 3:6.
Nkeji 10: “Ịkwado Akwado Ga-enyere Anyị Aka Ịna-akụzi Ihe Nke Ọma.” Okwu.
Nkeji 10: Ịkpa Ezigbo Àgwà Na-eme Ka E Gewe Anyị Ntị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2015, peeji nke 49, paragraf nke 3, ruo peeji nke 51, paragraf nke 3; nakwa peeji nke 140, paragraf nke 3, ruo peeji nke 141, paragraf nke 3. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Jiri Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Bible Na-akụzi Na-enyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Abụ nke 123 na Ekpere