Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 11
IZU NA-AMALITE NA MEE 11
Abụ 84 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 24 ¶11-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 4-8 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 6:14-23 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Na-eme Mmadụ ma Ọ Nwụọ?—igw p. 18 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Jizọs Ji Gwa Otu Nwoke Ka Ọ Ghara Ịkpọ Ya “Ezi Onye Ozizi”—Mak 10:17, 18 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Nyere ụdị mmadụ niile aka ka ha mara eziokwu.—1 Tim. 2:3, 4.
Nkeji 10: Nyere Ụdị Mmadụ Niile Aka Ka Ha Mara Eziokwu. Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. (Jiri Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2013, p. 11-12, para. 8 kwadoo ihe omume a.) Gụọ 1 Timoti 2:3, 4 na 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23. Kọwaakwa ha. Kwuo okwu n’ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a ma gosi otú ha si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Na-anaghị Asụ Asụsụ Anyị Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eji nkeji ole na ole mee ihe ngosi ebe nwanna ji akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations ezi onye na-anaghị anụ asụsụ ya ozi ọma.
Abụ nke 105 na Ekpere