Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 5
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 5, 2015
Abụ nke 113 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 18 ¶9-19 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 16-20 (Nkeji 8)
Nke 1: Jọshụa 17:11-18 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ònye Bụ Chineke?—igw p. 2 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Ịtụ Egwu Ọnwụ Si Mee Ka Ndị Mmadụ Nọrọ n’Ohu—Hib. 2:15 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Si n’ezi akụ̀ e nyere anyị na-ewepụta “ihe ọma.”—Mat. 12:35a.
Nkeji 30: “Abụ Ọhụrụ Ndị Anyị Ga-eji Na-efe Jehova.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlewe paragraf nke 6, kwuo ka a kpọnyere ọgbakọ abụ isiokwu ya bụ “Alaeze Chineke Achịwala—Ya Bịawa!” ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bilie bụọ ya. Ha nwere ike ịbụ ya ugboro abụọ ka ha nwee ike ịmụta ya. Ha bụchaa ya, ha anọdụ ala ruo mgbe a tụlechara isiokwu a.
Abụ ọhụrụ isiokwu ya bụ́ “Alaeze Chineke Achịwala—Ya Bịawa!” na Ekpere