Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 16
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 16
Abụ nke 17 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 2 ¶13-23, na igbe dị na p. 24 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 26-29 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 29:20-30 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Mere Kraịst Ga-eji Abịa Ọzọ?—wp13 12/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Ji Eme Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 12:19 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.”—1 Kọr. 3:6.
Nkeji 10: Na-agba Ndị Nwere Mmasị “Mmiri.” (1 Kọr. 3:6-8) A ga-agba otu ọsụ ụzọ na otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ n’ihe omume a. Olee otú ha si hazie oge ha ka ha nwee ike ịna-aga nletaghachi? Olee otú ha si akwadebe tupu ha agawa? Gịnị ka ha na-eme ma ọ bụrụ na ha anaghị enwetakarị onye ha chọọ gaa? Olee ahụmahụ ndị ha nwere tọrọ ha ụtọ?
Nkeji 20: “Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru.” Ajụjụ na azịza. Gwa ụmụnna otú ha nwere ike isi na-aga na jw.org egere ihe ndị a na-egere egere. A ga-akpọnyere ha otu ka ha gere. A ga-eji ahụmahụ ahụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2014 mee ihe ngosi. Ahụmahụ ahụ dị ná ngwụcha isiokwu bụ́ “Jiri Isiokwu Bụ́ ‘Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara’ nke Dị na jw.org Na-ekwusa Ozi Ọma.”
Abụ nke 108 na Ekpere