Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 19
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 19
Abụ nke 51 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 13 ¶8-13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 9-12 (Nkeji 10)
Nke 1: Ndị Rom 9:19-33 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Baịbụl Bụ Okwu Chineke Si n’Ike Mmụọ Nsọ—td 7A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Akwụkwọ Nsọ Kwuru Mere na Anyị Ekwesịghị Ịtụ Mmadụ Egwu—Luk 12:4-12 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: “Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa . . . ” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Nkeji 15: “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo.” Ajụjụ na azịza. Mee ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Nke mbụ ga-abụ ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa onye anyị gara izi ozi ọma ma ọ bụrụ na iwe na-ewe ya. Nke abụọ abụrụ otú anyị kwesịrị isi gwa ya okwu.
Nkeji 10: Na-ekwusa Ozi Ọma n’Atụghị Egwu. (Ọrụ 4:29) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 49, paragraf nke 1-6; na peeji nke 69, paragraf nke 1 ruo peeji nke 70, paragraf nke 2. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ha mụtara.
Abụ nke 92 na Ekpere