Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Ọktoba 13
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 13
Abụ nke 8 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 14 ¶10-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 4-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Diuterọnọmi 4:29-43 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Kraịst Kwesịrị Ịlụ Naanị Ndị Kraịst—td 3D (Nkeji 5)
Nke 3: Ezigbo Ndị Kraịst Anaghị Alụ Karịa Otu Nwaanyị—td 3E (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Gịnị Ka Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwusa Ozi Ọma Pụtara? Okwu ga-ekpo ọkụ a ga-eji kọwaa 2 Timoti 4:2. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Mach 15, 2012, peeji nke 16-17, paragraf nke 7-9.
Nkeji 10: Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma? Okwu okenye ga-ekwu. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Mach 15, 2012, peeji nke 15-16, paragraf nke 3-6, nakwa peeji nke 17-18, paragraf nke 14-18. Mee ka o doo anya na ime ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma” nke na-apụtakarị n’Ozi Alaeze Anyị ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma.
Nkeji 15: “Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ọnọdụ Ọ Bụla Ị Nọ.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlewe paragraf nke 3, gwa ụmụnna ka ha kwuo ahụmahụ ha nwere mgbe ha ziri mmadụ ozi ọma mgbe ha na-anọghị n’ozi. Ná mmechi, kwuo otú isiokwu a si gbasa isiokwu ọnwa a. Gbaakwa mmadụ niile ume ka ha gụọ ihe dị n’isiokwu bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara” ndị a ga-atụle ná Nzukọ Ije Ozi n’izu na-abịanụ.
Abụ nke 97 na Ekpere