Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 15
IZU NA-AMALITE NA JUN 15
Abụ nke 77 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 26 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 22-24 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 22:21-32 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Bụ́ Ezigbo Enyi na Baịbụl na Àgwà Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ha (Nkeji 5)
Nke 3: Ịhụnanya na Irube Isi Na-eweta Obi Ụtọ—igw p. 22 ¶4-6 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Cheta ụbọchị ndị gara aga.”—Diut. 32:7.
Nkeji 12: Ònye Ka Akụkọ Ya Kacha Atọ Gị Ụtọ na Baịbụl? Ajụjụ ọnụ na okwu. Buru ụzọ gbaa ụmụaka abụọ ma ọ bụ atọ nọ n’ọgbakọ unu ajụjụ ọnụ. Jụọ ha ajụjụ ndị a: Olee onye akụkọ ya kacha atọ gị ụtọ na Baịbụl? Gịnị ka onye ahụ mere? Olee otú ị ga-esi na-eme ka ya? Ị gbachaa ha ajụjụ ọnụ, gwazie ụmụnna otú ihe a na-akpọ “kaadị akụkọ ndị dị na Baịbụl” nke dị na jw.org/ig ga-esi abara ụmụaka uru. (Gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ỤMỤAKA ka ị hụ ya.) Nke ọ bụla n’ime kaadị ndị ahụ na-akọwa onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Ị ga-ahụkwa ihe osise gbasara onye ahụ na map na-egosi ebe o biri. Ihe ọzọ ị ga-ahụ bụ oge onye ahụ biri ndụ na ajụjụ atọ a jụrụ gbasara onye ahụ na azịza ha. E mere kaadị ndị ahụ otú e nwere ike ibipụta ha ebipụta. Gbaa ndị nne na nna ume ka ha jiri kaadị a na-akụziri ụmụ ha gbasara “ụbọchị ndị gara aga.”—Diut. 32:7.
Nkeji 18: “Anyị Nwere Ike Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Nkwusa Bụ́ Aka Ochie.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlewe paragraf nke abụọ, gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara n’aka onye nkwusa bụ́ aka ochie ụbọchị ha na ya rụrụ n’ozi ọma.
Abụ nke 4 na Ekpere