Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 3
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 3
Abụ nke 22 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 2 ¶12-20 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 21-24 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 23:1-20 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Baruru Uru?—td 19A (Nkeji 5)
Nke 3: “Onye A Bụ Ọkpara M”—lr isi nke 5 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú Anyị Ga-esi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi enye mmadụ magazin. A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi a. E mechaa ya, tụlezienụ ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” A gụọ otu ahịrịokwu ma ọ bụ ahịrịokwu abụọ, a jụọ ụmụnna ihe mere e ji tinye ya n’ihe anyị ga-agwa mmadụ. Mee ka ụmụnna ghọta na ha ekwesịghị iburu ihe dị ebe ahụ n’isi, kama, ha kwesịrị ikwu ya otú ha si ghọta ya ma ọ bụ hazigharịa ya otú ọ ga-adịrị ha mfe ikwu. Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha mata ihe magazin anyị na-ekwu tupu ha agawa inye ya mmadụ. Gwakwa ha ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-enye ya ndị mmadụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Unu Ga-amata Ha Site ná Mkpụrụ Ha. (Mat. 7:16) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 47, paragraf nke 1-2; na peeji nke 52, paragraf nke 1-6. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Abụ nke 25 na Ekpere