Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Ọktoba 27
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 27
Abụ nke 5 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 15 ¶1-10 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 11-13 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa na-enye mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ traktị.
Nkeji 15: Kwadebe Otú Ị Ga-esi Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2014, peeji nke 14-15, paragraf nke 14-20. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe na-echu ndị bi n’ókèala unu ụra ma ọ bụ ajụjụ ha chere ha na-ajụkarị. Olee ihe anyị ga-agwa ha ma ha jụọ anyị ajụjụ ndị ahụ? A ga-eme ihe ngosi ebe ọsụ ụzọ abụọ ma ọ bụ di na nwunye ji Ụlọ Nche a akwado otú ha ga-esi zaa ndị bi n’ókèala unu ajụjụ ndị ahụ. Ndị ga-eme ihe ngosi ahụ ga-ekpebi akwụkwọ ha ga-enye onye ahụ.
Abụ nke 95 na Ekpere