Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 12
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 12
Abụ nke 135 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 31 ¶21-23, igbe dị na peeji nke 319 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 5-7 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 6:48-60 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ònye Ga-eweta Udo n’Ụwa?—wp13 6/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Baịbụl Ji Gwa Anyị Ka Anyị Ghara Ịbụ Ndị “Ezi Omume Gabiga Ókè”—Ekli. 7:16 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbanyenụ mgbọrọgwụ n’ime Kraịst, gbasiekwanụ ike n’okwukwe.’—Kọl. 2:6, 7.
Nkeji 10: ‘Gbanyenụ Mgbọrọgwụ n’Ime Kraịst, Gbasiekwanụ Ike n’Okwukwe.’ Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Gịnị ka mmadụ ịgbanye mgbọrọgwụ n’ime Kraịst na ịgbasi ike n’okwukwe pụtara? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ha? (Gụọ Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2009, p. 26-28.) Gụọ Ndị Kọlọsi 2:6, 7; Ndị Hibru 6:1; na Jud 20, 21. Kọwaakwa ha. Gosi otú ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịkụziri Ndị Anyị Na-amụrụ Baịbụl Otú Ha Ga-esi Na-amụ Ihe Nke Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa bụ́ aka ochie na-akụziri onye ọ na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi jiri Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ ma ọ bụ Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET zaa mmadụ ajụjụ.
Abụ nke 116 na Ekpere