Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 27
IZU NA-AMALITE N’EPREL 27
Abụ nke 1 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 23 ¶19-23, igbe dị na peeji nke 239 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 26-31 (Nkeji 8)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Jirinụ oge unu na-eme ihe bara uru iji gosi na unu ma ihe.—Efe. 5:15, 16.
Nkeji 5: Ahụmahụ. Gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ka ha kọọ otú ha si jiri obi ike zie mmadụ ozi ọma. Ha kọchaa, ha emee ihe ngosi otú ha si mee ya. Ná nkenke, kọwaa Ndị Hibru 6:11, 12. Kwuo ihe mere anyị ji kwesị ịdị uchu n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.
Nkeji 10: Ịkọwara Ndị Mmadụ Ihe Alaeze Chineke Bụ na Ihe Ọ Ga-emere Anyị. Okwu okenye ga-ekwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 280, paragraf nke 1-4.
Nkeji 15: “Mee Ka Okwu Chineke Na-akpa Ike n’Ahụ́ Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlechaa isiokwu a, a ga-eme ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Nke mbụ ga-abụ ebe onye nkwusa na-achọ inye mmadụ broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Ya agwa onye ahụ ihe dị na 2 Timoti 3:16, 17 n’asapeghị Baịbụl gụọ ya. Ihe ngosi nke abụọ ga-abụ ebe onye nkwusa ahụ meghachiri ihe ngosi ahụ o mere na mbụ. Ma na nke ugbu a, ọ ga-asape Baịbụl gụọ 2 Timoti 3:16, 17. Jụọ ụmụnna ihe ha ji chee na ihe e mere n’ihe ngosi nke abụọ ga-eme ka Okwu Chineke na-akpa ike n’ahụ́ ndị anyị na-ezi ozi ọma.
Abụ nke 124 na Ekpere