Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 9
IZU NA-AMALITE NA JUN 9
Abụ nke 24 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 8 ¶9-16 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 1-5 (Nkeji 10)
Nke 1: Levitikọs 4:16-31 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Àgwà Ndị E Ji Mara Chineke—td 20CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ̀ Dị Ihe Ọ Bụla Anyị Kwesịrị Iji Tuo Ọnụ?—lr isi nke 21 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Ì Meela Ya? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye nwe ihe omume a ga-eji nkeji ole na ole kwuo isi ihe ndị dị n’isiokwu ndị e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị na nso nso a. Ha bụ “Ụzọ Ọhụrụ E Si Ekwusa Ozi Ọma” (km 7/13), “Otú Anyị Ga-esi Enyere Ndị Na-ekweghị na Baịbụl Bụ Okwu Chineke Aka” (km 12/13), na “Malitere Ndị Ị Na-ewegara Magazin Ọmụmụ Baịbụl” (km 1/14). Gwa ụmụnna ka ha kwuo otú ha sirila mee ihe ndị ahụ na uru ha riterela.
Nkeji 15: “Ọnwa Ọgọst Ga-apụ Iche.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ihe omume a. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu traktị nke isiokwu ya bụ Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra? Tụleekwanụ ya. Kwuo ndokwa e mere ka unu nwee ike inye ya onye ọ bụla n’ókèala unu.
Abụ nke 107 na Ekpere