Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 13
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 13
Abụ nke 131 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 1 ¶10-17 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 6-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 9:18–10:7 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Chineke Kere Ụwa Ka Ọ Bụrụ Paradaịs—td 44A (Nkeji 5)
Nke 3: Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahụ n’Anya—lr isi nke 2 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ihe Mere Ikwughachi Ihe Ji Baa Uru n’Ozi Ọma. Okwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 206-207. Jiri otu n’ime ihe ndị e kwuru n’ebe ahụ mee ihe ngosi dị nkenke.
Nkeji 10: Ndị Na-eje Ozi nke Ọma. (1 Tim. 3:13) Gbaa ndị ohu na-eje ozi abụọ ajụjụ ọnụ. Gịnị ka ha na-arụ n’ọgbakọ? Oleekwa otú ha si arụ ya? Gịnị mere ha ji gbaa mbọ ka ha bụrụ ohu na-eje ozi? Gịnị mere obi ji dị ha ụtọ na ha na-ejere ụmụnna ha ozi ma na-enyere ndị okenye aka?
Nkeji 10: “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Maịka Onye Amụma.” Ajụjụ na aziza.
Abụ nke 35 na Ekpere