Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 5
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 5
Abụ nke 77 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 12 ¶20-25, igbe dị na peeji nke 151 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 1-4 (Nkeji 10)
Nke 1: Ndị Rom 3:21–4:8 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Ji Were Onwe Ha “Ka Ndị Ala Ọzọ na Ndị Bi Nwa Oge” n’Ụwa.—1 Pita 2:11; 1 Jọn 2:15-17 (Nkeji 5)
Nke 3: Baptizim Bụ Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst—td 6A (NKeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọgọst. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Ọgọst 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 6-9 na Teta! Julaị–Ọgọst nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ì Jikerela Ịmaliteghachi Ịga Akwụkwọ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo nsogbu ụfọdụ ụmụ anyị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Kwuo otú ndị nne na nna nwere ike isi nọrọ n’ofufe ezinụlọ jiri akwụkwọ Index, akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, na akwụkwọ anyị ndị ọzọ nyere ụmụ ha aka ịma otú ha ga-esi merie ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ kọwaara mmadụ ihe ha kweere. (1 Pita 3:15) Họrọ otu isiokwu ma ọ bụ isiokwu abụọ ma kwuo ihe ụfọdụ akwụkwọ anyị kwuru, bụ́ ndị ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka. Jụọ ndị na-ege ntị otú ha si gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ.
Abụ nke 41 na Ekpere