Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 15
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 15
Abụ nke 48 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 12 ¶1-7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ Ndịozi 18-21 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọrụ Ndịozi 20:17-38 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: A Pụrụ Ịsọpụrụ Mmadụ, ma Naanị Chineke Ka A Ga-efe Ofufe—td 15B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Ga-esi Tụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ?—Rom 8:6 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Kụziere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Ihe Otú Ọ Ga-esi Ghọta Ihe Ị Na-akụziri Ya. (Luk 24:32) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ha ajụjụ ndị a: (1) Mgbe ị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, gịnị mere i ji kwesị ịgwa ya banyere, (a) otú Jehova si hụ anyị n’anya nakwa banyere amamihe ya? (b) uru ime ihe Baịbụl kwuru bara? (ch) ihe mere anyị ji kwesị ibu ụzọ mata ihe Jehova kwuru gbasara ihe anyị chọrọ ime tupu anyị emee ihe ahụ? (2) Ọ bụrụ na ị jụọ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ ndị na-esonụ, olee otú ha ga-esi nyere gị aka ịmara ma ọ̀ na-aghọta ihe gị na ya na-amụ? (a) Iwu a Jehova nyere anyị, ọ̀ ga-abara gị uru? (b) Iwu a ò gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya? (ch) Olee uru ọ ga-abara gị?
Nkeji 20: “Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-agbalị Ka Unu Ruo Eru Ịrụ Ọrụ n’Ọgbakọ?” Ajụjụ na azịza. Jiri nkeji ole na ole gbaa otu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye malitere na nwata gbalịwa ka o ruo eruo ije ozi n’ọgbakọ. Olee ọrụ e nyere ya tupu a họpụta ya ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi, oleekwa otú e si zụọ ya ịrụ ọrụ ahụ? Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ si gbaa ya ume ka o ruo eru? Olee uru ndị o riterela n’ihi ozi ọ na-eje n’ọgbakọ?
Abụ nke 85 na Ekpere