Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 8
IZU NA-AMALITE NA JUN 8
Abụ nke 6 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 25 ¶17-21, igbe dị na peeji nke 259 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 19-21 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 19:24-37 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Ị Ga Na-eme Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ?—igw p. 22 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Anyị Na-amụta na Luk 12:13-15, 21? (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Cheta ụbọchị ndị gara aga.”—Diut. 32:7.
Nkeji 10: Cheta Ụbọchị Ndị Gara Aga. Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Gụọ Diuterọnọmi 4:9; 32:7, na Abụ Ọma 71:15-18. Kọwaakwa ha. Kọọrọ ụmụnna ihe ha nwere ike ịmụta n’ihe ndị mere n’ọgbakọ Jehova n’oge ndị gara aga nakwa ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ụmụnna anyị ndị jeere Jehova ozi n’oge ndị ahụ. Gwa ụmụnna na ọ ga-adị mma ha nwewe ofufe ezinụlọ n’oge ụfọdụ, ha eleba anya n’isiokwu a na-akpọ “Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie.” Isiokwu a na-agba n’Ụlọ Nche. Kwuo okwu n’ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a ma gosi otú ha si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Malitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ihe omume a. Kwuo okwu n’ebe ụfọdụ ọgbakọ unu mere nke ọma n’ozi ọma, kwuokwa otú o si gosi na e nwere ọtụtụ ndị a ka ga-amalitere ọmụmụ Baịbụl n’ókèala unu. Onye nkwusa bụ́ aka ochie ga-eji ihe ahụ dị n’igbe isiokwu ya bụ́ “Mgbe Anyị Nọ n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ” gosi otú e nwere ike isi jiri nkeji ole na ole malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe anyị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Gbaa ndị nkwusa niile ume ka ha si otú a malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
Abụ nke 29 na Ekpere