Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 1
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 1
Abụ nke 46 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 12 ¶9-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 17-21 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 17:1-13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Mụrụ Anya Iji Mata Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ikpeazụ—td 23B (Nkeji 5)
Nke 3: Ebe A Ga-enweta Nkasi Obi—lr isi nke 31 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Septemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, tụlezienụ ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo otú ha si mee ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwusa Alaeze Chineke n’Atụghị Ụjọ.” Gwakwa ha ka ha kwuo ihe ndị mere ka ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke sitụrụ ha ike. Oleekwa otú ha si merie ihe ndị ahụ?
Nkeji 10: Otú Anyị Si Kesaa Traktị jw.org. Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo ụfọdụ ihe Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a kwuru banyere otú anyị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Olee otú ọgbakọ unu si mee ihe ndị ahụ e kwuru? Olee ahụmahụ ndị e nwere mgbe a na-enye ndị mmadụ traktị ahụ?
Abụ nke 45 na Ekpere