Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 26
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 26
Abụ nke 15 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 1 ¶1-13 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 12-15 (Nkeji 8)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbanyenụ mgbọrọgwụ n’ime Kraịst, gbasiekwanụ ike n’okwukwe.’—Kọl. 2:6, 7.
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Nọvemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo okwu otú ga-eme ka inye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi na traktị dị iche iche na-agụ ụmụnna agụụ. Kwuo ihe ụfọdụ e kwuru n’isiokwu bụ́ “Traktị Ọhụrụ Ndị Pụrụ Iche,” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Eprel 2014. A ga-eme ihe ngosi otú a ga-esi nye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ traktị.
Nkeji 20: “Okwu Chineke Ọ̀ Na-akpa Ike ná Ndụ Gị?” Okwu. I kwuchaa okwu mmeghe na-agaghị egbu oge, a ga-akpọnye akụkọ Baịbụl a na-egere egere nke isiokwu ya bụ́ “Adakwala Mbà Mgbe Jehova Na-abara Gị Mba!” Ọ dị na jw.org/ig. Kọwaa otú ịtụgharị uche n’ihe anyị gụtara na Baịbụl ga-esi enyere anyị aka ka anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Gbazie mmadụ niile ume ka ha na-ege akụkọ Baịbụl a na-egere egere ndị dị na jw.org/ig.
Abụ nke 113 na Ekpere