Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 19
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 19
Abụ nke 54 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia p. 2-3 na okwu mmalite ¶1-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 8-11 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 11:15-25 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ekpere Jehova Na-aza Si Dị Ka Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ?—Ọma 141:2; Mkpu. 5:8 (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Ime Ka Chineke Na-anụ Ekpere Anyị?—wp13 8/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbanyenụ mgbọrọgwụ n’ime Kraịst, gbasiekwanụ ike n’okwukwe.’—Kọl. 2:6, 7.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-akụziri Ndị Mmadụ Ihe Ka O Ruo Ha n’Obi.” Ajụjụ na azịza. A ga-eme ihe ngosi abụọ ebe onye nwe ụlọ ga-agwa nwanna bịara izi ya ozi ọma na nwa ya nwụrụ nakwa na ọ gaala eluigwe. N’ihe ngosi nke mbụ, nwanna ahụ ga-agụrụ ya Ekliziastis 9:5 ma gwa ya na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. Ihe a nwanna a ga-ekwu agaghị emetụ ya n’obi, ya ajụkwa ige ya ntị. N’ihe ngosi nke abụọ, nwanna ahụ ga-eme ka ọ nụghị ihe o kwuru gbasara eluigwe ma gụọrọ ya Jọn 5:28, 29, iji kọwaara ya nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Otú a o si gwa ya okwu ga-eme ka o gee ya ntị.
Nkeji 10: Ma Okenye ma Nwata Kwesịrị Ime Ka A Na-amụta Ezigbo Ihe n’Aka Ha. (Fil. 3:17; 1 Tim. 4:12) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2015, peeji nke 71, paragraf nke 2, ruo peeji nke 72, paragraf nke 4; nakwa peeji nke 76-77. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Abụ nke 90 na Ekpere