Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 20
IZU NA-AMALITE N’EPREL 20
Abụ nke 3 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 23 ¶10-18 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 23-25 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Samuel 23:13-23 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Baịbụl Kwere Anyị ná Nkwa Ga-eme n’Ọdịnihu?—igw p. 16 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-eche Ihe Anyị Na-ekwu Eche—Ilu 16:23 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Jirinụ oge unu na-eme ihe bara uru iji gosi na unu ma ihe.—Efe. 5:15, 16.
Nkeji 15: “Otú E Si Eji Akwụkwọ Anyị Ezi Ozi Ọma n’Ebe Na-ekwo Ekwo.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi ebe ndị nkwusa abụọ nọ n’akụkụ tebụl ma ọ bụ ihe a na-akwagharị akwagharị ha dosara akwụkwọ anyị. Otu n’ime ha ahụ onye na-agafeta chịsawara ya ọchị. Onye nkwusa nke ọzọ ahụkwa onye ọzọ na-abịa chịsawara ya ọchị. Mgbe onye ahụ rutere ebe ahụ, ya ajụọ ya ajụjụ wee malite izi ya ozi ọma. Ọ bụrụgodị na anyị ebughị akwụkwọ anyị nọrọ n’ebe na-ekwo ekwo na-ezi ozi ọma, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ụdị ihe a ndị nkwusa abụọ a mere?
Nkeji 15: Mee Ka Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ ma Dịkwuo Ùgwù. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2006, peeji nke 28-31. I nwere ike ịjụ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Ònye ga-ekpebi otú ihe ga-esi gaa n’agbamakwụkwọ? (1 Kọr. 11:3) (2) Olee ụdị uwe nwaanyị na-agba akwụkwọ kwesịrị iyi? Oleekwa otú o kwesịrị isi eji ejiji? (1 Tim. 2:9; 1 Pita 3:3, 4) (3) Gịnị mere na mmadụ abụọ chọrọ ịgba akwụkwọ ekwesịghị ịga gbaziri ego ha ga-eji nye ndị bịara agbamakwụkwọ ha nri?—Ilu 22:7; Rom 13:8; 1 Tim. 6:6.
Abụ nke 70 na Ekpere